MEE 13-19
ABỤ ỌMA 38-39
Abụ nke 125 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Ekwela Ka Obi Gị Nọgide Na-ama Gị Ikpe
(Nkeji 10)
Mmadụ ikwe ka obi ya nọgide na-ama ya ikpe dị ka ebe mmadụ bu ibu dị ezigbo arọ (Ọma 38:3-8; w20.11 27 ¶12-13)
Kama ịna-echetakarị ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga, kpebisie ike na ị ga-eji ụbọchị ndị dị n’ihu na-eme ihe dị Jehova mma (Ọma 39:4, 5; w02 11/15 20 ¶1-2)
Na-ekpe ekpere, ọ bụrụgodị na o siiri gị ike ime otú ahụ maka na obi gị na-ama gị ikpe (Ọma 39:12; w21.10 15 ¶4)
Ọ bụrụ na obi gị anọgide na-ama gị ikpe, cheta na Jehova na-agbaghara ndị mmehie “kpamkpam” ma ha chegharịa.—Aịza. 55:7.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ọma 39:1—Olee oge ndị ọ ga-adị mkpa ka anyị ‘jiri ihe kechie ọnụ anyị’? (w22.09 12 ¶16)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 38:1-22 (th ihe ọmụmụ nke 2)
4. Dịrị Akọ—Ihe Pọl Mere
(Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye VIDIO, unu ekwurịtazie ihe dị na lmd isi nke 5 nọmba nke 1-2.
5. Dịrị Akọ—Na-eme Ka Pọl
(Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si na lmd isi nke 5 nọmba nke 3-5 na “I Nwekwara Ike Ịgụ.”
Abụ nke 44
6. Mkpa Ọgbakọ
(Nkeji 15)
7. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 9 ¶18-26, igbe nke 9A na 9B