Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 21
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 21
Abụ nke 33 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 15 ¶13-20 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Tesalonaịka 1–2 Ndị Tesalonaịka 3 (Nkeji 10)
Nke 1: 1 Ndị Tesalonaịka 2:9-20 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Àgwà Ọma Sọlọmọn Nakwa n’Àgwà Ọjọọ Ya?—Rom 15:4 (Nkeji 5)
Nke 3: Sayensị nke Ziri Ezi Kwekọrọ n’Okike E Kwuru Okwu Ya na Baịbụl?—td 35A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Mak 1:40-42, Mak 7:32-35, na Luk 8:43-48. Kwuokwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 15: “Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe n’Ịntanet Na-akụziri Ụmụ Gị Ihe.” Ajụjụ na azịza. Mgbe unu tụlewere paragraf nke 3, kọwaa ebe a ga-ahụ “Ihe Nne na Nna Ga-eme.” Kwuokwa ihe e dere n’ebe ahụ. Unu ruo na paragraf nke 4, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha na ndị ezinụlọ ha si eji ihe ndị dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet enwe ofufe ezinụlọ.
Abụ nke 88 na Ekpere