Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2023 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
JENỤWARỊ 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 32-33
Na-akasi Ndị Na-echegbu Onwe Ha Obi
it-1 710
Elaịhu
Elaịhu eleghị onye ọ bụla anya n’ihu, e nweghịkwa onye o toro otuto elu ọnụ. Ọ ghọtara na ọ bụ ájá ka e ji kpụọ ma yanwa ma Job, ghọtakwa na ọ bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile kere ya. Elaịhu achọghị imenye Job egwu, kama ọ gwara ya okwu ka ezigbo enyi. Ọ kpọrọ Job aha ya, bụ́kwanụ ihe Elifaz, Bildad, ma ọ bụ Zofa na-emeghị.—Job 32:21, 22; 33:1, 6.
Ị̀ Na-ewere Ndị Na-adịghị Ike Otú Jehova Si Were Ha?
8 Anyị ga na-emetekwuru ụmụnna anyị ebere ma ọ bụrụ na anyị echeta na ọ bụ nsogbu ụwa mere ka ụfọdụ n’ime ha ghara ịdị ike. E nwere ndị na-arịa ọrịa, nwee ndị naanị ha bụ Ndịàmà Jehova n’ezinụlọ ha, nweekwa ndị nsogbu ndị ọzọ mere ka obi ghara izu ha ike. Ụdị nsogbu ahụ nwere ike ịbịara anyị otu ụbọchị. Mgbe ndị Izrel nọ n’Ijipt, ha bụ ndị ogbenye na ndị na-adịghị ike. Tupu ha abanye n’Ala Nkwa, Jehova gwara ha “akpọchila obi” ma ha hụ ụmụnne ha nọ ná nsogbu. Jehova chọrọ ka ha nyere ndị ogbenye na ndị na-adịghị ike aka.—Diut. 15:7, 11; Lev. 25:35-38.
9 Anyị hụ ụmụnna nsogbu bịaara, anyị kwesịrị iji Akwụkwọ Nsọ na-akasi ha obi kama ịkatọwa ha ma ọ bụ mawa ha ikpe. (Job 33:6, 7; Mat. 7:1) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ merụrụ ezigbo ahụ́ n’ihe mberede okporo ụzọ, e buga ya ụlọ ọgwụ, ndị dọkịta hà ga-asị ka e bu ụzọ chọpụta ma ọ̀ bụ ya kpatara ihe mberede ahụ? Mbanụ. Ha ga-enyewe ya ọgwụ ozugbo. Otú ahụ ka anyị kwesịrị ime. Ọ bụrụ na anyị ahụ nwanna ike gwụrụ n’ihi nsogbu bịaara ya, ihe anyị kwesịrị ime ozugbo bụ iji Okwu Chineke nyere ya aka.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:14.
10 Anyị nwere ike ịhụ nwanna, chee na ọ dịghị ike. Ma, ọ bụrụ na anyị echebara otú ihe si dịrị ya echiche, anyị nwere ike ịghọta na ọ dị ike. Chegodị banyere ụmụnna nwaanyị na-edi nsogbu ndị ezinụlọ ha na-enye ha kemgbe ọtụtụ afọ. I lee ụfọdụ n’ime ha anya, i nwere ike iche na o nweghị ihe ha ga-emeli. Ma, ihe ndị ha na-eme gosiri na okwukwe ha siri ezigbo ike. Ọ bụrụ na ị hụ nwanna nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ ya ka ya na ụmụ ya na-abịa ọmụmụ ihe mgbe niile, ọ̀ bụ na okwukwe ya na otú o si jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe anaghị eme gị obi ụtọ? E nwekwara ndị na-eto eto nọsiri ike n’ọgbakọ n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-abịara ha n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụ na anyị echebara ihe ụmụnna ndị a na-eme echiche, anyị ga-aghọta na ha “bara ọgaranya n’okwukwe” n’agbanyeghị na o yiri ka ha adịghị ike.—Jems 2:5.
Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ikwu Okwu?
17 Onye nke anọ bịara ileta Job bụ Elaịhu, bụ́ onye ikwu Ebreham. O gere ntị mgbe Job na ụmụ nwoke atọ ndị nke ọzọ nọ na-ekwu okwu. O doro anya na o gere ntị nke ọma n’ihe ha kwuru n’ihi na o ji olu ọma gwa Job ihe ndị nyeere ya aka ịgbanwe echiche ya. (Job 33:1, 6, 17) Ihe kacha Elaịhu mkpa bụ ime ka e too Jehova, ọ bụghị yanwa ma ọ bụkwanụ mmadụ ọzọ. (Job 32:21, 22; 37:23, 24) Ihe Elaịhu mere na-akụziri anyị na e nwere oge ịgbachi nkịtị ma gee ntị. (Jems 1:19) Anyị mụtakwara na anyị nyewe mmadụ ndụmọdụ, ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa bụ ka e too Jehova, ọ bụghị anyịnwa.
