Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 27
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 27
Abụ nke 18 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 28 ¶1-9 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Eze 15-17 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ndị Eze 15:16-24 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Ihe Baịbụl Kwuru Ga-enyere Ndị Bụ́ Nwunye Aka?—igw p. 26 ¶3-4 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Ndị Mmụọ Ọjọọ Niile Ji Kwere na Chineke Dị—Jems 2:19 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Mat. 28:19, 20.
Nkeji 7: “Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù Ka Ha Bịa Mgbakọ Ukwu.” Ajụjụ na azịza. Unu ruo na paragraf nke atọ, meenụ ihe ngosi na-agaghị egbu oge iji gosi otú e nwere ike isi nye mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù.
Nkeji 10: “Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche Banyere Mgbakọ Ukwu.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ihe omume a. Kwuo okwu n’amaokwu Baịbụl ụfọdụ dị n’isiokwu a ma gosi otú e nwere ike isi mee ihe ha kwuru ná mgbakọ afọ a. Kwuo gbasara ihe ụfọdụ e kwuru okwu ha n’akwụkwọ ozi Ọgọst 3, 2013, e detaara ọgbakọ niile nke kwuru gbasara ihe ndị anyị kwesịrị ime ka anyị ghara imerụ ahụ́ ma anyị gaa mgbakọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe.
Nkeji 7: Jiri Akwụkwọ Ihe Baịbụl Na-ekwu Nyere Onye Ị Na-amụrụ Ihe Aka. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Tụlee otú anyị ga-esi jiri ihe ndị dị n’akwụkwọ ahụ nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka. Ụfọdụ n’ime ha bụ: (1) “Otú Ị Ga-esi Chọta Amaokwu Ndị Dị na Baịbụl.” (2) Ajụjụ nke 19: “Gịnị dị n’akwụkwọ dị iche iche e nwere na Baịbụl?” (3) Ajụjụ nke 20: “Olee otú ị ga-esi na-agụ Baịbụl ka ọ baara gị ezigbo uru?” A ga-eme ihe ngosi na-agaghị egbu oge ebe nwanna na onye ọ na-amụrụ Baịbụl na-atụle otu n’ime ihe ndị a mgbe ha mụchara ihe.
Nkeji 6: “Ngwá Ọrụ Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Baịbụl.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 125 na Ekpere