Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 10
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 10
Abụ nke 61 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 28 ¶18-21, igbe dị na peeji nke 289 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Eze 21-22 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ndị Eze 22:13-23 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Gị na Chineke Dị ná Mma?—igw p. 28 ¶1-4 (Nkeji 5)
Nke 3: Kpachara Anya Ka Ike Dị Aghụghọ nke Akụnụba Ghara Inweta Gị—Mat. 13:22 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Mụ onwe m na ezinụlọ m ga-efe Jehova.’—Jọsh. 24:15.
Nkeji 10: ‘Mụ Onwe M na Ezinụlọ M Ga-efe Jehova.’ Okwu dabeere n’isiokwu ọnwa a. Gụọ Diuterọnọmi 6:6, 7; Jọshụa 24:15; na Ilu 22:6. Kọwaakwa ha. Mee ka mmadụ niile ghọta na ọ bụ di ma ọ bụkwanụ nna kwesịrị ịna-ebute ụzọ n’ofufe Jehova n’ezinụlọ. Kpọgasịa aha ihe dị iche iche ọgbakọ Jehova mepụtarala na-enyere ezinụlọ aka ife Jehova. Gosi otú ihe omume ụfọdụ a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa a si gbasa isiokwu ọnwa a.
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Inyere Ndị Malitere Ikwusa Ozi Ọma Ọhụrụ Aka.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ụmụnna ka ha kwuo otú ndị nne na nna nwere ike isi mee ihe e kwuru n’isiokwu a ma ha na-akụziri ụmụ ha otú ha ga-esi na-ezi ozi ọma. A ga-eme ihe ngosi ebe nna na-akụziri nwa ya otú ọ ga-esi zie mmadụ ozi ọma.
Abụ nke 93 na Ekpere