18 Otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ikwu okwu Chineke nyere anyị bụ ime ihe Baịbụl kwuru gbasara ịma mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu na otú anyị ga-esi ekwu ya. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.” (Ilu 25:11) Anyị gee ntị nke ọma n’ihe ndị ọzọ na-ekwu ma chee echiche tupu anyị ekwuo okwu, okwu anyị ga-adị ka apụl ọlaedo ndị ahụ. Ọ ga-aba uru, maakwa mma. Ma ànyị kwuru nnukwu okwu ma ọ bụ obere okwu, ọ ga-agba ndị ọzọ ume, meekwa ka obi dị Jehova mma. (Ilu 23:15; Efe. 4:29) O nweghị ụzọ ka mma anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye a Chineke nyere anyị.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Na-abịaru Jehova Nso
10 Ọ bụghịkwa ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ ka anyị dị mma n’anya. Ma anyị ekwesịghị ịna-esi ọnwụ ka a ghara ịhụ ihe ọ bụla ga-egosi na anyị akawala. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka anyị nwee ùgwù, mee ka a mata na anyị etoola nakwa na anyị ma ihe. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Isi awọ́ bụ okpueze mara mma mgbe e nwere ya n’ụzọ ezi omume.” (Ilu 16:31) Ọ bụ otú Jehova si ele anyị anya. Anyị kwesịkwara ịna-ele onwe anyị anya otú ahụ. (Gụọ 1 Pita 3:3, 4.) N’ihi ya, ànyị kwesịrị ikwe ka a waa anyị ahụ́ ma ọ bụ nye anyị ọgwụ nwere ike ịkpatara anyị nsogbu naanị n’ihi ịchọ mma? Ọ bụ “ọṅụ Jehova” ga-eme ka anyị maa mma na-abụghị nke elu ahụ́, n’agbanyeghị afọ ole anyị dị ma ọ bụ otú ahụ́ anyị dị. (Nehe. 8:10) Ọ bụ naanị n’ụwa ọhụrụ ka anyị na-agaghị arịa ọrịa, anyị amaakwa mma okorobịa na agbọghọbịa. (Job 33:25; Aịza. 33:24) Ugbu a ọ na-abịabeghị, ezigbo amamihe na okwukwe ga-enyere anyị aka ịnọ Jehova nso ma na-eme otú ike kwere anyị.—1 Tim. 4:8.
JENỤWARỊ 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 34-35
Mgbe O Yiri Ka Ọ̀ Bụ Ndị Aka Ha Dị Ọcha Ka Ihe Ọjọọ Na-emekarị
Olee Ụdị Onye Chineke Bụ?
Chineke na-eme ihe ziri ezi mgbe niile. N’eziokwu, Baịbụl sịrị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.” (Job 34:10) Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Otu ọbụ abụ kwuru banyere Jehova, sị: “Ị ga-ekpe ndị dị iche iche ikpe ziri ezi.” (Abụ Ọma 67:4) Ebe ọ bụ na “Jehova na-ahụ ihe dị n’obi,” mmadụ agaghị ejili omume ihu abụọ megharịa ya anya. Kama, ọ ma nke bụ́ eziokwu mgbe niile ma na-ekpe ikpe ziri ezi. (1 Samuel 16:7) Ihe ọzọkwa bụ na Chineke na-ahụ ihe ọ bụla bụ́ ihe ọjọọ na ikpe na-ezighị ezi dị n’ụwa. O kwekwara nkwa na n’oge na-adịghị anya, “a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa.”—Ilu 2:22.
Olee Ihe Na-agaghịzi Adị Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?
5 Gịnị ka Jehova ga-eme? Jehova hapụrụ ndị ọjọọ ugbu a ka ọ mara ma hà ga-agbanwe. (Aịza. 55:7) Ọ bụ eziokwu na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya, e kpebeghị ndị ọjọọ ikpe ikpeazụ. Ọ bụ ụwa ochie a ka a mara ikpe ọnwụ. Ma, gịnị ga-eme ndị jụrụ ịgbanwe, bụ́ ndị na-akwado ihe ọjọọ ruo mgbe oké mkpagbu ahụ ga-abịa? Jehova kwere nkwa na ọ ga-ebibi ndị ọjọọ niile n’ụwa. (Gụọ Abụ Ọma 37:10.) Ndị ọjọọ nwere ike iche na ha ga-agbanahụ ikpe ahụ. Ọtụtụ ndị amụtala izochi ihe ọjọọ ha mere. Ọtụtụ mgbe, a naghịkwa ata ha ahụhụ maka ihe ha metara. (Job 21:7, 9) Ma, Baịbụl gwara anyị, sị: ‘Anya Chineke na-ahụ ụzọ mmadụ, ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile. Ọchịchịrị ma ọ bụ oké itiri ọ bụla adịghị, bụ́ ebe ndị na-eme ihe ọjọọ ga-ezo.’ (Job 34:21, 22) O nweghị ebe mmadụ ga-ezo ka Jehova Chineke ghara ịhụ ya. O nweghị onye ga-aghọgbuli Chineke. Ọ na-ahụ ihe niile ndị ọjọọ na-eme. A lụchaa agha Amagedọn, anyị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ, ma anyị agaghị ahụ ha. Ha agaghịzi adị ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 37:12-15.
Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?
19 Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. Ọtụtụ ndị anaghị ege anyị ntị n’ihi na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha na-atụ anya ka anyị soro na-eme ntụliaka ọchịchị. Mana, o doro anyị anya na ọ bụrụ na anyị ahọrọ ka mmadụ ibe anyị chịwa anyị, ọ pụtara na anyị na-ajụ Chineke. (1 Sam. 8:4-7) Ụfọdụ ndị nwekwara ike na-eche na anyị kwesịrị ịrụ ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọgwụ, na-emekwa ihe ndị ọzọ iji nyere obodo aka. Ha anaghị ege anyị ntị n’ihi na ihe bụ́ mkpa anyị bụ ikwusa ozi ọma, ọ bụghị igboro ụwa mkpa ha ozugbo.
20 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? (Gụọ Matiu 7:21-23.) Ihe bụ́ isi anyị kwesịrị ilekwasị anya bụ ọrụ ahụ Jizọs Kraịst nyere anyị iwu ka anyị rụọ. (Mat. 28:19, 20) Anyị ekwesịghị ikwe ka ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ịchọ ka e nyere ndị mmadụ aka dọpụ uche anyị na ya. Anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, chọọkwa ka e nyere ha aka. Ma, anyị ma na ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi nyere ndị agbata obi anyị aka bụ ịkụziri ha gbasara Alaeze Chineke nakwa inyere ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Na-ewepụta Onwe Gị Ijere Jehova Ozi Ka E Too Ya
3 Jehova abaraghị Elaịhu mba n’ihi na ọ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ n’ezie na ị bụ onye ziri ezi, gịnị ka ị na-enye ya, ọ̀ bụkwa gịnị ka ọ na-enweta n’aka gị?” (Job 35:7) Ihe a Elaịhu kwuru ọ̀ pụtara na mbọ anyị na-agba n’ozi Chineke abaghị uru ọ bụla? Mbanụ. Ihe o kwuru pụtara na ma anyị efeghị Jehova, o nweghị ihe ọ ga-ewepụ ya n’ahụ́. Jehova nwezuru ihe niile. Anyị agaghị emeli ka ọ bakwuo ọgaranya, ma ọ bụ sikwuo ike. Kama, ọ bụ ya nyere anyị nkà na ike ọ bụla anyị nwere, meekwa ka anyị na-akpa àgwà ọma. Ọ na-ahụkwa ihe anyị na-eji ya eme.
