Mee 18-24
JENESIS 40-41
Abụ nke 8 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Jehova Napụtara Josef”: (Nkeji 10)
Jen. 41:9-13—Fero nụrụ banyere Josef (w15 2/1 14 ¶4-5)
Jen. 41:16, 29-32—Jehova mere ka Josef mata ihe nrọ Fero pụtara (w15 2/1 14-15)
Jen. 41:38-40—Josef ghọrọ osote Eze Fero n’Ijipt (w15 2/1 15 ¶3)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Jen. 41:14—Gịnị mere Josef ji kpụọ isi ya na afụ ọnụ ya tupu ya agawa ịhụ Fero? (w15 11/1 9 ¶1-3)
Jen. 41:33—Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Josef si gwa Fero okwu? (w09 11/15 28 ¶14)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jen. 40:1-23 (th ihe ọmụmụ nke 2)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ, jụọkwa ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee ihe gosiri na di na nwunye ahụ jikọrọ aka kwadebe maka nletaghachi ahụ? Olee otú nwanna nwoke ahụ si mee ka a ghọta otú a ga-esi mee ihe amaokwu Baịbụl ahụ kwuru?
Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị na peeji nke mbụ mee ya. (th ihe ọmụmụ nke 11)
Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Nyezie ya otu akwụkwọ dị n’Ihe Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. (th ihe ọmụmụ nke 13)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ṅomie Josef—Na-edi Ihe Na-adịghị Mma E Mere Gị: (Nkeji 6) Buru ụzọ kpọnye vidio bụ́ Bụrụ Enyi Jehova—Na-edi Ihe Na-adịghị Mma E Mere Gị. Gwazie ụmụaka ụfọdụ ka ha gbagote n’elu ikpo okwu, jụọkwa ha ajụjụ ndị a: Olee ihe na-adịghị mma e mere Kelechi na Sọpụrụchi? Gịnị ka i chere ha mụtara n’akụkọ Josef?
Mkpa Ọgbakọ: (Nkeji 9)
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 115
Okwu Mmechi (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Abụ nke 124 na Ekpere