Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 10
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 10
Abụ nke 99 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 15 ¶20-23, igbe dị na peeji nke 157 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 19-22 (Nkeji 10)
Nke 1: Diuterọnọmi 22:20-30 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Akwụkwọ Nsọ Kwuru Gbasara Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—td 12A (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Hụ Jizọs n’Anya—lr isi nke 38 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Gbaa Onye Nlekọta Ije Ozi Ajụjụ Ọnụ. Olee ihe ndị ị na-arụ n’ọgbakọ? Gịnị ka ị na-eme mgbe ị gara ileta ìgwè ozi ubi ọ bụla? Olee otú ụmụnna ndị nọ n’ìgwè ozi ubi ga-esi rite uru ma ị gaa ileta ha? Ụmụnna bịakwute gị ka i nyere ha aka ka ha mewe nke ọma n’ozi ọma, olee otú i si enyere ha aka?
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Inwe Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Unu tụlechaa isokwu a, a ga-eme otu ihe ngosi ugboro abụọ. Ọ ga-abụ ebe onye nkwusa na-enye mmadụ akwụkwọ anyị na-enye ndị mmadụ n’ọnwa a. Na nke mbụ, onye nkwusa ahụ agaghị egosi na ya nwere mmasị n’ebe onye ọ bịara na nke ya nọ. Ma, na nke abụọ, ọ ga-egosi na ya nwere mmasị n’ebe ọ nọ.
Abụ nke 84 na Ekpere