JENỤWARỊ 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 36-37
Ihe Mere Ị Ga-eji Tụkwasị Nkwa Chineke Kwere na Anyị Ga-adị Ndụ Ebighị Ebi Obi
Ànyị Ga-amatali Chineke?
AFỌ OLE CHINEKE DỊ: Baịbụl kwuru na Chineke dị “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 90:2) Ihe ọ pụtara bụ na Chineke enweghị mmalite, ọ gaghịkwa enwe ọgwụgwụ. Mmadụ chọọ ikwu ya, o nwere ike ịsị na “a pụghịkwa ịchọpụta afọ ndụ [Chineke].”—Job 36:26.
Uru ọ ga-abara gị: Chineke kwere nkwa na ị ga-adị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na ị mata ya nke ọma. (Jọn 17:3) Chineke ọ̀ ga-emeli ihe a o kwuru ma ọ bụrụ na yanwa anaghị adị ndụ ebighị ebi? Ọ bụ naanị “Eze mgbe ebighị ebi” ga-emezuli nkwa a.—1 Timoti 1:17.
Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Ndị Chineke Nyere Gị?
6 Ihe mere mmiri dị n’ụwa akpụkọghị akpụkọ bụ na ụwa adịghị oké anya n’ebe anyanwụ dị. A sị na ụwa nọ anyanwụ nso karịa otú ọ dị ugbu a, mmiri niile dị na ya ga-ata, ụwa adị ọkụ, kpọọ nkụ, o nweghịkwa ihe ọ bụla ga-adịli ndụ na ya. Ọ bụrụkwanụ na ụwa nọtụ anyanwụ n’ebe dị anya, ihe niile dị n’ụwa ga-ajụ oyi ma kpụkọọ. Ma, ebe ọ bụ na Jehova dowere ụwa ebe o kwesịrị ịnọ, otú ụwa si emepụta mmiri mere ka e nwee ihe ndị dị ndụ. Anyanwụ na-amịkọrọ mmiri dị ma n’osimiri ma n’elu ala laa n’elu, ya aghọọ urukpuru. Kwa afọ, mmiri anyanwụ na-amịkọrọ karịrị mmiri niile dị n’ọdọ mmiri niile dị n’ụwa. Mmiri ahụ na-anọ ihe dị ka abalị iri na mbara ígwé tupu ya ezoo ka mmiri ma ọ bụkwanụ daa ka snoo. Mmiri ahụ na-emecha sọba n’osimiri ma ọ bụkwanụ n’iyi, anyanwụ amịkọrọkwa ya ọzọ. Jehova mere ya ka ọ dịrị otú a ka mmiri ghara ịkọ n’ụwa. Ihe a gosiri na Jehova nwere amamihe, dịrịkwa ike.—Job 36:27, 28; Ekli. 1:7.
Mee Ka Olileanya Gị Na-esikwu Ike
16 Olileanya ndụ ebighị ebi anyị nwere bụ onyinye bara ezigbo uru Chineke nyere anyị. Anyị na-atụ anya ihe ndị magburu onwe ha ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu. Obi sikwara anyị ike na ha ga-eme. Olileanya a dị ka nko e ji ejide ụgbọ mmiri. Ọ na-eme ka anyị kwụrụ chịm ka anyị nwee ike ịtachi obi n’ọnwụnwa, imeri ndị mmegide, na inwe obi ike ma anyị nọrọgodị n’ọnụ ọnwụ. Ọ dịkwa ka okpu agha n’ihi na ọ na-echebe anyị ka anyị ghara ichewe ihe na-ezighị ezi ka anyị nwee ike ịjụ ihe ọjọọ ma na-eme ihe dị mma. Olileanya anyị si na Baịbụl na-eme ka anyị na Chineke na-adịkwu ná mma, na-emekwa ka anyị mata otú ọ hụruru anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka olileanya anyị na-esikwu ike, ọ ga-abara anyị ezigbo uru.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Anyị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi
4 Ọ̀ na-esiri gị ike ịghọta otú Jehova si dịrị “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi”? (Ihe e dere n’ala ala peeji Aịza. 40:28.) Ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Elaịhu kwuru gbasara Chineke, sị: “E nweghị ike ịghọta afọ ndụ ya.” (Job 36:26) Ma, ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe, ọ pụtaghị na ihe ahụ abụghị eziokwu. Dị ka ihe atụ, e nwere ike anyị aghọtachaghị otú ìhè si adị. Ma, ọ̀ pụtara na ìhè adịghị? Mbanụ. E nwekwara ike anyị bụ́ ụmụ mmadụ agaghị aghọtacha otú o si bụrụ na Jehova dị kemgbe nakwa na ọ gaghị akwụsị ịdị. Ma, ọ pụtaghị na Chineke anaghị adịru ebighị ebi. Ihe e ji amata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke abụghị ma ànyị ghọtara ya ma ọ bụ na anyị aghọtaghị ya. (Rom 11:33-36) Ihe ọzọ bụ na ọ dịrịla tupu ihe ọ bụla adịrị, ma anyanwụ ma kpakpando. Jehova mere ka obi sie anyị ike na “ọ bụ [ya] ji ike ya kee ụwa,” nakwa na ọ dịrịla tupu ‘ya agbasaa eluigwe.’ (Jere. 51:15; Ọrụ 17:24) Oleekwa ihe ọzọ mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị ga-adịli ndụ ebighị ebi?
JENỤWARỊ 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 38-39
Ị̀ Na-ewepụta Oge Ekiri Ihe Ndị E Kere Eke?
Ị̀ Dị Njikere Ichere Jehova?
