Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 24
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 24
Abụ nke 50 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 16 ¶10-17 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 28-31 (Nkeji 10)
Nke 1: Diuterọnọmi 30:15–31:8 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndị Kraịst Niile Kwesịrị Ịbụ Ndị Ozi—td 37A (Nkeji 5)
Nke 3: Ụzọ Isi Mee Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ—lr isi nke 40 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: “Jiri Isiokwu Bụ́ ‘Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara’ nke Dị na jw.org Na-ekwusa Ozi Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuo ajụjụ ụfọdụ a zara n’ebe ahụ. (Ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA.) A ga-eme ihe ngosi otú e nwere ike isi jiri jw.org zie mmadụ ozi ọma otu ahụ a tụrụ n’aro n’isiokwu a. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi jiri ya zie ozi ọma.
Nkeji 5: “Ọ Nọghịkwa Ya Ọzọ Taa.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuo ihe mere anyị ji kwesị ịtachi obi ma ọ bụrụ na onye anyị ziri ozi ọma anaghị anọkarị n’ụlọ.—Mat. 28:19, 20; Mak 4:14, 15; 1 Kọr. 3:6.
Nkeji 15: “Akwụkwọ Ọhụrụ E Ji Eme Nchọnchọ.” Okwu. Tụlee ihe dị n’isiokwu nta bụ́ “Otú Ị Ga-esi Ebido Ịchọ Ihe Ị Na-achọ” na peeji nke 3 n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Kwuo ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ ọhụrụ ahụ. Otu onye nkwusa ga-eme ihe ngosi ebe ọ na-agwa onwe ya okwu. Ọ ga-egosi otú e nwere ike isi jiri akwụkwọ ahụ mee nchọnchọ.
Abụ nke 69 na Ekpere