Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb20 Mee p. 8
  • Ṅomie Josef—Gbaara Omume Rụrụ Arụ Ọsọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ṅomie Josef—Gbaara Omume Rụrụ Arụ Ọsọ
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmekọahụ?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ịgbalị Ibi Ndụ Nwere Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • ‘Gbaara Ịkwa Iko Ọsọ’
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Onye M Ga-eṅomi—Josef
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
mwb20 Mee p. 8
Ebe Josef na-agbapụ, nwunye Pọtifa ejide uwe ya.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ṅomie Josef​—Gbaara Omume Rụrụ Arụ Ọsọ

Ihe Josef mere ga-abara anyị ezigbo uru ma ọ bụrụ na a na-anwa anyị ọnwụnwa ime omume rụrụ arụ. N’oge niile nwunye nna ya ukwu chọrọ ịrata ya ka ha nwee mmekọahụ, ọ jụwapụrụ isi. (Jen. 39:​7-10) Ọ gwara nwaanyị ahụ, sị: “Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?” Ihe a gosiri na o bula ụzọ chee banyere otú Jehova si ele di ma ọ bụ nwunye ịgba n’èzí anya. Mgbe ihe bịara sie ike, ọ hapụrụ nwaanyị ahụ gbaa ọsọ kama ịnọ ebe ahụ kwe ka nwaanyị ahụ rata ya ime ihe na-adịghị mma.​—Jen. 39:12; 1 Kọr. 6:18.

LEENỤ VIDIO BỤ́, GBAARA OMUME RỤRỤ ARỤ ỌSỌ? ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Ebe Mee-Kyong na-agwa Jin okwu n’ụlọ akwụkwọ ha.

    Olee ọnwụnwa bịaara Jin?

  • Ebe Jin na-ele Mee-Kyong anya ka ọ na-eche banyere ihe Mee-Kyong sịrị ya meere ya.

    Olee ajụjụ Jin jụrụ onwe ya mgbe Mee-Kyong gwara ya ka o nyere ya aka ná mgbakọ na mwepụ e nyere ya mee?

  • Gịnị ka ihe a Mee-Kyong rịọrọ Jin mere ka Jin na-echezi?

  • Ebe Jin na-agwa nwanne papa ya bụ́ okenye okwu.

    Olee otú Jin si nweta enyemaka?

  • Jin ekweghị anabata Mee-Kyong ka ọ bụrụ enyi ya n’Ịntanet.

    Olee ihe Jin mere iji gbaara omume rụrụ arụ ọsọ?

  • Olee ihe ndị ị mụtara na vidio a?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya