Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 14
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 14
Abụ nke 1 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 10 ¶1-7 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 21-24 (Nkeji 10)
Nke 1: Levitikọs 23:1-14 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Ikwere na Jizọs Ji Dị Oké Mkpa Iji Nweta Nzọpụta—td 21B (Nkeji 5)
Nke 3: Ndị Na-eme Ihe Ọjọọ Hà Nwere Ike Ịgbanwe?—lr isi nke 25 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Jikere Maka Traktị Pụrụ Iche Anyị Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Ọgọst. Nye onye ọ bụla na-ejighị traktị ahụ isiokwu ya bụ Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra? otu traktị. A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi abụọ. Na ihe ngosi nke mbụ, a ga-eme otú e nwere ike isi enye ya ndị mmadụ. Na nke abụọ, a ga-eme otú e nwere ike isi nye ya onye chọrọ ịmatakwu ihe dị na ya. Gbaa mmadụ niile ume ka ha soro nye ndị mmadụ traktị a.
Nkeji 5: Rite Uru n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ụmụnna ka ha kwuo mgbe ha ji agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị na otú ịtụle ya si abara ha uru.
Nkeji 15: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ikwulite Ihe Ị Ga-eji Zie Mmadụ Ozi Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme otu ihe ngosi.
Abụ nke 107 na Ekpere