7 Mgbe Baịbụl na-ekwu otú Jehova si kee ụwa, o kwuru gbasara ikpebi “otú ọ ga-aha,” igwunye “ntọala ya,” nakwa ịdọnye “nkume ji ya.” (Job 38:5, 6) Jehova wepụtadịrị oge leruo ihe ndị o kere eke anya. (Jen. 1:10, 12) Ì nwere ike iche otú obi dị ndị mmụọ ozi mgbe ha hụrụ ihe ọhụrụ ọ bụla Jehova kere? Ọ ga-abụrịrị na obi tọgburu ha atọgbu. O nwere mgbe o ruru, ha amalite “iti mkpu otuto.” (Job 38:7) Gịnị ka anyị na-amụta? O were Jehova ọtụtụ puku afọ tupu ya arụchaa ọrụ ya. Ma, mgbe Jehova lechara ihe niile o ji nlezianya kee, ọ sịrị na “ha dị nnọọ mma.”—Jen. 1:31.
Mbilite n’Ọnwụ Na-egosi Ịhụnanya Jehova, Amamihe Ya, na Ndidi Ya
2 Jehova bu ụzọ kee Ọkpara ya bụ́ Jizọs. O sizi n’aka Ọkpara ya “kee ihe ndị ọzọ niile” ma ọtụtụ ndị mmụọ ozi. (Kọl. 1:16) Obi dị Jizọs ezigbo ụtọ na ya na Nna ya rụkọrọ ọrụ. (Ilu 8:30) Obi dịkwa ndị mmụọ ozi ụtọ. Ha hụrụ mgbe Jehova na Jizọs kere eluigwe na ụwa. Gịnị ka ndị mmụọ ozi ahụ mere? Ha malitere “iti mkpu otuto” mgbe e kere ụwa. O dokwara anya na ha tikwara mkpu otuto mgbe e kere ihe ndị ọzọ, karịchaa ụmụ mmadụ. (Job 38:7; Ilu 8:31) Ihe niile Jehova kere gosiri amamihe ya na otú o si hụ anyị n’anya.—Ọma 104:24; Rom 1:20.
Si n’Ihe Ndị Jehova Kere Mụtakwuo Gbasara Ya
8 Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Jehova nyeere Job aka ịtụkwasịkwu ya obi. (Job 32:2; 40:6-8) Mgbe ya na Job na-akparịta ụka, o kwuru gbasara ọtụtụ ihe ndị o kere eke, ma kpakpando, urukpuru, na àmụ̀mà. O kwukwara gbasara ụmụ anụmanụ ndị dị ka atụ́ na ịnyịnya. (Job 38:32-35; 39:9, 19, 20) Ihe ndị a niile gosiri na ike Chineke enweghị atụ, gosikwa na o nwere amamihe, hụkwa anyị n’anya. Ụka a Job na Jehova kparịtara mere ka Job tụkwasịkwuo Jehova obi. (Job 42:1-6) Ọ bụrụkwa na anyị ana-amụ gbasara ihe ndị Chineke kere, ọ ga-echetara anyị na Jehova ka anyị mara ihe, karakwa anyị ike. O nwere ikike ịkwụsị nsogbu niile anyị nwere. Ọ ga-akwụsịkwa ha. Ịmata ihe a ga-eme ka anyị na-atụkwasịkwu ya obi.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 222
Onye Na-enye Anyị Iwu
Jehova Bụ Onye Na-enye Anyị Iwu. N’eziokwu, ọ bụ naanị Jehova ruru eru ịbụ Onye Na-enye Iwu ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ọ bụ ya mere iwu ndị na-achị ihe ndị na-anaghị eku ume o kere eke (Job 38:4-38; Ọma 104:5-19), nakwa ndị nke na-achị ụmụ anụmanụ. (Job 39:1-30) Ebe ọ bụ Jehova kere ụmụ mmadụ, ha sokwa ná ndị iwu ndị ahụ na-achị. Ebe ọ bụkwa na o kere ụmụ mmadụ ka ha nwee ike ime ihe ziri ezi, nwee ọgụgụ isi, nakwa ka ọ na-agụ ha agụụ ife ya, ha kwesịkwara ịna-erube isi n’iwu ndị Chineke nyere banyere ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. (Rom 12:1;1 Kọr. 2:14-16) Ndị mmụọ ozi na-erubekwara iwu Jehova isi.—Ọma 103:20; 2 Pita 2:4, 11.
E nweghị onye nwere ike imebisị iwu ndị Jehova mere ka ha na-achị ihe ndị o kere. (Jere. 33:20, 21) N’eluigwe na n’ụwa, iwu ya na-eme ka ihe niile na-aga nnọọ otú o kwesịrị. N’ebe ndị sayensị ghọtarala otú iwu ndị ahụ si arụ ọrụ, ha na-eji ha amata kpọmkwem ebe ọnwa, planet, na ihe ndị ọzọ dị na mbara igwe nọ n’oge ọ bụla. Onye ọ bụla mebiri iwu ndị a na-ata ahụhụ ya ozugbo. Otú ahụ ka ọ dịkwa iwu ndị Chineke nyere banyere ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Onye ọ bụla mebiri iwu ndị ahụ ga-atarịrị ahụhụ ha, ọ bụ eziokwu na e nwere ike ọ gaghị abụ ozugbo. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke abụghị onye a ga-aghọgbuli. N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ.”—Gal. 6:7; 1 Tim. 5:24.
JENỤWARỊ 29–FEBỤWARỊ 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 40-42
Ihe Anyị Na-amụta n’Ihe Mere Job
“Ònye Maara Uche Jehova?”
4 Ka anyị na-echebara ihe dị iche iche Jehova mere echiche, anyị ekwesịghị ịtụ anya ka Jehova na-eme ihe ka ụmụ mmadụ. Baịbụl kwuru banyere ụdị echiche a n’Abụ Ọma 50:21, sị: “I chere na m ga-adị ka gị.” Nke a yiri ihe otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru n’ihe karịrị otu narị afọ na iri asaa na ise gara aga. Ọ sịrị: “Ụmụ mmadụ na-achọ ka Chineke na-eme ka ha. Ha chekwara na o kwesịrị ịna-edebe iwu ndị ha na-edebe.”
