Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
ỌGỌST 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | TAỊTỌS 1–FAỊLIMỌN
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w89 5/15 31 ¶5
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
O nwetụghị mgbe ihe Pọl kwuru gosiri na ọ na-akwado ịkpa ókè agbụrụ megide ndị Krit. Ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na ihe a bụ eziokwu bụ na Pọl ma na e nwere ụmụnna ndị na-eme nke ọma na Krit, bụ́ ndị Chineke nabatara ma jiri mmụọ nsọ ya tee mmanụ. (Ọrụ Ndịozi 2:5, 11, 33) E nwere ọtụtụ Ndị Kraịst ji ofufe Chineke kpọrọ ihe n’ebe ahụ nke na ha zuru iji hiwe ọgbakọ “n’obodo dị iche iche.” Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst ndị ahụ ezughị okè, ma anyị ma na ha abụghị ndị ụgha na ndị na-eri oké nri bụ́ ndị na-enweghị ihe ha na-arụ. A sị na ha bụ, Jehova agaraghị anabata ha. (Ndị Filipaị 3:18, 19; Mkpughe 21:8) Dị ka ọ dịkwa n’ọtụtụ obodo taa, ọ ga-abụkwa na e nwere ndị bi na Krit omume rụrụ arụ a na-eme ebe ahụ na-asọ oyi. Ha dịkwa njikere ige ntị n’ozi ọma banyere Kraịst.—Ezikiel 9:4; tụlee Ọrụ Ndịozi 13:48.
ỌGỌST 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ HIBRU 1–3
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1185 ¶1
Onyinyo
Otú Jizọs si yie Nna ya ọ̀ ha otu kemgbe e kere ya?
Ọkpara Chineke, bụ́ onye e mechara kpọwa Jizọs, bụ onyinyo nke Nna ya. (2 Kọr. 4:4) Ebe ọ bụ na o doro anya na ọ bụ Ọkpara Chineke bụ onye ahụ Chineke gwara, sị: “Ka anyị mee mmadụ n’onyinyo anyị,” ọ pụtara na Ọkpara ahụ yiri Nna ya malite mgbe e kere ya. (Jen. 1:26; Jọn 1:1-3; Kọl. 1:15, 16) Mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ kpara àgwà ka Nna ya otú kachanụ mmadụ nwere ike. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9; 5:17, 19, 30, 36; 8:28, 38, 42) Ma, Jizọs bịara yikwuo Nna ya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ya abụrụ mmụọ, Nna ya bụ́ Jehova enyekwa ya “ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (1 Pita 3:18; Mat. 28:18) Ebe ọ bụ na Chineke buliri Jizọs elu ka ọ nọrọ “n’ọkwá ka elu,” Jizọs na-akpa àgwà ka Nna ya ugbu a karịa otú o mere tupu ya abịa n’ụwa. (Fil. 2:9; Hib. 2:9) Ugbu a, ‘o yiri [Chineke] kpọmkwem.’—Hib. 1:2-4.
it-1 1063 ¶7
Eluigwe
Abụ Ọma 102:25, 26 na-ekwu banyere Jehova Chineke, ma Pọl onyeozi kwughachiri ihe ebe ahụ kwuru mgbe ọ na-ekwu banyere Jizọs Kraịst. Ihe mere o ji mee ya bụ na ọ bụ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya ka Chineke si n’aka ya kee ihe ndị a na-ahụ anya dị na mbara igwe na n’ụwa. Pọl nọ na-ekwu na Ọkpara ahụ ga na-adị ndụ na-aga. Ọ dịghị ka ụwa nke Chineke nwere ike ịla n’iyi ma ọ chọọ, nke o nwere ike ‘ịfụkọta dị nnọọ ka ákwà mgbokwasị’ ma tụpụ ya n’akụkụ.—Hib. 1:1, 2, 8, 10-12; tụlee 1 Pita 2:3.
ỌGỌST 26–SEPTEMBA 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ HIBRU 4–6
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1139 ¶2
Olileanya
Olileanya anyị nwere na anyị ga-adị ndụ ebighị na nke “ndị so ná ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe” nwere na ha ga-enweta ereghị ure (Hib. 3:1) bụ olileanya siri ike nke nwere ezigbo ihe ọ dabeere na ya. E nwere ihe abụọ ndị Chineke na-apụghị ikwu okwu ụgha na ha mere obi ji sie anyị ike n’olileanya a. Ha bụ nkwa ya na iyi ọ ṅụrụ. Ọ bụkwa Kraịst, onye nwere anwụghị anwụ n’eluigwe ugbu a, ka ọ ga-esi n’aka ya mezuo ihe ndị a. N’ihi ya, Baịbụl kwuru na olileanya a dị ka “arịlịka maka mkpụrụ obi. Ọ bụ nke e ji n’aka, nke guzosikwara ike. Ọ na-abanyekwa n’ime ákwà mgbochi ahụ [otú ahụ onyeisi nchụàjà si abanye n’Ebe Kasị Nsọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie], bụ́ ebe onye obu ụzọ banyeworo n’ihi ọdịmma anyị, ya bụ, Jizọs, onye ghọworo nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek ruo mgbe ebighị ebi.”—Hib. 6:17-20.