Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 27
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 27
Abụ nke 106 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 2 ¶1-11 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 17-20 (Nkeji 10)
Nke 1: Jenesis 17:18–18:8 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ị̀ Ga-amatali Ndị Amụma Ụgha?—td 29A (Nkeji 5)
Nke 3: Chineke Nwere Aha—lr isi nke 4 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa. Okwu. Gwa ọgbakọ otú unu ga-esi aga ozi ọma na Satọdee mbụ n’ọnwa Febụwarị. Gbaa mmadụ niile ume ka ha gbaa mbọ malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Febụwarị. Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi na-agaghị egbu oge.
Nkeji 15: Olee Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Ndị I Nwere? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 117, paragraf nke 1 ruo na peeji nke 119. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị kpebiri na ha ga-eje ozi oge niile ma mechaa na-eje ya. Olee otú ndị ọzọ si gbaa ha ume tupu ha malite ije ozi oge niile? Ò nwere ihe isi ike ndị ha nwere mgbe ha malitere? Olee otú ije ozi oge niile sirila baara ha uru?
Nkeji 10: “Malitere Ndị Ị Na-ewegara Magazin Ọmụmụ Baịbụl.” Ajụjụ na azịza. Gwa ụmụnna ka ha kọọ otú ha si mechaa mụwara onye ha na-ewegaburu magazin Baịbụl.
Abụ nke 103 na Ekpere