5 Anyị kwesịrị ilezi anya ka anyị ghara ịtụ anya ka Jehova na-ele ihe anya otú mmadụ si ele ya. Olee ihe mere anyị ji kwesị ime nke a? Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ka anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, anyị nwere ike ịna-eche na ihe ụfọdụ Jehova mere ezichaghị ezi. N’oge ochie, ụmụ Izrel nwere ụdị echiche a, nke mere ka ha katọọ otú Jehova si emeso ha ihe. Jehova gwara ha, sị: “Unu ga-asịkwa: ‘Ụzọ Jehova ezighị ezi.’ Biko, nụrụ, gị ụlọ Izrel. Ọ̀ bụ na ụzọ m ezighị ezi? Ọ́ bụghị ụzọ unu bụ nke na-ezighị ezi?”—Ezik. 18:25.
6 Otu n’ime ihe ga-eme ka anyị ghara ịtụ anya ka Jehova na-eme ihe ka anyị bụ ịghọta na anyị amachaghị ihe niile nakwa na mgbe ụfọdụ, echiche anyị anaghị ezi ezi. Job kwesịrị ịghọta nke a. Oge ọ na-ata ahụhụ, o nwere mwute dị ukwuu nke mere ka o chewe naanị banyere onwe ya. Ọ ghọtaghị ihe mere o ji na-ata ahụhụ. Ma, Jehova gosiri ya na ya hụrụ ya n’anya site n’inyere ya aka ya agbanwee echiche ya. Jehova jụrụ Job ihe karịrị ajụjụ iri asaa, bụ́ ndị ọ na-azalighị. O si otú a gosi Job na o nwere ihe ndị ọ na-amaghị. Nke a mere ka Job weda onwe ya ala wee gbanwee echiche ya.—Gụọ Job 42:1-6.
Lekwasị Anya n’Ihe Dị Ezigbo Mkpa
12 Mgbe Job dichara nsogbu ya niile, otú Jehova si gwa ya okwu ò gosiri na Jehova enweghị obi ebere? Mbanụ. Job echeghịkwa otú ahụ. N’agbanyeghị ahụhụ ahụ niile, Job mechara kwuo ihe gosiri na ihe Chineke gwara ya dị ya mma. O kwudịrị, sị: “Ekwukwaghị m ihe m kwuru, echegharịwo m n’ájá na ntụ.” Ọ bụ uru ndụmọdụ a kapịrị ọnụ Jehova ji obiọma nye ya baara ya. (Job 42:1-6) Nwa okorobịa aha ya bụ Elaịhu ebula ụzọ nye Job ndụmọdụ iji gbazie ya olu. (Job 32:5-10) Mgbe Job nabatachara ndụmọdụ Chineke nyere ya ma gbanwee otú o si eche echiche, Jehova mere ka ndị ọzọ mata na obi dị ya ụtọ maka otú Job si rubere ya isi n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara ya.—Job 42:7, 8.
“Nwee Olileanya n’Ebe Jehova Nọ”
17 E wepụ Job, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-akwụsịghị inwe obi ike mgbe ọnwụnwa tara akpụ bịaara ha. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, o kwuru gbasara ọtụtụ ndị, kpọọ ha “oké ìgwè ndị àmà.” (Hib. 12:1) Ọnwụnwa ndị tara akpụ bịaara ha niile, ma ha rubeere Jehova isi ná ndụ ha niile. (Hib. 11:36-40) Ntachi obi ha na ọrụ ha rụsiri ike ọ̀ lara n’iyi? Mbanụ. N’agbanyeghị na Chineke emezughị nkwa ya niile n’oge ha dị ndụ, ha akwụsịghị inwe olileanya n’ebe Jehova nọ. Ha kwetasiri ike na ha ga-ahụ mgbe a ga-emezu nkwa ndị ahụ n’ihi na obi siri ha ike na ha na Jehova dị ná mma. (Hib. 11:4, 5) Akụkọ ha ga-eme ka anyị kpebisie ike ịna-enwe olileanya n’ebe Jehova nọ.
18 Ụwa anyị bi n’ime ya na-akakwu njọ. (2 Tim. 3:13) Ekwensu akwụsịbeghị ịnwa ndị Chineke. N’agbanyeghị nsogbu ndị ga-abịa n’ọdịnihu, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-arụsi ọrụ ike n’ofufe Jehova, obi esie anyị ike na “anyị tụkwasịrị Chineke dị ndụ obi.” (1 Tim. 4:10) Cheta na ihe Jehova mechara meere Job gosiri na “ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova n’obi, nakwa na ọ na-eme ebere.” (Jems 5:11) Ka anyịnwa na-erubekwara Jehova isi. Ka obi siekwa anyị ike na “ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—Gụọ Ndị Hibru 11:6.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 808
Mkparị
Job bụ nwoke ezi omume nke rubeere Chineke isi n’agbanyeghị otú e si kparịa ya. Ma, otú o si lee ihe anya adịghị mma. Ihe a mere ka o mehie, a gbaziekwa ya. Elaịhu kwuru banyere Job, sị: “È nwere nwoke ọzọ dị ka Job, onye a na-akwa emo, ya ana-aṅụ ya ka mmiri?” (Job 34:7) Ihe ka Job mkpa bụ igosi na aka ya dị ọcha. Ọ nọkwa na-ekwu ihe ndị gosiri na ọ bụ onye ezi omume karịa Chineke. (Job 35:2; 36:24) Job weere ya na ọ bụghị Chineke ka mmadụ atọ ahụ sị na ha bụ ndị enyi ya kparịrị, kama na ọ bụ yanwa ka ha kparịrị. Job dịzi ka onye ji obi ụtọ kweta ka a na-akparị ya, ya ana-aṅụ mkparị ka ebe mmadụ na-aṅụ mmiri. Chineke mechara mee ka Job ghọta na ọ bụ yanwa bụ́ Chineke ka ndị ahụ na-akparị ma na-aghagide ụgha. (Job 42:7) Jehova gwakwara Samuel onye amụma ụdị ihe a mgbe mba Izrel kwuru ka e nye ha eze. Ọ sịrị ya: “Ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ m ka ha jụrụ ka m ghara ịbụ eze ha.” (1 Sam. 8:7) Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị̇: “Mba niile ga-akpọkwa unu asị [ọ bụghị n’ihi unu, kama] n’ihi aha m.” (Mat. 24:9) Icheta ihe ndị a ga-enyere Onye Kraịst aka iji ọṅụ na-atachi obi mgbe a na-akparị ya, meekwa ka o nweta ụgwọ ọrụ maka na ọ tachiri obi.—Luk 6:22, 23.
