Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 3
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 3
Abụ nke 79 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 15 ¶11-19 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 14-18 (Nkeji 10)
Nke 1: Diuterọnọmi 15:16–16:8 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Baịbụl Gosiri na Meri Abụghị ‘Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Ruo Mgbe Ebighị Ebi’—td 14B (Nkeji 5)
Nke 3: Icheta Jehova na Ọkpara Ya—lr isi nke 37 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Na-enyere Ụmụaka Aka Ka Ha Jikere Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Bụrụ Enyi Jehova—Ka Anyị Gaa Ozi Ọma. (Ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa ebe e dere ỤMỤAKA) Jụọ ụmụaka ndị nọ n’ọgbakọ unu ajụjụ ndị a: Olee ndị nwere akpa ozi ọma? Gịnị dị n’akpa gị? Gịnị bụ ihe mbụ Sọpụrụchi tinyere n’akpa ya? Gịnị ọzọ ka o tinyere na ya? Mgbe o tinyechara ihe ndị ahụ n’akpa, olee ihe dị mkpa ọ gawara ka ya na mama ya mee? Otu nwatakịrị ga-eme ihe ngosi otú ọ ga-esi nye mmadụ magazin. Ọ bụrụ na unu agaghị egosili vidio ahụ, ihe ọzọ unu ga-eme bụ ịjụ ụmụaka ndị nọ n’ọgbakọ unu ajụjụ ndị a: Olee ndị nwere akpa ozi ọma? Olee akwụkwọ ndị ị nwere ike itinye n’akpa ozi ọma gị? Gịnị ka ị ga-eme tupu i soro mama gị ma ọ bụ papa gị gawa ozi ọma? Otu nwatakịrị ga-eme ihe ngosi otú ọ ga-esi nye mmadụ magazin.
Nkeji 10: Otú Ụfọdụ Si Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma. Okenye ga-agba ụmụnna abụọ ma ọ bụ ụmụnna atọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị hazigharịrị ihe ha na-eme ka ha nwee ike wepụtakwuo oge na-ekwusa ozi ọma ma ọ bụ sụwa ụzọ. Ná mmechi, kwuo ndokwa ọgbakọ unu nwere maka ịga ozi ọma, gbaakwa mmadụ niile ume ka ha gbaa mbọ na-ewepụta oge ha ga-eji na-aga ozi ọma.
Nkeji 10: Olee Otú I Sirila Mewe nke Ọma n’Ozi Ọma? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Jụọ ụmụnna otú ihe ndị anyị tụlerela n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma” sirila nyere ha aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ọma. Ná mmechi, gbaa mmadụ niile ume ka ha na-eme ihe e kwuru n’isiokwu ndị ahụ, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.
Abụ nke 100 na Ekpere