Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
DISEMBA 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 10-11
“Anyị Kwesịrị Ịhụ Jehova n’Anya Karịa Ndị Ezinụlọ Anyị”
it-1 1174
Ihe Iwu Na-akwadoghị
Ihe Nsure Ọkụ Na-esi Ísì Ụtọ nke Iwu Na-akwadoghị. Na Levitikọs 10:1, ọ bụ okwu Hibru bụ́ zar (za·rahʹ ma ọ bụrụ na a na-ekwu gbasara nwaanyị; n’ụzọ nkịtị ọ pụtara ihe ọhụrụ) ka e dere mgbe a na-ekwu banyere “ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke iwu na-akwadoghị . . . , bụ́ nke [Chineke] na-agwaghị ha suree.” Ma, ụmụ Erọn bụ́ Nedab na Abaịhu surere ya n’ihu Jehova, ya ezite ọkụ bịara repịa ha. (Lev. 10:2; Ọnụ Ọgụ. 3:4; 26:61) Ka e mechara, Jehova gwara Erọn, sị: “Aṅụla mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu, gị na ụmụ gị ndị gị na ha nọ, mgbe unu na-abata n’ụlọikwuu nzute, ka unu ghara ịnwụ. Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka, iji kpaa ókè n’agbata ihe dị nsọ na ihe rụrụ arụ nakwa n’agbata ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha, nakwa iji kụziere ụmụ Izrel ụkpụrụ niile Jehova si n’ọnụ Mozis nye ha.” (Lev. 10:8-11) Ihe a na-egosi na ọ ga-abụ na Nedab na Abaịhu ṅụrụ mmanya, ya egbuwe ha egbu nke mere ka obi kaa ha iji ọkụ suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ a na-agwaghị ha suree. Ọ ga-abụ na ihe mere ihe nsure ọkụ ahụ ha surere ji bụrụ nke iwu na-akwadoghị bụ oge e ji suree ya, ebe a nọ suree ya, ma ọ bụ otú e si suree ya. O nwedịrị ike ịbụ na e jighị ihe ndị e kwuru n’Ọpụpụ 30:34, 35 e kwesịrị iji mee ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mee ya. Mmanya nọ na-egbu ha emeghị ka ihe a ha mere ghara ịbụ ihe ọjọọ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 111 ¶5
Ụmụ Anụmanụ
Anụ ndị a e kwuru n’Iwu Mozis ka a ghara iri gbasara naanị ndị nọ n’okpuru Iwu Mozis. Levitikọs 11:8 kwuru, sị: “Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu,” ya bụ, ụmụ Izrel. Àjà Jizọs Kraịst ji ndụ ya chụọ mere ka iwu ghara iji Ndị Kraịst iri ụdị anụ ọ bụla. N’ihi ya, o mere ka o doo anya na mmadụ niile nweziri ike iri anụ ọ bụla otú ahụ Jehova gwara Noa mgbe Iju Mmiri ahụ gachara.—Kọl. 2:13-17; Jen. 9:3, 4.
