AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 48-50
Ndị Agadị Nwere Ọtụtụ Ihe Ha Ga-akụziri Ndị Ọzọ
Ọ bụrụ na ndị agadi akọọrọ anyị banyere ‘ọrụ ndị dị ebube’ ha jirila anya ha hụ ka Jehova na-arụ n’oge ikpeazụ a, ọ na-eme ka okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ, nakwa ná nkwa ndị o kwere na-esikwu ike. (Ọma 71:17, 18) Ọ bụrụ na unu nwere ndị agadi n’ọgbakọ unu, jụọ ha
otú Jehova si nyere ha aka imeri nsogbu ndị bịaara ha ka ha na-ejere ya ozi
banyere mmụba ha hụrụla e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa
banyere ọṅụ ha na-enwe ma e mee ka otú anyị si ghọta eziokwu Baịbụl dokwuo anya
banyere mgbanwe ndị ha hụrụla e nwere ná nzukọ Jehova