Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 6
IZU NA-AMALITE N’EPREL 6
Abụ nke 124 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 22 ¶18-22, igbe dị na peeji nke 228 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Samuel 16-18 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Samuel 18:17-24 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Ahụhụ Ndị Mmadụ Na-ata?—igw p. 14 ¶1-4 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Ndị Ọchịchị Ma Ndị Ndịàmà Jehova Bụ Ji Aja Ha Mma—Rom 13:3 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Dị Njikere Ịrụ Ezi Ọrụ Ọ Bụla.”—Taị. 3:1.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Eprel. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, tụlezienụ ihe ndị dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.”
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kwuo uru ha ritere mgbe ha mere ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Inwe Ndị Anyị Na-ewegara Magazin Ọ Bụla E Bipụtara.” Gwa ụmụnna ka ha kọọ ahụmahụ ndị dị ụtọ ha nwere mgbe ha wegaara ndị mmadụ magazin.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Abụ nke 106 na Ekpere