Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
ỌGỌST 3-9
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 782 ¶2-3
Ọpụpụ
Olee ebe e si kewaa Oké Osimiri Uhie ka ụmụ Izrel nwee ike ịgafe?
Mgbe ụmụ Izrel ruru n’Itam ná “nsọtụ ala ịkpa ahụ,” Chineke gwara Mozis ka ọ gwa ụmụ Izrel ka ha “laghachi azụ maa ụlọikwuu n’ihu Paịhahaịrọt . . . n’akụkụ oké osimiri ahụ.” Otú a ụmụ Izrel si tụgharịa laghachiwe azụ ga-eme ka Fero chee na ha nọ “ná mgbagwoju anya wee na-awagharị.” (Ọpụ. 13:20; 14:1-3) E nwere ndị ọkà mmụta na-ekwu na ọ dị ka ọ̀ bụ ụzọ el Haj ka ụmụ Izrel si. Ha sị na okwu Hibru e si sụgharịta okwu bụ́ “laghachi azụ” apụtaghị naanị itinye isi n’ụzọ ọzọ, kama na ọ pụtara ịlaghachi azụ kpamkpam ma ọ bụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, isi ụzọ ọzọ ka too ogologo. Ha na-ekwu na mgbe ụmụ Izrel rutere n’ebe ọnụ ọnụ ebe ugwu Oké Osimiri Uhie ahụ, ha tụgharịrị ma tinye isi Jebel bụ́ ugwu dị nso n’ebe ahụ nke dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ. N’ebe a ụmụ Izrel nọ ugbu a, ọ ga-esiri ha ike ịchọta ebe ha ga-esi gbapụ ngwa ngwa ma e si n’ebe ugwu chụwa ha ọsọ n’ihi na ha karịrị akarị. Ha chọwagodị ịgbapụ, ha ga-agbarute n’ebe Oké Osimiri Uhie dị, ha agaghịzi ahụ ebe ha ga-esi agbapụ.
Ọ bụkwa ihe a ka a na-akụzi n’omenala ndị Juu n’oge ndịozi. Ma, nke kacha mkpa bụ na ihe a dabara n’ihe Baịbụl kọrọ. Ma, ọ bụghị ihe a ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu. (Ọpụ. 14:9-16) Ọ ga-abụ na ebe ụmụ Izrel si gafee Oké Osimiri Uhie ahụ dị ezigbo anya ma e si n’ebe ugwu Oké Osimiri Uhie ahụ gbadatawa. Ọ bụ ya mere na ndị agha Fero enwelighị ike isi n’otu akụkụ nke ebe ugwu Oké Osimiri Uhie ahụ gafeta n’akụkụ ya nke ọzọ ozugbo ma jide ụmụ Izrel.—Ọpụ. 14:22, 23.
ỌGỌST 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 15-16
“Jiri Abụ Too Jehova”
it-2 454 ¶1
Egwú
A na-ekekarị ndị na-agụ abụ n’oge ụmụ Izrel ụzọ abụọ. Otu ndị na-agụ, ndị nke ọzọ ana-ekwechi, ma ọ bụkwanụ otu onye na-agụ, ndị nke ọzọ ana-ekwechi. Na Baịbụl, e ji okwu bụ́ ‘na-abụ abụ’ ma ọ bụ “na-agụ egwú” kọwaa ụdị egwú a. (Ọpụ. 15:21; 1 Sam. 18:6, 7) Otú e si dee abụ ụfọdụ dị n’akwụkwọ Abụ Ọma gosiri na ọ bụ otú a ka e bu n’obi ka e si bụọ ha, dị ka, Abụ Ọma 136. Otú e si kọwaa ìgwè abụọ na-abụ abụ otuto n’oge Nehemaya na otú ha si bụọ abụ mgbe e wuchara mgbidi Jeruselem gosiri na ọ bụ otú a ka ha si bụọ ya.—Nehe. 12:31, 38, 40-42.
it-2 698
Onye Amụma Nwaanyị
Miriam bụ nwaanyị mbụ a kpọrọ onye amụma nwaanyị na Baịbụl. Ọ dị ka Chineke ò si n’aka ya gwa ndị mmadụ okwu. O nwere ike ịbụ na Chineke si n’ike mmụọ nsọ ya mee ka o jiri abụ gwa ndị mmadụ ihe ndị ahụ. (Ọpụ. 15:20, 21) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na ya na Erọn gwara Mozis, sị: “[Jehova] ó sibeghị n’ọnụ anyị onwe anyị kwuokwa okwu?” (Ọnụ Ọgụ. 12:2) Jehova n’onwe ya si n’ọnụ Maịka onye amụma kwuo na ya zigaara ụmụ Izrel “Mozis, Erọn na Miriam” mgbe ọ na-anapụta ha n’aka ndị Ijipt. (Maị. 6:4) Ọ bụ eziokwu na Miriam so ná ndị Chineke si n’ọnụ ha gwa ndị ya okwu, ma e nweghị mgbe Chineke ji ya gwa ụmụ Izrel okwu karịa otú o ji nwanne ya nwoke bụ́ Mozis. Mgbe onwe ya malitere ibu ya isi, Chineke nyere ya ntaramahụhụ dị ukwuu.—Ọnụ Ọgụ. 12:1-15.