DISEMBA 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 12-13
“Mụta Ihe n’Iwu E Nyere Ụmụ Izrel Gbasara Ekpenta”
it-2 238 ¶3
Ekpenta
Ekpenta dị n’uwe na n’ụlọ. Ekpenta nwere ike ime uwe e ji ajị anụ kpaa ma ọ bụ uwe ákwà linin ma ọ bụkwanụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee. E nwere ike iji mmiri sapụ ekpenta ahụ, e nwekwara ndokwa ndị e mere iwepụ arịa ndị nwere ekpenta iche. Ma, ọ bụrụ na ekpenta ahụ nke na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ ọbara ọbara adịgide, ọ pụtara na ọ bụ ajọ ekpenta. E kwesịkwara ịkpọ arịa ndị ahụ nwere ekpenta ọkụ. (Lev. 13:47-59) Ọ bụrụ na ihe ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ ọbara ọbara nke dakpuru ime apụta n’ahụ́ ụlọ, onye nchụàjà ga-emechi ụlọ ahụ ka a ghara ịba n’ime ya. O nwere ike ịdị mkpa na ha ga-akụpụta nkume ndị ọrịa ahụ dị na ha, kpụchasịakwa ime ụlọ ahụ gburugburu ma kporo nkume ndị ahụ a kụpụtara na ájá ụrọ ha kpụchapụtara kpoga ha n’ebe a na-ekpofu ihe ruru unyi n’azụ obodo. Ọ bụrụ na ekpenta ahụ abịaghachi, ọ pụtara na ụlọ ahụ adịghị ọcha. A ga-akwatu ya, kpofuo ihe niile e ji rụọ ya n’ebe a na-ekpofu unyi. Ma, ọ bụrụ ụlọ onye nchụàjà kwuru na ọ dị ọcha, e nwere ndokwa e mere iji sachapụ ụlọ ahụ mmehie. (Lev. 14:33-57) Ụfọdụ ndị na-ekwu na ekpenta ahụ na-apụta n’uwe ma ọ bụ n’ụlọ bụ ihe a na-akpọ ebù. Ma, e jighị ihe a ha na-ekwu n’aka.
DISEMBA 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 14-15
“Anyị Kwesịrị Ịna-adị Ọcha Iji Na-efe Jehova Ofufe Dị Ọcha”
it-1 263
Ịsa Ahụ́
E nwere ọtụtụ ihe mere e ji nye ụmụ Izrel iwu ka ha na-asa ahụ́ ha. Onye ọ bụla si n’ekpenta gbakee, onye ọ bụla metụrụ aka n’ihe onye “ihe na-agbapụta n’ahụ́” metụrụ aka, nwoke nke ọbara ọcha si n’ahụ́ nwoke ya pụta, nwaanyị hụchara nsọ ya ma ọ bụ nke ọbara gbachara, na onye ọ bụla nwere mmekọahụ ga-abụ onye “na-adịghị ọcha,” n’ihi ya, ha ga-asa ahụ́ ha. (Lev. 14:8, 9; 15:4-27) Onye nọ n’ụlọ ozu mmadụ dị ma ọ bụ metụ ozu ahụ aka ga-abụ onye “na-adịghị ọcha.” N’ihi ya, a ga-eji mmiri e ji eme ka mmadụ dị ọcha mee ka onye ahụ dị ọcha. Onye na-achọghị ime ihe ndị a, ‘a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ọgbakọ, n’ihi na ọ bụ ebe nsọ Jehova ka o merụrụ.’ (Ọnụ Ọgụ. 19:20) Ọ bụ ya mere o ji kwesị ekwesị na e ji ịsa ihe mmiri ma ọ bụ mmadụ ịsa ahụ́ ya mee ka ọ dị ọcha eme ihe atụ nke onye dị ọcha n’anya Jehova. (Ọma 26:6; 73:13; Aịza. 1:16; Ezik. 16:9) E ji eziokwu dị n’okwu Jehova tụnyere mmiri. Iji ya saa ahụ́ na-eme ka mmadụ dị ọcha.—Efe. 5:26.
it-2 372 ¶2
Nsọ Nwaanyị
N’Izrel oge ochie, a na-ewere nwaanyị ọbara gbara n’ahụ́ n’oge na-abụghị oge ịhụ nsọ ya ma ọ bụ nke ‘ọbara gbara gafee oge adịghị ọcha nke ịhụ nsọ ya’ ka onye na-adịghị ọcha. Ihe ọ bụla o ji dinara ala ma ọ bụ nọdụ ọdụ ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ihe ndị ahụ aka ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha. Ma, ọ bụrụ na ọbara ahụ nke na-agba ya n’ahụ́ n’oge na-abụghị oge ịhụ nsọ ya kwụsị, abalị asaa agaa, ọ ga-abụ onye dị ọcha. N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewetara onye nchụàjà nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ. Onye nchụàjà ahụ ga-ekpuchiri ya mmehie ya, ọ ga-achụrụ Jehova otu n’ime anụmanụ ahụ n’àjà dị ka àjà mmehie, chụọ nke ọzọ dị ka àjà nsure ọkụ.—Lev. 15:19-30.
