Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 17
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 17
Abụ nke 26 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 16 ¶1-9 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 23-27 (Nkeji 10)
Nke 1: Diuterọnọmi 25:17–26:10 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ido Mas Esighị n’Akwụkwọ Nsọ—td 12B (Nkeji 5)
Nke 3: Chineke Echeta Ọkpara Ya—lr isi nke 39 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Olee Otú E Si Amata Ezigbo Enyi? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi na katuun a na-ese na bọọdụ nke isiokwu ya bụ Olee Otú E Si Amata Ezigbo Enyi? (Ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa NDỊ NA-ETO ETO.) Buru ụzọ kpọnye fim ahụ ka mmadụ niile lee ya. E lechaa ya, jụọ ụmụnna ajụjụ ndị a: (1) Olee otú e si amata ezigbo enyi? (2) Olee ụdị àgwà ị ga-achọ ka onye ga-abụ enyi gị na-akpa? (3) Olee otú ị ga-esi achọta ezigbo enyi? (4) Gịnị ka i kwesịrị ime ka gị na enyi gị ghara itisa? Ọ bụrụ na unu agaghị egosili vidio ahụ, tụleenụ igbe abụọ dị na peeji nke 29 na nke 30 n’akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.” Ọ ga-abụkwa okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Nkeji 10: E Ji Ịhụnanya Mara Anyị. (Jọn 13:35) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2014, peeji nke 48, paragraf nke 1 ruo na peeji nke 49, paragraf nke 3; nakwa peeji nke 69, paragraf nke 1 ruo na peeji nke 70, paragraf nke 1. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Ụzọ Ọhụrụ Na-eme Obi Ụtọ E Si Ekwusa Ozi Ọma.” Ajụjụ na azịza. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere ebe ndị na-ekwo ekwo, gbaa onye nlekọta ije ozi ajụjụ ọnụ ka o kwuo ndokwa e mere maka ikwusa ozi ọma n’ebe ndị ahụ. Gwa ụmụnna ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwere mgbe ha na-aga ozi ọma n’ebe ndị ahụ.
Abụ nke 92 na Ekpere