Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 26
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 26
Abụ nke 99 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 19 ¶9-17 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Ikpe 5-7 (Nkeji 8)
Nke 1: Ndị Ikpe 7:12-25 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Otú Jizọs Si Gosi na Ya Ruru Eru Ịbụ Eze (Nkeji 5)
Nke 3: Otú Anyị Ga-esi Mụta Banyere Jehova—igw p. 5 ¶1-4 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Jiri Obi Umeala Na-agbara Onyenwe Anyị Ohu.’—Ọrụ 20:19..
Nkeji 10: Akwụkwọ A Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Jenụwarị na Febụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ụmụnna ka ha kọọ ihe ndị tọrọ ha ụtọ mgbe ha nyere ndị mmadụ akwụkwọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Meenụ ihe ngosi ga-egosi otú e nwere ike isi nye ya ndị mmadụ. E mechaa, unu tụlee isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Anyị Ga-eji Gawa n’Egbughị Oge?”
Nkeji 10: Ndị Okenye Na-agbara Onyenwe Anyị Ohu—Onye Na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Gbaa onye na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ajụjụ ọnụ. Jụọ ya ajụjụ ndị a: Olee ihe ị na-arụ n’ọgbakọ? Olee otú i si akwado Ụlọ Nche a ga-amụ? Gịnị mere na ọ naghị adịrị gị mfe ịjụ ndị niile weliri aka ajụjụ? Gịnị ka onye na-agụ Ụlọ Nche, ndị na-aza ajụjụ, na ndị na-enye ndị mmadụ maịkrofon ga-eme ka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche gaa nke ọma, ndị mmadụ amụtakwa ihe na ya? Olee otú Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze ị gara n’oge na-adịbeghị anya sirila nyere gị aka ka ị na-eduzi Ụlọ Nche nke ọma?
Nkeji 10: “Jiri jw.org Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma—‘Bụrụ Enyi Jehova.’” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuo ụfọdụ ihe ndị dị n’ebe e dere “Bụrụ Enyi Jehova.” Kpọnyekwara ụmụnna otu n’ime vidio ndị dị ebe ahụ. Gwa ụmụnna ka ha kwuo otú anyị nwere ike isi jiri vidio ndị dị n’ebe e dere “Bụrụ Enyi Jehova” zie ndị mmadụ ozi ọma mgbe anyị na-aga ozi ụlọ n’ụlọ, mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ndị na-ekwo ekwo ma ọ bụ mgbe anyị na-anọghị n’ozi.
Abụ nke 135 na Ekpere