Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Disemba 30, 2013. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Gịnị ga-enyere Ndị Kraịst aka igosipụta ịdị nwayọọ n’ebe ndị nọ n’ọchịchị nọ? (Taịtọs 3:2) [Nọv. 4, w03 4/1 p. 25 para. 18-19]
2.Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe Pọl gwara Faịlimọn nke dị na Faịlimọn amaokwu nke 4, nke 5, na nke 7? [Nọv. 4, w08 10/15 p. 31 para. 1, 2; w92 4/15 p. 25 para. 2]
3. Olee otú anyị si abanye n’izu ike nke Chineke? (Hib. 4:9-11) [Nọv. 11, w11 7/15 p. 28 para. 16, 17]
4.Olee ihe anyị ga-amụta n’aka Samuel, ndị ikpe na ndị amụma ndị mezuru “ezi omume”? (Hib. 11:32, 33) [Nọv. 18, w11 1/1 p. 25 para. 5, 6]
5. Gịnị mere Jems ji kwuo na “amamihe nke si n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo”? (Jems 3:17) [Nọv. 25, w11 8/15 p. 30-31 para. 15]
6. Olee ndị bụ “ndị nwụrụ anwụ” e “zisaara ozi ọma”? (1 Pita 4:6) [Dis. 2, w08 11/15 p. 21 para. 7]
7. Olee iwu Jọn na-ekwu na ọ bụ iwu “ochie,” bụrụkwa iwu “ọhụrụ” na 1 Jọn 2:7, 8? [Dis. 9, w08 12/15 p. 27 para. 6]
8. Ònye ka a na-etu “Alfa na Omega” nakwa “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ”? (Mkpu. 1:8, 17) [Dis. 16, w09 1/15 p. 30 para. 6]
9. Olee ụzọ abụọ e si aka ndị e tere mmanụ “akara”? (Mkpu. 7:3) [Dis. 23, w07 1/1 p. 31 para. 2]
10. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na ihe Chineke kwere ná nkwa na Alaeze ya ga-emere anyị bụ eziokwu? Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ugbu a ka anyị nwee ike inweta ngọzi ndị ahụ? (Mkpu. 21:5, 6) [Dis. 30, re p. 303 para. 9]