JUN 3-9
ABỤ ỌMA 45-47
Abụ nke 27 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
Jizọs na nwaanyị ọ lụrụ ọhụrụ, ya bụ, otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000)
1. Abụ Kwuru Gbasara Agbamakwụkwọ Otu Eze
(Nkeji 10)
Abụ Ọma nke 45 kwuru gbasara agbamakwụkwọ Eze bụ́ Mezaya (Ọma 45:1, 13, 14; w14 2/15 10 ¶8-9)
Eze a ga-agba akwụkwọ ma a lụchaa agha Amagedọn (Ọma 45:3, 4; w22.05 17 ¶10-12)
Alụmdi na nwunye ahụ ga-abara mmadụ niile uru (Ọma 46:8-11; it-2 1169)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Obi ọ̀ “dị m ụtọ” izisa ozi ọma gbasara Eze anyị, bụ́ Jizọs Kraịst?’—Ọma 45:1.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ọma 45:16—Gịnị ka amaokwu a na-akụziri anyị gbasara otú ihe ga-adị na Paradaịs? (w17.04 11 ¶9)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 45:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)
5. Okwu
(Nkeji 5) ijwbv 26—Isiokwu: Gịnị Ka Ihe E Dere n’Abụ Ọma 46:10 pụtara? (th ihe ọmụmụ nke 18)
6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 4) Ihe Ngosi. g 12/10 22-23—Isiokwu: Olee Otú I Si Ele Nwoke Idina Nwoke Anya? (lmd isi nke 6 nọmba nke 5)
Abụ nke 131
7. Nọgide Na-egosi Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị na Ị Hụrụ Ya n’Anya
(Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ụbọchị agbamakwụkwọ na-abụ ụbọchị obi ụtọ. (Ọma 45:13-15) Ọ na-abụkarị otu n’ime ụbọchị di na nwunye na-akacha enwe obi ụtọ. Ma, gịnị ka di na nwunye nwere ike ime ka ha nwere obi ụtọ a na-aga?—Ekli. 9:9.
Ihe ga-eme ka di na nwunye nọgide na-enwe obi ụtọ bụ onye ọ bụla n’ime ha ịna-egosi ibe ya na ọ hụrụ ya n’anya. Di na nwunye kwesịrị ịna-eme ka Aịzik na Ribeka. Baịbụl gwara anyị na mgbe ha lụrụla ihe karịrị afọ iri atọ, ha ka nọ na-egosi ibe ha ịhụnanya. (Jen. 26:8) Gịnị ga-enyere ndị di na nwunye aka ịna-egosi ibe ha ụdị ịhụnanya a?
Kpọnye VIDIO bụ́ Ị Chọọ Ka Gị na Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-enwe Obi Ụtọ, Gosi Ya na Ị Hụrụ Ya n’Anya. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Olee ihe ndị nwere ike ime ka obi di na nwunye pụọ n’ebe ibe ha nọ?
Gịnị ka di na nwunye ga na-eme iji gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya ma jiri ibe ha kpọrọ ihe?—Ọrụ 20:35
8. Mkpa Ọgbakọ
(Nkeji 5)
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 10 ¶1-7 na vidio kọwara isiokwu a na-amụ