Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 4
IZU NA-AMALITE NA MEE 4
Abụ nke 68 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 24 ¶1-10 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Samuel 1-3 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Samuel 2:24-32 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Uru Inwe Ndidi na Ịdị Nwayọọ n’Obi Bara (Nkeji 5)
Nke 3: Amụma Baịbụl Ndị Ga-emezu n’Oge Na-adịghị Anya—igw p. 16 ¶4–p. 17 ¶1 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Jirinụ oge unu na-eme ihe bara uru iji gosi na unu ma ihe.—Efe. 5:15, 16.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ. E nwere ike imekwu ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta!
Nkeji 5: Akwụkwọ A Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Mee na Jun. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuo ihe ndị dị n’akwụkwọ ndị ahụ. A ga-eme ihe ngosi otú e nwere ike isi nye ha ndị mmadụ.
Nkeji 15: Ịga Ozi Ọma n’Ókèala A Na-anaghị Ezikarị Ozi Ọma So n’Ụzọ Anyị Si Eji Oge Anyị Eme Ihe Bara Uru. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ okenye ga-eme ihe omume a. E nwee okenye garala ozi ọma n’ụdị ókèala a, ọ ga-aka mma ka ọ bụrụ ya ga-eme ihe omume a. Kpọnyere ụmụnna vidio bụ́ Ikwusa Ozi Ọma n’Ime Ime Obodo Ndị Dị n’Ọstrelia. (Ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere GBASARA ANYỊ, pịa IHE NDỊ ANYỊ NA-EME ka ị hụ vidio a.) Kwuonụ okwu n’uru dị iche iche ezinụlọ e lere na vidio ahụ ritere mgbe ha gara ozi ọma n’ókèala a na-anaghị ezikarị ozi ọma. Gbaa nwanna nọ n’ọgbakọ garala ụdị ebe a zie ozi ọma ajụjụ ọnụ. Olee uru ọ baara ezinụlọ ha? Olee otú o sirila nyere ha aka n’ozi ọma? Olee otú o sirila mee ka ha na Jehova dịkwuo ná mma? Olee ihe ndị ha hazigasịrị tupu ha enwee ike ịgawa ebe ahụ? Gwa ụmụnna na ndị okenye ga-enyere onye ọ bụla chọrọ ịga ozi ọma n’ụdị ebe a aka. Mee ka o doo ụmụnna anya na otu n’ime ụzọ dị mma anyị ga-esi jiri oge anyị mee ihe bara uru bụ ịga zie ozi ọma n’ókèala a na-anaghị ezikarị ozi ọma.
Abụ ọhụrụ isiokwu ya bụ “Na-ezi Ha Ka Ha Guzosie Ike” na Ekpere
Chetakwa na a ga-ebu ụzọ kpọnyere ọgbakọ abụ ọhụrụ a ka ha gee. Ya kpọchaa, gwa ụmụnna ka ha bụzie ya.