Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 30
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 30
Abụ nke 94 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
ia isi nke 3 ¶14-21, igbe dị na p. 30, nakwa nke dị na p. 32 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ihe E Mere 6-9 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Ihe E Mere 6:22-27 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ọchịchị Kraịst Na-eweta Ngọzi—wp14 4/1 p. 16 para. 1-4 (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka A Na-akwanyere Anyị Ùgwù? (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too.”—1 Kọr. 3:6.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Disemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, ụmụnna ekwuo ihe ha mụtara n’ihe ngosi nke ọ bụla.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kọwaa otú ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Inye Ndị Mmadụ Akwụkwọ Bible Na-akụzi,” sirila nyere ha aka n’ozi ọma. Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Abụ nke 141 na Ekpere
Chetakwa na a ga-ebu ụzọ kpọnyere ọgbakọ abụ ọhụrụ a ka ha gee. Ya kpọchaa, gwa ụmụnna ka ha bụzie ya.