FEBỤWARỊ 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 1-4
Na-akwado Alaeze Chineke
“M Ga-eme Ka Mba Niile Maa Jijiji”
8 Gịnị ka ndị mmadụ mere gbasara ozi a? Ọtụtụ n’ime ha jụrụ ya. (Gụọ Abụ Ọma 2:1-3.) O mere ka mba niile na-agba ghara ghara. Ha jụrụ ịnabata Eze Jehova họpụtara. Ha ewereghị ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa ka “ozi ọma.” N’eziokwu, ndị ọchịchị ụfọdụ machiri ọrụ ikwusa ozi ọma anyị. N’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ha na-ekwu na ha na-efe Chineke, ha achọbeghị ịpụ n’ọchịchị. N’ihi ya, otú ahụ ndị ọchịchị mere n’oge Jizọs, ndị ọchịchị nke oge a na-emegide ndị na-eso ụzọ Jizọs si otú ahụ na-emegide onye Jehova tere mmanụ.—Ọrụ 4:25-28.
Etinyela Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị n’Ụwa A Na-adịghị n’Otu
11 Ịhụ ihe onwunwe n’anya. Ọ bụrụ na ego na ihe ndị ọzọ anyị nwere adị anyị oké mkpa, o nwere ike ime ka anyị tinyewe aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe afọ 1970 gasịrị, ọtụtụ ụmụnna nọ́ na Malawi hapụrụ ihe niile ha nwere n’ihi na ha ekweghị abanye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ekweghị ahapụ ihe ha nwere. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ruth chetara ihe merenụ. Ọ sịrị, “Ụfọdụ so anyị mgbe a kpọgara anyị n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ. Ma ha mechara banye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị, laghachikwa n’ụlọ ha n’ihi na ha achọghị idiwe ahụhụ a na-ata n’ebe ahụ.” Ma ọtụtụ ndị ohu Chineke anaghị eme otú ahụ. Ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka ego kọọ ha ma ọ bụ mee ka ha gbara aka ihe niile ha nwere.—Ndị Hibru 10:34.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 425
Mkpo Ọka
Ọ bụ ihe dị fere fere na-ekpuchi mkpụrụ akụ́kụ́ ndị dị ka ọka wit na ọka bali. Ọ bụ eziokwu na ebe niile e kwuru mkpo ọka na Baịbụl bụ ihe atụ ka e ji ya mee, ma ọ na-echetara anyị otú e si azọcha ọka n’oge ochie. Ọ na-abụ a ghọtachaa ọka n’ubi, ihe a dị fere fere a na-anaghị eri eri enweghịzi uru ọ bara. N’ihi ya, ọ na-anọchikarị anya ihe na-adịghị arọ, ihe na-abaghị uru, ihe a jụrụ ajụ, na ihe a na-esi n’ihe dị mma wepụta ma tụfuo.
A zọchawa ọka, mkpo ya na-esi n’ahụ́ ya adapụsị. A fụchawazie ya, ikuku na-eburu ya bufuo otú ahụ o si eburu uzuzu. E ji ihe a kọwaa otú Jehova Chineke si ewepụ ndị si n’ezi ofufe dapụ n’ebe ndị ya nọ, nakwa otú o si ebibi ndị ajọ omume na mba ndị na-emegide ya. (Job 21:18; Ọma 1:4; 35:5; Aịza. 17:13; 29:5; 41:15; Hos. 13:3) Alaeze Chineke ga-esi otú a gwepịa ndị iro Chineke, ha adịrịzie ka mkpo ọka ifufe ga-ebusasị.—Dan. 2:35.
Ọtụtụ mgbe, a na-ekpokọta mkpo ọka na-enweghị uru ha bara gbaa ha ọkụ ka ikuku ghara ibughachi ha n’ebe ọka ndị a họchara ahọcha dị. Jọn Onye Na-eme Baptizim bukwara amụma na mbibi a ga-ebibi ndị okpukpe ụgha ga-adị ka ebe e ji ọkụ bibie ihe. O kwuru na Jizọs Kraịst, ga-ekpokọta ọka wit, “ma ọ ga-eji ọkụ a na-enweghị ike imenyụ emenyụ gbaa mkpo ya ọkụ.”—Mat. 3:7-12; Luk 3:17.
FEBỤWARỊ 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 5-7
Na-erubere Jehova Isi n’Agbanyeghị Ihe Ndị Ọzọ Na-eme
Otú Ịgụ Baịbụl Si Enyere Anyị Aka Idi Nsogbu
7 Enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị ọ̀ gbatụla gị mgba okpuru? Ọ bụrụ otú ahụ, akụkọ Absalọm nwa Eze Devid ga-abara gị ezigbo uru. Absalọm gbara papa ya mgba okpuru, chọọkwa ịnaghara ya eze ya.—2 Sam. 15:5-14, 31; 18:6-14.
8 (1) Kpee ekpere. Tupu gị agụọ akụkọ Baịbụl ahụ, gwa Jehova otú obi dị gị gbasara ihe ọjọọ e mere gị. (Ọma 6:6-9) Gwa Jehova otú ọ dị gị n’obi. Rịọ ya ka o nyere gị aka ịhụ amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka idi nsogbu ahụ siri ike bịaara gị.