ỌGỌST 17-23
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 406
Akwụkwọ Baịbụl
Akwụkwọ ndị a Mozis dere si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ihe e dere na ha bụkwa ihe ga-enyere anyị aka ife Chineke nke ọma. O doro anya na ihe ndị e dere na ha bụ eziokwu. Ọ bụghị Mozis ji aka ya mee onwe ya onye ndú ụmụ Izrel. Na mbụ, o kwetadịghị ịrụ ọrụ ahụ. (Ọpụ. 3:10, 11; 4:10-14) Kama, Chineke ji aka ya họpụta Mozis ma nye ya ikike ịrụ ọrụ ebube nke mere na ndị anwansi Fero kwetara na ike Mozis ji arụ ọrụ si n’aka Chineke. (Ọpụ. 4:1-9; 8:16-19) N’ihi ya, ọ bụghị Mozis ji aka ya mee onwe ya onye na-ekwuchite ọnụ ụmụ Izrel na onye na-ede akwụkwọ. Kama o rubere isi kwe ka Chineke jiri mmụọ nsọ ya mee ka o kwuo okwu ma dee akwụkwọ ụfọdụ dị na Baịbụl e nwere taa.—Ọpụ. 17:14.
ỌGỌST 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 19-20
“Uru Iwu Iri Ahụ Na-abara Gị”
w89 11/15 5 ¶6
Gịnị Ka Iwu Iri Ahụ Pụtara Nye Anyị?
Iwu anọ ndị mbụ ahụ mere ka [anyị mata ihe ndị Chineke chọrọ anyị n’aka]. (Nke mbụ) Ọ bụ Chineke nke ka nọgidere na-achọ ka a rara ofufe nye nanị ya. (Matiu 4:10) (Nke abụọ) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị na-efe ya ofufe kwesịrị iji ihe oyiyi dị iche iche na-eme ihe. (1 Jọn 5:21) (Nke atọ) Ojiji anyị na-eji aha Chineke eme ihe kwesịrị ịbụ n’ụzọ ziri ezi, nke a kwanyekwaara ùgwù, ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị kwesịrị iji ya eme ihe n’ụzọ na-egosi enweghị nsọpụrụ. (Jọn 17:26; Ndị Rom 10:13) (Nke anọ) Ihe ndị dị nsọ kwesịrị ịbụ isi ihe ná ndụ anyị dum. Nke a na-eme ka anyị nwee ike izuru ike, ma ọ bụ ‘iwere ụbọchị izu ike,’ site n’ụzọ ndụ nke ịgụ onwe anyị ná ndị ezi omume.—Ndị Hibru 4:9, 10.
w89 11/15 6 ¶1-2
Gịnị Ka Iwu Iri Ahụ Pụtara Nye Anyị?
(Nke ise) Ụmụntakịrị irubere ndị mụrụ ha isi ka nọgidere na-abụ isi ihe dị n’inwe ezinụlọ nke dị n’otu, na-ewetakwa ngọzi Jehova. Leekwa olileanya dị ebube ‘iwu mbụ nke a nke nkwa dịịrị ya’ na-enye! Ọ bụghị nanị “ka ihe wee gaara gị nke ọma,” kama “ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 6:1-3) Ugbu a anyị na-ebi n’ime “mgbe ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe dị ugbu a, nrubeisi dị otú a n’egwu Chineke na-enye ndị na-eto eto olileanya nke anwụghị anwụ ma ọlị.—2 Timoti 3:1; Jọn 11:26.
