Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Ọgọst 18
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 18
Abụ nke 78 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 11 ¶17-22, na igbe dị na peeji nke 116 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 10-13 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 10:1-16 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe “Ọgwụgwụ Ụwa” Pụtara—td 23A (Nkeji 5)
Nke 3: Enyemaka Iji Merie Egwu Na-atụ Anyị—lr isi nke 30 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: “Kpọkọta Ndị Mmadụ.” Ajụjụ na azịza.
Nkeji 10: “Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù Maka Mgbakọ Ukwu.” Ajụjụ na azịza. Nye onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu akwụkwọ ịkpọ òkù, tụleekwanụ ihe dị na ya. Gwa ọgbakọ unu mgbe unu ga-amalite nyewe ya ndị mmadụ. Kwuokwa ndokwa e mere iji hụ na e nyere ya mmadụ niile bi n’ókèala unu. Mee otu ihe ngosi na-agaghị egbu oge.
Nkeji 10: “Na-emenụ Omume Dị Mma Na-etiti Ndị Mba Ọzọ.” Ajụjụ na azịza. Tụleekwanụ ụfọdụ ihe dị n’isiokwu bụ́ “Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche Banyere Mgbakọ Ukwu nke Afọ 2014” nakwa akwụkwọ ozi e detaara ọgbakọ niile nke Ọgọst 3, 2013, gbasara ihe anyị ga-eme ka anyị ghara imerụ ahụ́ ma anyị gaa mgbakọ.
Abụ nke 125 na Ekpere