Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 28
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 28
Abụ nke 58 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 10 ¶18-21, na igbe dị na peeji nke 106 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 1-3 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 3:21-38 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Ụmụ Mmadụ—td 2A (Nkeji 5)
Nke 3: Ònye Bụ Chi Gị?—lr isi nke 27 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ì Jikerela Ịmaliteghachi Akwụkwọ? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo nsogbu ụfọdụ ụmụ anyị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. Kwuo otú ndị nne na nna nwere ike isi jiri ihe ndị dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet nakwa n’akwụkwọ anyị ndị ọzọ nyere ụmụ ha aka ịma otú ha ga-esi merie ọnwụnwa ma ọ bụkwanụ kọwaara mmadụ ihe ha kweere. (1 Pita 3:15) Kwuo otu ihe ma ọ bụ ihe abụọ e ji enye ụmụ anyị nsogbu n’ụlọ akwụkwọ. Jirikwa ihe ndị dị n’akwụkwọ anyị kọwaa ihe ha nwere ike ime iji merie nsogbu ndị ahụ. Jụọ ndị na-ege ntị otú ha si zie mmadụ ozi ọma mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ.
Nkeji 10: Gbaa Odeakwụkwọ Ọgbakọ Ajụjụ Ọnụ. Olee ihe ndị ị na-arụ n’ọgbakọ? Olee otú ndị nlekọta ìgwè na ndị nkwusa ga-esi na-enyere gị aka ka i nwee ike ịna-edekọ akụkọ ozi n’oge, ya edookwa anya? Ọ bụrụ na akụkọ ozi anyị na-edo anya, olee otú ọ ga-esi nyere ndị okenye, ndị nlekọta sekit na alaka ụlọ ọrụ anyị aka ịma otú ha ga-esi gbaa anyị ume ma ọ bụ nyere anyị aka?
Nkeji 10: “Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Zefanaya Onye Amụma.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 70 na Ekpere