Ịhụ onye agbata obi anyị n’anya ga-egbochi anyị imeru ya ahụ site n’ajọ omume ndị dị ka (Nke isii) igbu mmadụ, (Nke asaa) ịkwa iko, (Nke asatọ) izu ohi, na (Nke itoolu) ikwu okwu ụgha. (1 Jọn 3:10-12; Ndị Hibru 13:4; Ndị Efesọs 4:28; Matiu 5:37; Ilu 6:16-19) Ma gịnị banyere ihe ndị bụ ebumnuche anyị? Iwu (Nke iri) ahụ nke megidere inwe anya ukwu, na-echetara anyị na Jehova chọrọ ka nzube obi anyị nọgide mgbe nile na-abụ nke ziri ezi n’anya ya.—Ilu 21:2.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 687 ¶1-2
Onye Nchụàjà
Ịbụ Ndị Nchụàjà nke Ndị Kraịst. Jehova kwere ụmụ Izrel nkwa na ọ bụrụ na ha edebe ọgbụgba ndụ ya, na ha ga-aghọrọ ya “alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ.” (Ọpụ. 19:6) Ma, ndị ga-abụ ndị nchụàjà ahụ ga na-esi n’ezinụlọ Erọn. Ha ga-anọchi anya ndị nchụàjà ọzọ ka ha mkpa a ga-enwe n’ọdịnihu. Ha ga-abụ ndị nchụàjà ruo mgbe a ga-enwe ndị nke ahụ ka ha mkpa. (Hib. 8:4, 5) Ndị nchụàjà si n’ezinụlọ Erọn ka ga na-arụ ọrụ ha ruo mgbe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ga-akwụsị, e nwee ọgbụgba ndụ ọhụrụ. (Hib. 7:11-14; 8:6, 7, 13) Na mbụ, ọ bụ naanị ụmụ Izrel ka e nyere ohere ịbụrụ Jehova ndị nchụàjà n’Alaeze ya. Ma, e mechara nyezie ndị na-abụghị ndị Juu ohere ịbụ ndị nchụàjà n’Alaeze Chineke.—Ọrụ 10:34, 35; 15:14; Rom 10:21.
Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ndị Juu nabatara Kraịst. N’ihi ya, e silighị ná mba ahụ nweta ndị niile ga-abụ alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ. (Rom 11:7, 20) Chineke ebula ụzọ si n’aka onye amụma ya bụ́ Hosia dọọ ụmụ Izrel aka ná ntị maka ihe a nwere ike ime ha n’ihi nnupụisi ha. Ọ gwara ha, sị: “Ndị m ga-ala n’iyi, n’ihi na ihe ọmụma adịghị. Ebe ọ bụ na ị jụwo ihe ọmụma, mụ onwe m ga-ajụ gị ka ị ghara ịbụkwa onye nchụàjà m; ebe ọ bụ na ị na-echefu iwu Chineke gị, mụ onwe m ga-echefu ụmụ gị.” (Hos. 4:6) Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị ndú ndị Juu, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” (Mat. 21:43) Ma, mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ ma na Chineke ka ji ndị nchụàjà si n’ezinụlọ Erọn na-arụ ọrụ. Ọ bụ ya mere o ji gwa ndị ekpenta ahụ ọ gwọrọ ka ha gakwuru ndị nchụàjà ma nye onyinye iwu kwuru ka e nye.—Mat. 8:4; Mak 1:44; Luk 17:14.
ỌGỌST 31–SEPTEMBA 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 21-22
“Na-ele Ndụ Anya Otú Jehova Si Ele Ya”
it-1 271
Iti Ihe
Onye Hibru nke nwere ohu nwere ike iti ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ihe ma ọ bụrụ na o nupụrụ ya isi. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ nwe ohu etie ohu ya ihe, ya anwụọ, a ga-ata ya ahụhụ maka ya. Ma, ọ bụrụ na ohu ahụ anwụghị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ e tichara ya ihe, ọ ga-egosi na ebumnobi onye nwe ohu ahụ abụghị igbu ya egbu. Onye nwe ohu nwere ikike inye ohu ya ntaramahụhụ ma o mejọọ ihe n’ihi na ohu ahụ bụ “ego ya.” O yighị ka mmadụ ọ̀ ga-achọ ibibi ihe o nwere dị ya ezigbo mkpa, mee ka ihe funahụ ya. Ihe ọzọ abụrụ na ọ bụrụ na ohu ahụ nwụrụ otu ụbọchị ma ọ bụ karịa e tichara ya ihe, o nwere ike a gaghịzi ama ma ọ̀ bụ ihe e tiri ya gburu ya ka ọ̀ bụ ihe ọzọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ohu ahụ nwụrụ otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ e tichara ya ihe, ikpe agaghị ama nna ya ukwu.—Ọpụ. 21:20, 21.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1143
Mpi
Ihe a e kwuru n’Ọpụpụ 21:14 nwere ike ịpụta na a ga-egbudị onye nchụàjà ma ọ bụrụ na o gburu mmadụ, ma ọ bụkwanụ ya apụta na ịga jide mpi ebe ịchụàjà aka agaghị eme ka a ghara igbu onye kpachaara anya gbuo mmadụ.—Tụlee 1 Eze 2:28-34.