Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Ọgọst 4
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 4
Abụ nke 51 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 11 ¶1-8 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 4-6 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 4:17-33 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Alaeze Chineke Ga-amalite Ịrụ Ọrụ Mgbe Ndị Iro Kraịst Ka Na-akpa Ike—td 2B (Nkeji 5)
Nke 3: Ụzọ Isi Mata Onye A Ga-erubere Isi—lr isi nke 28 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Ọgọst. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! E mechaa ihe ngosi ndị ahụ, jụọ ụmụnna ajụjụ ndị a: Gịnị mere anyị ji kwesị inye ndị mmadụ magazin n’ụbọchị Satọdee nakwa na Sọnde n’ọnwa Ọgọst mgbe ọ dabara? Olee mgbe anyị nwere ike inye mmadụ magazin?
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kwuo otú ha si mee ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ikwulite Ihe Ị Ga-eji Zie Mmadụ Ozi Ọma.” Gwakwa ha ka ha kwuo uru ọ baara ha, ha kọọkwa ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Abụ nke 75 na Ekpere