Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 2
IZU NA-AMALITE NA MACH 2
Abụ nke 5 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 21 ¶1-8 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Rut 1-4 (Nkeji 8)
Nke 1: Rut 3:14–4:6 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Inye Jehova Chineke Ofufe A Na-ekewaghị Ekewa Pụtara—Ọpụ. 20:5 (Nkeji 5)
Nke 3: Otú Kraịst Bụ́ Eze Si Dị Umeala n’Obi na Ike O Nwere—igw p. 8 ¶5–p. 9 ¶4 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”—Taị. 2:14.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Mach. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” mee ihe ngosi ndị a. Ná mmechi, gbaa ụmụnna ume ka ha na-agụ magazin anyị.
Nkeji 10: “Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-enyere Ụmụnna Aka Ka Ha Na-arụ Ezi Ọrụ.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuo otú ihe omume ndị e mere ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa Febụwarị si gbasa isiokwu dịịrị ọnwa ahụ.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kwuo uru ha ritere mgbe ha mere ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Iji Telefon Ezi Ozi Ọma.” I nwere ike ịjụ ụmụnna otú ha si jiri telefon zie ndị mmadụ ozi ọma.
Abụ ọhụrụ isiokwu ya bụ́ “Jehova Bụ Aha Gị” na Ekpere
Chetakwa na a ga-ebu ụzọ kpọnyere ọgbakọ abụ ọhụrụ a ka ha gee. Ya kpọchaa, gwa ụmụnna ka ha bụzie ya.