Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
ỌKTOBA 5-11
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w87 9/1 29
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
[Mmadụ] (ịbụ onye e dere aha ya “n’akwụkwọ nke ndụ”) apụtaghị na o jidewo n’aka na ọ ga-enwe ndụ ebighị ebi dị ka à ga-asị na nke a bụ ihe a na-apụghị ịgbanwe agbanwe ma ọ bụ na e buworị ụzọ kpebie na ọ ga-adị otú ahụ. Banyere ndị Israel, Moses jụrụ Jehova, sị: “Ma ugbu a, ọ bụrụ na ị ga-agbaghara mmehie ha;—ọ bụrụ na i meghị ya, biko, hichapụ m n’akwụkwọ gị nke i deworo.” Chineke zaghachiri ya, sị: “Onye ọ bụla nke mehiere megide m, ya ka m ga-ehichapụ n’akwụkwọ m.” (Ọpụpụ 32:32, 33) Ee, ọbụna mgbe Chineke denyesịworo mmadụ dị ka onye kwesịrị ịnọ “n’akwụkwọ” ya, onye ahụ pụrụ ịghọ onye nnupụisi ma ọ bụ onye na-anọgideghị n’okwukwe ya. Ọ bụrụ na nke ahụ mee, Chineke ‘ga-ehichapụ onye ahụ n’akwụkwọ nke ndụ.’—Mkpughe 3:5.
ỌKTOBA 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 33-34
“Àgwà Jehova Ndị Magburu Onwe Ha”
it-2 466-467
Aha
Ihe ndị a na-ahụ anya Chineke kere na-egosi na Chineke dị adị. Ma, ha anaghị eme ka a mata aha ya. (Ọma 19:1; Rom 1:20) Mmadụ ịma aha Chineke apụtaghị naanị onye ahụ ịma otú e si akpọ ya. (2 Ihe 6:33) Ọ pụtara ịma onye nwe aha ahụ nke ọma, ya bụ, ịmata ihe Okwu ya kwuru bụ́ nzube ya, ọrụ ya, na àgwà ya. (Tụlee 1 Eze 8:41-43; 9:3, 7; Nehe. 9:10.) Ihe mere ná ndụ Mozis gosiri na nke a bụ eziokwu. Ọ bụ nwoke Jehova ma “n’aha.” Ihe ọ pụtara bụ na Jehova ma ya nke ọma. (Ọpụ. 33:12) Mozis hụrụ ebube Jehova, nụkwa ka Jehova ‘kpọsara aha ya.’ (Ọpụ. 34:5) Ihe Jehova mere abụghị naanị ịkpọ aha ya. Kama, o mere ka Mozis mata àgwà ndị o nwere na ọrụ ya dị iche iche. Ọ sịrị: “Jehova, Jehova, Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-eme ka obiọma ya ruoro ọtụtụ puku ọgbọ, na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie, ma ọ gaghị anwa anwa hapụ inye ntaramahụhụ, ọ na-enye ndị bụ́ ụmụ ntaramahụhụ maka njehie nna ha, na-enyekwa ụmụ ụmụ ha, na-enyekwa ọgbọ nke atọ na ọgbọ nke anọ.” (Ọpụ. 34:6, 7) Otú ahụkwa ka ọ dị n’abụ Mozis dere na ya “ga-akpọsa aha Jehova.” O kwuru otú Chineke si meso ndị Izrel ihe nakwa ụdị onye Jehova bụ.—Diut. 32:3-44.
