Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 23
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 23
Abụ nke 21 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 20 ¶16-21, igbe dị na peeji nke 207 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Ikpe 19-21 (Nkeji 8)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”—Taị. 2:14.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-akwado Ezi Ofufe Otú Jizọs Mere. Okwu. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Mee 15, 2013, peeji nke 8, paragraf nke 2, nakwa n’Ụlọ Nche Disemba 15, 2010, peeji nke 9-11, paragraf nke 12-16. Mee ka ndị na-ege ntị ghọta na ikwusa ozi ọma bụ “ezi ọrụ” Ndị Kraịst na-arụ. (Taị. 2:14) Kwuo ihe gosiri na ọ bụ n’ihi na anyị amarala eziokwu dị na Baịbụl mere anyị ji eji ịnụ ọkụ n’obi ezi ndị mmadụ ozi ọma ma na-amụrụ ha Baịbụl. Jaa ndị nọ n’ọgbakọ unu mma maka otú ha si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ezi ọrụ.
Nkeji 10: “Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Eziokwu Gbasara Jizọs.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eji “Ihe Atụ nke Mbụ” dị n’Ụlọ Nche Mee 15, 2014, peeji nke 8, paragraf nke 8, mee ihe ngosi. Nwanna ga-eme ihe ngosi a ga-ewebatakwa ihe atụ dị na paragraf nke 13 na peeji nke 9, n’ihe ngosi a.
Abụ nke 5 na Ekpere