Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Mee p. 2-3
  • Mee 6-12

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee 6-12
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Mee p. 2-3

MEE 6-12

ABỤ ỌMA 36-37

Abụ nke 87 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. “Ewerela Ndị Na-eme Ihe Ọjọọ Iwe”

(Nkeji 10)

Ndị ajọ omume na-eme ihe na-agbawa anyị obi, na-emekwa ka anyị na-ahụsi anya (Ọma 36:1-4; w17.04 10 ¶4)

Iburu “ndị na-eme ihe ọjọọ” iwe n’obi nwekwara ike ịkpatara anyị nsogbu (Ọma 37:1, 7, 8; w22.06 10 ¶10)

Ịtụkwasị nkwa ndị Jehova kwere obi na-eme ka obi ruo anyị ala (Ọma 37:10, 11; w03 12/1 14 ¶20)

Ebe nwanna nwaanyị ụjọ ji na-agụ akụkọ ụwa n’ekwentị ya. Ọ na-ahụ ebe ndị iwe ji na-eme ngagharị iwe, ebe onye uwe ojii na-anara aka azụ, ebe ndị soja na-akwa mgbọ, ebe otu nwoke ji ngwá ọgụ nọrọ n’ebe a na-adọsa ụgbọala, ebe ndị ohi na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ, ebe e nwere ọgba aghara, nakwa ebe ndị na-azọ ndị mmadụ ndụ gawara inye aka n’ebe ụgbọala nwere ihe mberede.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘M̀ na-elekarị tigbuo zọgbuo ndị a na-egosi n’akụkọ ụwa?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 36:6​—Ọ̀ ga-abụ gịnị ka ọbụ abụ a bu n’obi mgbe o kwuru na ezi omume Jehova dị ka “nnukwu ugwu”? (it-2 445)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 37:1-26 (th ihe ọmụmụ nke 10)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa onye na-ekwebughị ka a mụwara ya Baịbụl ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)

6. Okwu

(Nkeji 5) ijwbv 45​—Isiokwu: Gịnị Ka Ihe E Dere n’Abụ Ọma 37:4 pụtara? (th ihe ọmụmụ nke 13)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 33

7. Ị̀ Kwadebela Maka Oge “Nsogbu”?

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ngwongwo ụmụnna anyị n’ụwa niile na-efunahụ ha, ndị ha hụrụ n’anya na-anwụnahụkwa ha n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha nakwa ọdachi ndị mmadụ na-akpata. (Ọma 9:9, 10) Ọ dị mwute na “nsogbu” nwere ike ịbịara anyị mgbe ọ bụla. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkwadebe maka ọnwụnwa ndị ahụ.

Ịkwadebe ihe ndị anyị ga-eji nyere onwe anyị aka n’oge ọdachi dị mma.a Ma, gịnị ga-enyere anyị aka idi nsogbu ma e nwee ọdachi?

  • Kwadebe obi gị: Kweta na ọdachi nwere ike ịdakwasị onye ọ bụla. N’ihi ya, chebara ihe ị ga-eme ma e nwee ọdachi echiche. Ekwela ka obi gị na-adịkarị n’ihe ndị i nwere. Ọ ga-enyere gị aka ịkpa àgwà ka onye ma ihe, ime ihe ngwa ngwa, nakwa ichebe onwe gị kama ịgbawa mbọ ka i chekwaa ihe ndị i nwere. (Jen. 19:16; Ọma 36:9) Ọ ga-enyekwara gị aka mgbe e nwechara ọdachi ka ị ghara ịtụ anya na ihe ga-adị otú ọ dịbu. O nwekwara ike ime ka obi ghara ịda gị mbà ma ọ bụrụ na ihe ndị i nwere lara n’iyi.​—Ọma 37:19

  • Mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma: Ka obi sie gị ike na Jehova ga-elekọtali gị nakwa na ọ na-agụ ya agụụ ime otú ahụ. (Ọma 37:18) Tupu e nwee ọdachi, na-echetara onwe gị mgbe niile na Jehova ga na-eduzi ndị na-efe ya ma na-akwado ha ọ bụrụgodị na ihe niile anyị nwere funahụrụ anyị, naanị “ụgwọ ọrụ” anyị ji n’aka abụrụ ndụ anyị.​—Jere. 45:5; Ọma 37:23, 24

Ọ bụrụ na obi siri anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere anyị, ọ pụtara na anyị ji ya mere ‘ebe a rụsiri ike nke anyị na-agbaba n’oge ahụhụ.’​—Ọma 37:39.

Foto ndị na-egosi: Foto ndị si na vidio bụ́ “Ì Jikerela Maka Ọdachi?” 1. Ebe otu nwanna na-agụ Baịbụl. 2. Ebe ala ọma jijiji mere n’oké osimiri, mmiri ana-asọbata n’ebe ndị mmadụ bi. 3. Ebe mmiri rujuru, oké ifufe ana-efe. 4. Ebe ndị mmadụ ruuru mmiri na-ebupụta ngwongwo ha.

Kpọnye VIDIO bụ́ Ì Jikerela Maka Ọdachi? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ma e nwee ọdachi?

  • Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji kwadebe maka ọdachi?

  • Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ma e nwee ọdachi?

IHE Ị GA-AGBA MBỌ MEE

  • Ka ị na-agụ ma na-amụ Baịbụl, chọpụta amaokwu ndị i nwere ike iji kasie onwe gị obi, kasiekwa ndị ọzọ. I nwere ike itinye tag n’amaokwu ndị ahụ na JW Library® gị. Ị chọọ ịhụ ebe e dere ụfọdụ amaokwu ndị a, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị ka Baịbụl Kwuru Banyere Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha?” Ọ dị na jw.org.

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 9 ¶10-17

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 57 na Ekpere

a Gụọ Teta! Nke 5 2017, peeji nke 4-6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya