MEE 20-26
ABỤ ỌMA 40-41
Abụ nke 102 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-enyere Ndị Ọzọ Aka?
(Nkeji 10)
Inyere ndị ọzọ aka na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ (Ọma 41:1; w18.08 21-22 ¶16-18)
Ọ bụrụ na anyị na-enyere ndị ọzọ aka, Jehova ga-enyere anyị aka (Ọma 41:2-4; w15 12/15 24 ¶7)
Anyị na-eme ka e too Jehova mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka (Ọma 41:13; Ilu 14:31; w17.09 12 ¶17)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘È nwere onye nọ n’ọgbakọ anyị e kwesịrị inyere aka ka ọ mụtakwuo gbasara JW Library?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ọma 40:5-10—Gịnị ka ekpere Devid kpere na-akụziri anyị ka anyị na-eme ma ọ bụrụ na anyị kwetara na Jehova bụ Ọkaakaa? (it-2 16)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 40:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Malite ịkpanyere onye yiri ka obi ọ̀ dị ya ụtọ ụka. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Malite ịkpanyere onye yiri ka obi adịghị ya ụtọ ụka. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 5) lff isi nke 14 nọmba nke 6. Gị na onye ị na-amụrụ ihe, nke ọ na-esiri ike ibido zawa ajụjụ n’ọmụmụ ihe, kwurịta otu ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Na-eto Jehova n’Ọgbakọ.” Ọ dị n’ebe a kpọrọ “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya.” (th ihe ọmụmụ nke 19)
Abụ nke 138
7. Na-emere Ndị Agadi Ihe Ọma
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Jehova ji ọrụ niile ndị agadi na-erubere ya isi na-arụ n’ọgbakọ kpọrọ ihe, anyịnwa jikwa ya kpọrọ ihe. (Hib. 6:10) Kemgbe ọtụtụ afọ, ha agbaala ezigbo mbọ kụziere ụmụnna ha ihe, zụọ ha ma gbaa ha ume. I nwere ike icheta ụzọ ndị ha si nyere gị aka. Olee otú ị ga-esi egosi na obi dị gị ụtọ maka ihe niile ha merela n’ọgbakọ ma ka na-eme?
Kpọnye VIDIO bụ́ ‘Ka Anyị Na-emere Ụmụnna Anyị Ihe Ọma.’ Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Ji-Hoon mụtara n’aka Nwanna Ho-jin Kang?
Gịnị ka ndị agadi nọ n’ọgbakọ unu na-eme masịrị gị?
Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe atụ onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi?
Gịnị mere i ji chee na otú ahụ Ji-Hoon si chọta ụmụnna ndị ọzọ ka ha soro nyere Nwanna Ho-jin Kang aka dị mma?
Ọ bụrụ na anyị echebara mkpa ndị agadi nọ n’ọgbakọ anyị ezigbo echiche, anyị ga-achọpụta ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi nyere ha aka. Ị hụ na ha nwere mkpa, chee ihe i nwere ike ime iji gbooro ha ya.—Jems 2:15, 16.
Gụọ Ndị Galeshia 6:10. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee ụzọ ndị i nwere ike isi ‘na-emere ndị agadi nọ n’ọgbakọ unu ihe ọma’?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 9 ¶27-32, igbe 9CH na 9D