Ka Obi Sie Gị Ike na Ihe I Kweere Bụ Eziokwu
3 Ọ bụghị naanị otú ndị Chineke si hụ ibe ha n’anya kwesịrị ime ka anyị nwee okwukwe. N’ihi gịnị? Ka e were ya na nwanna, ọ bụrụgodị okenye ma ọ bụ ọsụ ụzọ, mere mmehie dị oké njọ, ma ọ bụ na nwanna mere gị ihe na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ na e nwere nwanna dapụrụ n’ọgbakọ ma na-ekwu na ihe anyị kweere abụghị eziokwu. Ụdị ihe ndị a mee, ị̀ ga-asụ ngọngọ ma kwụsị ife Jehova? Ihe anyị na-amụta bụ: Ọ bụrụ na ihe mere i ji nwee okwukwe na Chineke bụ naanị maka otú ndị ọzọ si akpa àgwà kama ịbụ na gị na Chineke dị ná mma, okwukwe gị agaghị esi ike. Otú i si hụ Jehova na ndị ya n’anya nwere ike inyetụrụ gị aka inwe okwukwe. Ma, ọ dịkwa ezigbo mkpa ka ị mụọ Baịbụl nke ọma, ghọta ihe ị na-amụ, meekwa nchọnchọ ka o doo gị anya na ihe ị na-amụta gbasara Jehova bụ eziokwu. Obi kwesịrị isi gị ike na ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Jehova bụ eziokwu.—Rom 12:2.
4 Jizọs kwuru na ụfọdụ nwere ike iji “ọṅụ” nabata eziokwu ahụ. Ma ọ bụrụ na nsogbu abịara ha, okwukwe ha anyụọ ka ọkụ. (Gụọ Matiu 13:3-6, 20, 21.) O nwere ike ịbụ n’ihi na ha amaghị na nsogbu na-abịara ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Mat. 16:24) O nwekwara ike ịbụ na ha chere na ebe ha bụ Ndị Kraịst, nsogbu ọ bụla agaghị abịara ha ma ọ bụ na Chineke ga-ewepụrụ ha nsogbu ha niile. Ma ebe anyị ka bi n’ụwa Ekwensu, nsogbu ga na-abịara anyị. Ihe nwere ike ịgbanwere anyị, mee ka anyị gharazie ịna-enwe obi ụtọ.—Ọma 6:6; Ekli. 9:11.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 995
Ili
Ná Ndị Rom 3:13, Pọl onyeozi kwuru ihe dị n’Abụ Ọma 5:9. O ji ọnụ ndị ajọ omume na ndị na-aghọ aghụghọ tụnyere “ili ghe oghe.” Otú ahụ a na-etinye ihe nwụrụ anwụ na ihe rụrụ arụ n’ili ghe oghe, ka okwu ndị na-esi ha n’ọnụ apụta bụ ihe na-egbu egbu na ihe rụrụ arụ.—I nwere ike ịtụle Mat. 15:18-20.
FEBỤWARỊ 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 8-10
‘Jehova, M Ga-eto Gị.’
Jiri Ọrụ Gị n’Ezinụlọ Jehova Kpọrọ Ihe
6 Jehova kwadebeere anyị ebe obibi pụrụ iche. Ogologo oge tupu Chineke ekee Adam, ọ kwadebere ụwa maka ụmụ mmadụ. (Job 38:4-6; Jere. 10:12) Jehova nyere ụmụ mmadụ ọtụtụ ihe ga-eme ha obi ụtọ n’ihi na ọ dị obiọma, na-emesapụkwa aka. (Ọma 104:14, 15, 24) E nwere oge ndị o lere ihe ndị o kere ma “hụ na ha dị mma.” (Jen. 1:10, 12, 31) O gosiri na o ji ụmụ mmadụ kpọrọ ihe n’ihi na o ‘mere ka ha lekọtawa’ ihe ndị ọzọ magburu onwe ha o kere n’ụwa. (Ọma 8:6) Jehova kwere nkwa na ụmụ mmadụ zuru okè ga-enwe obi ụtọ n’ilekọta ọrụ aka ya dị ebube ruo mgbe ebighị ebi. Ị̀ na-ekele Jehova mgbe niile maka nkwa a magburu onwe ya o kwere anyị?
Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Ndị Chineke Nyere Gị?
10 Otu ụzọ anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ikwu okwu Chineke nyere anyị bụ ịgwa ndị kweere n’evolushọn ihe mere anyị ji kwere na ọ bụ Chineke kere ihe niile. (Ọma 9:1; 1 Pita 3:15) Ndị na-akwado ozizi a na-ekwu na ụwa na ihe ndị dị ndụ dị na ya nọkatara dịrị. Anyị nwere ike iji Baịbụl na ihe ụfọdụ anyị tụlere n’isiokwu a gbachitere Nna anyị nke eluigwe, jirikwa ya gosi ndị chọrọ ige anyị ntị ihe mere anyị ji kwetasie ike na ọ bụ Jehova kere eluigwe na ụwa.—Ọma 102:25; Aịza. 40:25, 26.
‘Otú I Si Ekwu Okwu Ọ̀ Bụ Ihe E Ji Ama Atụ’?
