Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 30
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 30
Abụ nke 126 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jl Isiokwu nke 26-28 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Mkpughe 15-22 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: “Nyere Ha Aka Ka Ha ‘Gbasie Ike n’Okwukwe.’” Okwu. I kwuchaa, a ga-eme ihe ngosi otú a ga-esi eji Ụlọ Nche malitere mmadụ ọmụmụ ihe na Satọdee mbụ n’ọnwa Jenụwarị. Gbaa mmadụ niile ume ka ha gbaa mbọ malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Jenụwarị.
Nkeji 10: Nyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Ghọọ Onye Nkwusa. Okwu. O si n’akwụkwọ Ndị A Haziri peeji nke 82, paragraf nke 2 na nke 3. Gbaa otu nne ma ọ bụ nna nwa ya bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ajụjụ ọnụ. Ọ ga-abụ onye e ji otú o si azụ ụmụ ya ama atụ. Olee otú o si nyere nwa ya ahụ aka ya abụrụ onye nkwusa?
Nkeji 10: Ọ Bụghị Naanị Anyị Kwụ. (2 Eze 6:16) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013, peeji nke 48, paragraf nke 1-3. Jụọ ndị na-ege ntị ihe ha mụtara.
Abụ nke 119 na Ekpere