Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Eziokwu Gbasara Jizọs
Ọ bụrụ na eziokwu gbasara Jizọs doro anyị anya, anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ya ndị ọzọ. Ọ bụ àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mere anyị na Chineke ji dịrị ná mma. (Efe. 2:20) Ma ọ́ bụghị Jizọs, anyị agaraghị enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Ọrụ 4:12) N’ihi ya, mmadụ niile kwesịrị ịmata ọrụ ọ na-arụ n’imezu nzube Chineke. A na-ezi ọtụtụ ndị ozizi ụgha. Ọ bụrụ na e nyereghị ha aka ịmata onye Kraịst bụ, ihe niile Baịbụl kwuru Chineke ga-emere ndị nwere okwukwe na Jizọs agaghị eru ha aka. Eziokwu anyị mụtara na Baịbụl na-eme ka anyị na-akụziri ndị mmadụ nke bụ́ eziokwu gbasara Jizọs. Otu n’ime ihe ndị anyị na-akụziri ha bụ na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. Ọzọ abụrụ ihe ọ na-arụ ka nzube Chineke mezuo. N’oge a anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs, ị̀ ga-eji ịnụ ọkụ n’obi gwa ndị mmadụ eziokwu gbasara Jizọs?