13 Jiri obi gị niile na-abụ abụ. Anyị bụwa abụ n’ọmụmụ ihe, ihe kwesịrị ịka bụrụ mkpa anyị bụ ito Jehova. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sara anaghị ewere onwe ya ka onye ma abụ abụ. Ma, ọ chọrọ iji abụ na-eto Jehova. N’ihi ya, ọ chọpụtara na ịkwadebe abụ ndị a ga-abụ n’ọmụmụ ihe n’ụlọ otú ahụ o si akwadebe ihe omume ndị ọzọ na-enyere ya aka. Ọ na-abụ abụ ndị a ga-abụ, na-agbalịkwa achọpụta otú ihe ndị e dere na ha si gbasa ihe ndị a ga-amụ n’ụbọchị ahụ. Ọ sịrị: “Ihe a na-enyere m aka itinyekwu uche n’ihe ndị e dere n’abụ ahụ kama ichegbuwe onwe m ma m̀ na-abụtakwa ya nke ọma.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 832
Mkpịsị Aka
Na Baịbụl, e kwuru na Chineke ji “mkpịsị aka” ya mee ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, e kwuru na o ji ya dee Iwu Iri ná mbadamba nkume (Ọpụ. 31:18; Diut. 9:10), na o ji ya rụọ ọrụ ebube dị iche iche (Ọpụ. 8:18, 19), jirikwa ya kee eluigwe (Ọma 8:3). Ihe a kọrọ n’akwụkwọ Jenesis banyere otú Chineke si kee eluigwe na ụwa gosiri na e kwuo “mkpịsị aka” Chineke, ihe a na-ekwu bụ mmụọ nsọ ya ma ọ bụ ike ya. Ebe ahụ kwuru na ike (ya bụ, ruʹach, “mmụọ”) Chineke nọ na-erugharị n’elu mmiri. (Jen. 1:2) Ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst mere ka ihe a dokwuo anya. Matiu kwuru na Jizọs ji ‘mmụọ nsọ Chineke’ chụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ma, otú Luk si kwuo ya n’asụsụ Grik bụ na Jizọs ji “mkpịsị aka Chineke” chụpụ ha.—Mat. 12:28; Luk 11:20.
FEBỤWARỊ 26–MACH 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 11-15
Weregodị Ya na Ị Nọ n’Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Udo Dị na Ya
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi Mbụ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
11:3—Olee ide ndị a na-akwada? Ọ bụ ide ndị ji ọha mmadụ—iwu, ụkpụrụ, na ikpe ziri ezi. Mgbe a na-agbasoghị ha, a na-enwe ọgba aghara, a na-enwekwa ikpe na-ezighị ezi. Mgbe e nwere ọnọdụ ndị dị otú ahụ, “onye ezi omume” aghaghị ịtụkwasị Chineke obi kpamkpam.—Abụ Ọma 11:4-7.
Tigbuo Zọgbuo Ọ̀ Ga-ala Ala n’Ụwa A?
Baịbụl kwuru na Chineke ga-akwụsị tigbuo zọgbuo n’ụwa a n’oge na-adịghị anya. Ihe na-echezi ụwa a tigbuo zọgbuo juru bụ “ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:5-7) A gaghịzi enwe ndị tigbuo zọgbuo. Ma, olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike na Chineke chọrọ ịkwụsị tigbuo zọgbuo kpamkpam?
Baịbụl kwuru na Chineke “kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” (Abụ Ọma 11:5) Chineke hụrụ udo na ikpe ziri ezi n’anya. (Abụ Ọma 33:5; 37:28) Ọ bụ ya mere na ọ gaghị ekwe ka ndị na-eme ihe ike ma ọ bụ ndị tigbuo zọgbuo nọrọ ruo ebighị ebi.
Ị̀ Dị Njikere Iji Ndidi Chere Jehova?
15 Gịnị mere Devid ji dị njikere iji ndidi chere? Ọ zara ajụjụ a n’abụ ọma ahụ ọ jụrụ Jehova ugboro ise, sị: “Ruo ole mgbe?” O kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, n’obiọma gị ka m tụkwasịrị obi; ka obi m ṅụrịa ọṅụ n’ihi nzọpụta gị. M ga-abụku Jehova abụ, n’ihi na o mesowo m mmeso ọma.” (Ọma 13:5, 6) Obi siri Devid ike na Jehova hụrụ ya n’anya, nakwa na ọ gaghị ahapụ ya. O ji obi ụtọ na-atụsi anya ike mgbe Jehova ga-anapụta ya. O chekwara otú Jehova sirila gọzie ya n’oge gara aga. N’eziokwu, Devid ma na oge ahụ o ji chere ga-aba uru.
Chineke Ga-eji Alaeze Ya Mee Uche Ya n’Ụwa
16 Obi ga-eru ha ala. Ihe ahụ Aịzaya buru n’amụma n’Aịzaya 11:6-9 ga-emecha mezuo n’ụwa niile na paradaịs. Obi ga-eru mmadụ niile ala, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka. O nweghị onye ga-enye ha nsogbu, ma mmadụ ma anụmanụ. O nweghị ebe ị ga-aga n’ụwa a chịrị obi n’aka. O nweghị ihe ị ga-atụ egwu ya ma i gwuwe mmiri. Ị ga-arị ugwu ọ bụla ị chọrọ ịrị ma ọ bụ wagharịa n’ọhịa dị iche iche n’enweghị ọkọ ga-akọ gị. Ị nọrọ ebe ahụ chi ejie, ị gaghị atụ ụjọ ihe ọ bụla. Jehova ga-emezu ihe o kwuru n’Ezikiel 34:25, ya bụ, ọ ga-eme ka ndị ya nwee ike ‘ibi n’ala ịkpa n’obi iru ala, hiekwa ụra n’oké ọhịa.’
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Gbanweela?
12 Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị n’ụwa na-eche echiche otú ahụ Pọl kọwara. Ha chere na irubere iwu isi bụ ihe ndị mgbe ochie nakwa na e kwesịghị ịgwa mmadụ ka o rubere iwu ọ bụla isi. Ọtụtụ ndị nkụzi na ọtụtụ ndị nne na nna na-ahapụ ụmụaka ka ha na-eme ihe masịrị ha. Ha na-akụzidịrị ha na onye ọ bụla nwere ike ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ha na-ekwu na o nweghị otú mmadụ ga-esi mata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. E nwere ọtụtụ ndị na-ekwu na ha kweere na Chineke. Ma ha echeghị na ha kwesịrị ịna-erubere ya isi. (Ọma 14:1) Onye Kraịst nwere ike ịmụta ụdị àgwà ahụ. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịkwụsị ime ihe nzukọ Chineke na-agwa anyị ma malite ịkatọ ihe ọ bụla e mere na-adịghị anyị mma. Ọ bụrụ na e jiri Baịbụl dụọ anyị ọdụ gbasara ntụrụndụ, Ịntanet, ma ọ bụ ịga mahadum, o nwere ike anyị agaghị eji obi anyị niile kweta ihe ahụ a gwara anyị.