Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 16
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 16
Abụ nke 80 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 20 ¶8-15 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Ikpe 15-18 (Nkeji 8)
Nke 1: Ndị Ikpe 16:13-24 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Bụ Isi Ihe Baịbụl Na-ekwu?—igw p. 8 ¶1-4 (Nkeji 5)
Nke 3: Ụzọ Dị Iche Iche E Si Egosi Obiọma Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ—1 Pita 4:10 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”—Taị. 2:14.
Nkeji 15: Kwadebe Ka I Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ezi Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Anyị kwadowe ịga ozi ọma, gịnị mere anyị ji kwesị ibu ụzọ kpee ekpere? (Ọma 143:10; Ọrụ 4:31) Gịnị ọzọ ka anyị kwesịrị ime ma anyị kpechaa ekpere? (Ezra 7:10) Anyị mechaa ihe ndị a, gịnị na gịnị ka anyị kwesịrị ime iji hụ na anyị haziri akpa anyị na akwụkwọ ndị anyị ji aga ozi ọma? Olee uru ịkwado akwado tupu anyị agawa ozi ọma bara? (Gụọ Ụlọ Nche, Julaị 15, 2008, p. 9, para. 9.) Olee otú i si akwadebe ozi ọma? A ga-eme ihe ngosi ebe otu onye nkwusa na-akwadebe ozi ọma. Ọ ga-atụle ihe ndị e kwuru na traktị, magazin, ma ọ bụ broshọ ọ chọrọ iji aga ozi ọma. Ya mechaa, ya etinye ihe ndị ọ ga-eji aga ozi ọma n’akpa ozi ọma ya. Ọ ga-ahụkwa na ekwentị ya ma ọ bụ ihe ọzọ yiri ya e ji aga n’Ịntanet ọ chọrọ iji aga ozi ọma dị mma. Mee ka mmadụ niile ghọta na ha kwesịrị ịkwado nke ọma mgbe ha chọrọ ịga ozi ọma. (2 Tim. 3:17)
Nkeji 15: “N’Oge A A Na-echeta Ọnwụ Jizọs, Ị̀ Ga-eṅomi Otú Jehova na Jizọs Si Anụ Ọkụ n’Obi?” Ajụjụ na azịza. Nye onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu akwụkwọ ịkpọ òkù ma kọwaa ihe dị na ya. A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi na-agaghị egbu oge.
Abụ nke 30 na Ekpere