Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 12
IZU NA-AMALITE NA MEE 12
Abụ nke 49 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 7 ¶1-8 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 27-29 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọpụpụ 29:19-30 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Isonyere Okpukpe Ndị Ọzọ Abụghị Ụzọ Chineke—td 31A (Nkeji 5)
Nke 3: Ụzọ Isi Nwee Obi Ụtọ—lr isi nke 17 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Mba Niile Ga-enuba n’Ime Ya. (Aịza. 2:2) Gbaa ụmụnna abụọ ajụjụ ọnụ. Otu ga-abụ onye nọterela aka n’ọgbakọ, onye nke abụọ abụrụ onye ka batara n’ọgbakọ ọhụrụ. Gịnị mere ha ji bata n’ọgbakọ? Olee nsogbu ndị ha meriri mgbe ha batara n’ọgbakọ ọhụrụ? Olee ihe masịrị ha ụbọchị mbụ ha bịara ọmụmụ ihe? Gịnị ka ha na-echeta banyere ụbọchị mbụ ha gara ozi ọma? Olee otú ụmụnna ndị ọzọ si nyere ha aka?
Nkeji 15: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ịkwadebe Okwu Mmeghe.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi abụọ na-agaghị egbu oge. Na nke mbụ, onye nkwusa ga-agwa onye ọ gara izi ozi ọma ihe ọ bụla gbatara ya n’obi. Na nke abụọ, ihe ọ ga-agwa ya ga-abụ ihe ọ kwadoro nke ọma. Kwuo ụfọdụ ihe ndị si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi peeji nke 215 ruo na nke 219.
Abụ nke 117 na Ekpere