it-1 1133
Ebe Nsọ
2. Ụlọikwuu nzute na ụlọ nsọ ahụ e mechara nwee. Ihe niile a rụrụ n’ụlọikwuu ahụ na n’ụlọ nsọ ahụ bụ ebe nsọ, tinyere ogige ụlọikwuu na n’ogige ụlọ nsọ ahụ. (Ọpụ. 38:24; 2 Ihe 29:5; Ọrụ 21:28) Ihe ndị bụ́ isi dị n’ogige ụlọikwuu ma ọ bụ n’ogige ụlọ nsọ ahụ bụ efere ọla kọpa na ebe ịchụàjà. Ihe ndị a dị nsọ. Ọ bụ naanị ndị dị ọcha nwere ike ịba n’ogige ụlọikwuu ahụ mgbe ọ bụla. O nweghịkwa onye na-adịghị ọcha ga-abanye n’ogige ụlọ nsọ ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwaanyị adịghị ọcha, ọ gaghị emetụ ihe ọ bụla dị nsọ aka ma ọ bụ bata n’ebe dị nsọ. (Lev. 12:2-4) Ọ ga-abụdị na a na-ewere ya na onye Izrel nọgidere n’adịghị ọcha na-emerụ ụlọikwuu. (Lev. 15:31) Ndị chọrọ ka e mee ka ha dị ọcha n’ekpenta ha, na-eweta ihe ndị e ji achụrụ ha àjà n’ọnụ ụzọ ogige ụlọikwuu ma ọ bụ nke ụlọ nsọ. Ha agaghị agafe ebe ahụ. (Lev. 14:11) O nweghịkwa onye ọ bụla na-adịghị ọcha nke ga-eso eri anụ e ji chụọ àjà udo n’ụlọikwuu ma ọ bụ n’ụlọ nsọ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-anwụ.—Lev. 7:20, 21.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 665 ¶5
Ntị
Mgbe a na-ahọpụta ndị nchụàjà n’Izrel, a gwara Mozis ka o were ọbara ebule e ji ahọpụta mmadụ tee n’ọnụ ọnụ ntị aka nri Erọn nakwa ná mkpịsị aka nke aka nri ya nakwa ná mkpịsị ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya. A gwakwara ya mee ụmụ Erọn otú ahụ. Ihe a na-egosi na otú ha si erube isi, otú ha si ejere Jehova ozi na otú ha si ebi ndụ kwesịrị ịbụ otú Chineke si chọọ. (Lev. 8:22-24) Iwu Mozis kwukwara gbasara onye ekpenta e mere ka ọ dị ọcha. O kwuru na onye nchụàjà ga-eweretụ ọbara anụ ebule e ji chụọ àjà ikpe ọmụma na mmanụ e ji chụọ àjà tee ya n’ọnụ ọnụ ntị aka nri nke onye ekpenta ahụ. (Lev. 14:14, 17, 25, 28) A na-emekwa ihe yiri ihe a n’ihe gbasara ohu nke chọrọ ịnọgide na-agbara nna ya ukwu ohu ruo mgbe a na-akaghị aka. A na-akpọrọ ohu ahụ bịa n’ọnụ ụzọ, nna ya ukwu ejiri ahà hapuo ya ntị. Ọ ga-abụ na ntị a a na-ahapu ohu a na-egosi na ọ chọrọ ịnọgide na-ejere nna ya ukwu ozi ma na-erubere ya isi.—Ọpụ. 21:5, 6.