Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Ọgọst 11
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 11
Abụ nke 71 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 11 ¶9-16 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 7-9 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 9:9-23 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ọ Bụghị Mgbalị Ndị Mmadụ Ga-eme Ka Alaeze Chineke Bịa—td 2CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ọ̀ Bụ Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Niile Na-amasị Chineke?—lr isi nke 29 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: “Afọ 1914 Ruo Afọ 2014 Bụ Otu Narị Afọ Kraịst Malitere Ịchị n’Eluigwe.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ paragraf ahụ dị n’elu, gwakwa ụmụnna ka ha kwuo ihe a kọwara ebe ahụ. Ihe omume ndị a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa a ga-akọwakwuru anyị banyere Alaeze Chineke. Kwuo ndokwa e mere maka ije ozi ọma n’ọnwa a.
Nkeji 10: “Na-enye Ndị Mmadụ Traktị Kwuru Banyere jw.org.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Tụleenụ ihe e dere na traktị ahụ. A ga-eme ihe ngosi ebe onye nkwusa na-enye ya mmadụ. O nyechaa ya onye ahụ, ya ejiri ekwentị ya gosi ya otú ọ ga-esi chọta ihe na jw.org/ig.
Nkeji 15: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ikwusa Alaeze Chineke n’Atụghị Ụjọ.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi ebe nwanna na-ezi mmadụ ozi ọma n’ụgbọala. Onye nọ ya n’akụkụ elee anya n’akwụkwọ akụkọ o ji n’aka kwuo, sị: “Nsogbu ụwa a akala nkụ. E nweghịzi onye ma ebe ụwa na-aga aga. Chi bọọ, a nụ ọzọ.” Nwanna ahụ agwawa onwe ya okwu, sị, ‘M kwesịrị ikwu okwu. M ga-akata obi gwa ya banyere Alaeze Chineke.’ Nwanna ahụ agwa onye ahụ, sị: “Nwanne m, akụkọ ọjọọ juru ebe niile. Ma, e nwere ihe dị na traktị a m chọrọ igosi gị. Adres Ịntanet a enyerela m aka ịmata azịza ọtụtụ ajụjụ ndị na-echu m ụra.” Nwanna ahụ egosi onye ahụ ihe dị na traktị ahụ, onye ahụ anara ya ya.
Abụ nke 92 na Ekpere