Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 16
IZU NA-AMALITE NA JUN 16
Abụ nke 111 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 8 ¶17-24, na igbe dị na peeji nke 86 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 6-9 (Nkeji 10)
Nke 1: Levitikọs 8:18-30 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Mmadụ Niile Anaghị Efe Otu Chineke—td 20D (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha—lr isi nke 22 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 30: “Echefula Ndị Agadi Nọ n’Ebe A Na-elekọta Ha.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlewe paragraf nke 4, a ga-eme ihe ngosi ebe ụmụnna abụọ na-agwa onye bụ́ onyeisi n’ebe a na-elekọta ndị agadi na ha chọrọ ịna-abịa amụrụ ndị agadi bi ebe ahụ Baịbụl. Ọ bụrụ na e nweghị ebe a na-elekọta ndị agadi dị unu nso, ndị okenye nwere ike ikpebi ka ọgbakọ tụlee isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-asọpụrụ Ndị Nne na Nna Anyị Merela Agadi.” Ọ ga-abụ okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, isi nke iri na ise, paragraf nke 1 ruo na nke 14.
Abụ nke 90 na Ekpere