Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 26
IZU NA-AMALITE NA MEE 26
Abụ nke 60 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 7 ¶18-22, igbe dị na peeji nke 75 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 34-37 (Nkeji 5)
Nke 1: Ọpụpụ 34:1-16 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndị Kraịst Kwesịrị Ịna-akpọ Aha Chineke—td 20A (Nkeji 5)
Nke 3: Ịlụ Ọgụ Ọ̀ Dị Mma?—lr isi nke 19 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ụmụnna ka ha kọọ ahụmahụ ha nwere mgbe ha maliteere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa. Jiri ihe dị na peeji nke 4 mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Jun. Gbaa mmadụ niile ume ka ha pụta ozi ọma ụbọchị ahụ.
Nkeji 10: Ịtachi Obi Mgbe A Na-akpagbu Anyị Bara Uru. (Luk 21:12, 13) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013, peeji nke 124, paragraf nke 1; na peeji nke 128, paragraf nke 1 na nke 2. Jụọ ụmụnna ihe ha mụtara.
Nkeji 10: Igbe Ajụjụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ okenye ga-eduzi ya. Gwa ụmụnna ndị torola eto ka ha kwuo uru ha ritere maka na nne ha na nna ha kụziiri ha eziokwu ndị miri emi dị na Baịbụl.
Abụ nke 88 na Ekpere