ỌKTOBA 26–NỌVEMBA 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 37-38
“Ebe Ịchụàjà Ndị Dị n’Ụlọikwuu na Ọrụ Ha n’Ofufe Jehova”
it-1 82 ¶3
Ebe Ịchụàjà
Ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ. E jikwa osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ (a na-akpọkwa ya “ebe ịchụàjà ahụ e ji ọlaedo rụọ.” [Ọpụ. 39:38]) E ji ọlaedo machie elu ya na akụkụ ya, jirikwa ya kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya. Ebe ịchụàjà ahụ nwere akụkụ anọ hà nhata nke dị inch iri na asaa na ọkara, dịrịkwa ihe dị ka amaụkwụ atọ n’ịdị elu. O nwekwara “mpi” anọ si n’akụkụ elu ya anọ pụta. E ji ọlaedo kpụọ ihe abụọ yiri mgbaaka a ga-eji na-ejide okporo osisi akeshịa ndị a ga-eji na-ebu ya, jirikwa ọlaedo machie okporo osisi ndị ahụ. A kpụnyere ihe abụọ yiri mgbaaka n’okpuru ihe ahụ a kpụrụ n’ọnụ ya chere ibe ha ihu n’ebe nchụàjà ahụ. (Ọpụ. 30:1-5; 37:25-28) A na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ pụrụ iche n’elu ebe ịchụàjà ahụ ugboro abụọ n’ụbọchị, ụtụtụ na mgbede. (Ọpụ. 30:7-9, 34-38) E nwere amaokwu Baịbụl kwuru banyere ihe ịgụ ọkụ e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Ọ ga-abụkwa na e ji ya suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ebe ịchụàjà. (Lev. 16:12, 13; Hib. 9:4; Mkpu. 8:5; tụlee 2 Ihe 26:16, 19.) E debere ebe ịchụàjà ahụ a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụlọikwuu ahụ n’ihu ákwà ngebichi nke dị n’ebe Kasị Nsọ nke mere e ji ekwu na ọ dị “n’ihu igbe ihe àmà ahụ.”—Ọpụ. 30:1, 6; 40:5, 26, 27.
it-1 1195
Ihe Nsure Ọkụ ahụ Na-esi Ísì Ụtọ
E ji ihe ndị dị oké ọnụ ahịa ụmụ Izrel nyere n’onyinye mee ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ nke dị nsọ Jehova gwara ha suree n’ụlọikwuu dị n’ọzara. (Ọpụ. 25:1, 2, 6; 35:4, 5, 8, 27-29) Mgbe Jehova na-agwa Mozis otú ha ga-esi mee ya, ọ sịrị ya: “Were ihe dị iche iche na-esi ísì ụtọ: mmanụ stakti na ọnịka na-esi ísì ụtọ na galbanọm na-esi ísì ụtọ na frankinsens a na-agwaghị agwa. Ọ̀tụ̀tụ̀ ha niile ga-aha nhata. Ị ga-eji ha mee ihe nsure ọkụ, ihe na-esi ísì ụtọ, dị ka nke onye na-eme mmanụ otite mere, bụ́ nke e tinyere nnu, nke a na-agwaghị ihe ọzọ, nke bụ́ ihe dị nsọ. Ị ga-asụ ụfọdụ n’ime ya nke ọma ka ọ dị ka ntụ, ị ga-edebekwa ụfọdụ n’ime ya n’ihu Ihe Àmà ahụ nke dị n’ụlọikwuu nzute, bụ́ ebe m ga-apụta n’ihu gị. Ọ ga-abụ ihe kasị nsọ nye unu.” Jehova gwaziri ha ihe ga-eme ka ha mara otú ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ dịruru ná nsọ. Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla mere nke ọ bụla dị ka ya iji nụrụ ísì ya, a ga-ebipụ ya n’etiti ndị ya.”—Ọpụ. 30:34-38; 37:29.
