Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
ỌKTOBA 14-20
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 565 ¶3
Onye Nlekọta
Onye Nlekọta Kachanụ. Na 1 Pita 2:25, o yiri ka Pita ọ̀ nọ na-ekwu ihe dị n’Aịzaya 53:6 mgbe o kwuru banyere ndị dị ka ‘atụrụ ndị kpafuru akpafu.’ O kwuziri, sị: “Ma ugbu a, unu alaghachikwuruwo onye ọzụzụ atụrụ na onye nlekọta nke mkpụrụ obi unu.” Ọ ga-abụ na onye Pita na-ekwu na ha hapụrụ bụ Jehova ebe ọ bụ na ndị Pita degaara akwụkwọ ozi ahụ ahapụghị Jizọs Kraịst, kama, ha si n’aka ya laghachikwute Jehova, onye bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Kachanụ. (Ọma 23:1; 80:1; Jere. 23:3; Ezik. 34:12) Jehova bụkwa onye nlekọta, onye na-eme nnyocha. (Ọma 17:3) Nnyocha ahụ (n’asụsụ Grik, e·pi·sko·peʹ) nwere ike inwe ihe jikọrọ ya na ikpe ọmụma Jehova, dị ka nke ahụ ọ mara Jeruselem n’oge ndịozi, n’ihi na ha aghọtaghị oge ‘e ji eleta ha [n’asụsụ Grik, e·pi·sko·pesʹ].’ (Luk 19:44) Nnyocha Jehova nwekwara ike ịbara ndị mmadụ uru, dị ka ọ baara ndị na-enye ya otuto n’ụbọchị ‘nleta ya [n’asụsụ Grik, e·pi·sko·pesʹ].’—1 Pita 2:12.