Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 7
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 7
Abụ nke 99 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 9 ¶21-24, igbe dị na peeji nke 96 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 17-20 (Nkeji 10)
Nke 1: Levitikọs 19:19-32 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Jizọs Kraịst Bụ Ọkpara Chineke na Eze Ọ Họpụtara—td 21A (Nkeji 5)
Nke 3: Ya Adịla Mgbe Ị Ga-aghọ Onye Ohi!—lr isi nke 24 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Julaị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, tụlezienụ ihe ndị dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” Ná mmechi, gbaa ụmụnna ume ka ha na-agụ magazin anyị, na-enyekwa ha ndị mmadụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-ekwu ya. Kwuo otú ndị ọgbakọ unu si jee ozi n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Jaakwa ha mma. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ihe ndị mere ha obi ụtọ oge a na-enye ndị mmadụ akwụkwọ e ji gwa ha ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ma ọ bụkwanụ gị ajụọ ndị sụrụ ụzọ inyeaka ihe ndị mere ha obi ụtọ n’ozi ọma.
Abụ nke 123 na Ekpere