it-1 82 ¶1
Ebe Ịchụàjà
Ebe Ịchụàjà Ndị Dị n’Ụlọikwuu. Mgbe a na-arụ ụlọikwuu ahụ, Jehova gwara ha ka ha rụnye ebe ịchụàjà abụọ na ya. E ji osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ (nke a na-akpọkwa “ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ” [Ọpụ. 39:39]). A rụrụ ya ka ọ dị ka igbe osisi nwere oghere, nke ọ ga-abụ na o nweghị ihe e ji kpuchie ya, ma n’elu ma n’ala. O nwere akụkụ anọ hà nhata nke dị ihe dị ka amaụkwụ asaa na ọkara, dịkwa ihe dị ka amaụkwụ anọ na ọkara n’ịdị elu. O nwekwara “mpi” ndị si n’akụkụ elu ya anọ pụta. E ji ọla kọpa machie ya. E jikwa ọla kọpa kpaa ihe a ga-etinye n’ime ebe ịchụàjà ahụ, “n’okpuru ọnụ ya, n’ebe etiti ya.” E tinyere ihe anọ yiri mgbaaka na nsọtụ anọ ya, n’akụkụ ihe ahụ e ji ọla kọpa kpaa. Ihe anọ ndị ahụ yiri mgbaaka dịkwa ka ndị nke ahụ a na-etinye osisi abụọ ahụ e ji ọla kọpa machie, bụ́ nke e ji ebu ebe ịchụàjà ahụ. Ọ ga-abụ na e nwere oghere e tinyere n’akụkụ abụọ nke ebe ịchụàjà ahụ nke na-eme ka e nwee ike itinye ihe a kpara akpa dị mbadamba n’ime oghere ahụ, ihe ahụ yiri mgbaaka na-apụtakwa n’akụkụ abụọ ahụ. Ndị ọkà mmụta na-ekwu ihe dị iche iche banyere ihe a. Ọtụtụ n’ime ha kwetara na ọ ga-abụrịịrị na a rụnyere ihe yiri mgbaaka asatọ na ya, a rụnyere anọ n’ihe ahụ a kpara akpa dị mbadamba, rụnye anọ ná mpụta ebe ịchụàjà ahụ. E ji ọla kọpa rụọ arịa niile nke ebe ịchụàjà ahụ, ite na shọvel e ji ekpo ntụ na ọkwá ebe ọbara anụmanụ ga na-agbanye, ndụdụ e ji agụpụta anụ, na ihe ịgụ ọkụ.—Ọpụ. 27:1-8; 38:1-7, 30; Ọnụ Ọgụ. 4:14.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 36
Akeshịa
Ngalaba osisi akeshịa na-agbasa agbasa, na-enwekwa ọtụtụ ogwu dị ogologo. Ngalaba otu osisi akeshịa na-agakarị tụhịa na ngalaba osisi akeshịa ndị ọzọ dị ya nso ma ghọzie nnukwu ọhịa. Ọ bụ ihe a mere na e kwuwe gbasara osisi akeshịa na Baịbụl, a na-akpọkarị ya shit·timʹ nke pụtara ihe karịrị otu osisi akeshịa. Osisi akeshịa nwere ike itoru ihe dị ka amaụkwụ iri abụọ na isii n’ogologo. Ma, ọ na-adịkarị ka ọhịa. Akwụkwọ ya na-adị nro, dịkwa ajị ajị. Ifuru ya na-acha odo odo, na-esikwa ísì ọma. Mkpụrụ ya na-arọ arọ. Osisi ya na-akwọ mụrụmụrụ, na-anyị arụ, ahụhụ anaghịkwa atụli ya. Azụ osisi ahụ na-eji oji, sie ike, ọ naghịkwa akwọ mụrụmụrụ. Ọ bụ ihe ndị a na otú osisi akeshịa a si ju ebe niile n’ọzara mere ka ọ bụrụ ya ka mma iji rụọ ụlọikwuu ahụ na ihe ndị dị n’ime ya. Ọ bụ ya ka e ji rụọ igbe ọgbụgba ndụ ahụ (Ọpụ. 25:10; 37:1), jirikwa ya rụọ tebụl e ji edowe achịcha a na-eche n’ihu Chineke (Ọpụ. 25:23; 37:10), ebe ịchụàjà dị iche iche (Ọpụ. 27:1; 37:25; 38:1), okporo osisi e ji ebu ha (Ọpụ. 25:13, 28; 27:6; 30:5; 37:4, 15, 28; 38:6), ogidi maka ákwà ngebichi ahụ (Ọpụ. 26:32, 37; 36:36), jirikwa ya rụọ awara osisi (Ọpụ. 26:15; 36:20), na osisi ntụhie (Ọpụ. 26:26; 36:31).