Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 20
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 20
Abụ nke 34 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 1 ¶18-23, igbe dị na peeji nke 14 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 11-16 (Nkeji 10)
Nke 1: Jenesis 14:17–15:11 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: O Nweghị Mgbe Ndị Mmadụ Na-agaghị Ebi n’Ụwa—td 44B (Nkeji 5)
Nke 3: Onye Kere Ihe Niile—lr isi nke 3 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Matiu 7:6-11. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 10: Na-akwanyere Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike n’Etiti Unu Ùgwù. (1 Tesa. 5:12, 13) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: (1) Gịnị ka ndị okenye na-arụ n’ọgbakọ ndị na-egosi na ha na-arụsi ọrụ ike? (2) Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị okenye ùgwù? (3) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agba ndị okenye ume? (4) Olee otú anyị nwere ike isi na-agba ndị okenye na ndị ezinụlọ ha ume? (5) Olee otú irubere ndị okenye isi ga-esi baara ma ọgbakọ ma ndị okenye uru?
Nkeji 10: “Nyere Onye Gị na Ya So n’Ozi Ọma Aka.” Ajụjụ na azịza. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ihe ha mụtara n’aka ndị ha na ha so gaa ozi ọma.
Abụ nke 93 na Ekpere