OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Gịnị Ka Ihe Ndị Chineke Kere Na-akụziri Anyị Banyere Inwe Obi Ike?
Jehova ji ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl na-akụziri anyị ezigbo àgwà ndị ọ chọrọ ka anyị na-akpa. Ma, ọ na-ejikwa ihe ndị ọzọ o kere eke akụziri anyị ihe. (Job 12:7, 8) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta banyere inwe obi ike n’aka ọdụm, ịnyịnya, anụ a na-akpọ mongoose, nnụnụ a na-akpọ hummingbird, na enyi?
LEENỤ VIDIO BỤ́ SI N’IHE NDỊ CHINEKE KERE MỤTA INWE OBI IKE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee otú nne ọdụm si egosi na o nwere obi ike mgbe ọ na-echebe ụmụ ya?
Olee otú e si azụ ịnyịnya ka ọ ghara ịtụ ụjọ n’ọgbọ agha?
Gịnị mere anụ a na-akpọ mongoose anaghị atụ agwọ ụjọ?
Olee otú obere nnụnụ a na-akpọ hummingbird si egosi na o nwere obi ike?
Olee otú enyi si egosi na ha nwere obi ike ma ha gaa ichebe enyi ibe ha?
Olee ihe ị na-amụta n’aka ụmụ anụmanụ ndị a banyere inwe obi ike?