Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2024 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
MEE 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 36-37
“Ewerela Ndị Na-eme Ihe Ọjọọ Iwe”
Olee Ihe Na-agaghịzi Adị Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?
4 Olee nsogbu ndị ọjọọ na-akpatara anyị ugbu a? Mgbe Pọl onyeozi buchara amụma na n’oge ikpeazụ a, “a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ,” o ji ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ.” (2 Tim. 3:1-5, 13) Ị̀ hụla ka amụma a na-emezu? Ndị ọjọọ emesiela ọtụtụ n’ime anyị ike. Ha nwere ike bụrụ ndị na-eme ihe ike, ndị na-akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị, na ndị omekome obi fere azụ. Ụfọdụ n’ime ha anaghị ezo ihe ọjọọ ha na-eme ezo. Ndị ọzọ na-aghọgbu ndị mmadụ, na-eme ka à ga-asị na ha bụ ezigbo mmadụ. Ọ bụrụgodị na ha emesitụbeghị anyị ike, ha na-akpatara anyị nsogbu. Ọ na-agbawa anyị obi ma anyị hụ ihe ha na-eme ndị mmadụ. Otú ha si emeso ụmụaka, ndị agadi, na ndị ọzọ na-enweghị ike ichebe onwe ha na-atụ anyị ụjọ. Ndị ọjọọ na-akpa àgwà ka anụmanụ ma ọ bụdị na-akpa àgwà ndị mmụọ ọjọọ. (Jems 3:15) Obi dị anyị ụtọ na Okwu Chineke mere ka anyị nwee olileanya.
Jehova Na-agọzi Ndị Na-agbaghara
10 Iburu mmadụ iwe n’obi na-akpatara anyị nsogbu. Iwe dị ka ibu arọ. Jehova chọkwara ka anyị kwụsị iburu mmadụ iwe n’obi ka obi nwee ike iru anyị ala. (Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32.) Ọ gwara anyị ka anyị “hapụ iwe, hapụkwa ọnụma.” (Ọma 37:8) Ime ihe a Jehova kwuru na-abara anyị uru. Iburu mmadụ iwe n’obi nwere ike ịkpatara anyị ọrịa. (Ilu 14:30) Ọ bụrụ na anyị ebuoro mmadụ iwe n’obi, ọ bụghị onye ahụ ka anyị na-akpatara nsogbu. O yiri mmadụ ịṅụ nsí. Ọ bụ onwe ya ka ọ ga-akpatara nsogbu. Mana, ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ, ọ bụ onwe anyị ka anyị na-emere ihe ọma. (Ilu 11:17) Obi na-eru anyị ala, anyị enweekwa ike ịna-efe Jehova.
‘Ka Ihe Jehova Na-atọ Gị Ụtọ’
20 Mgbe ahụ, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:11a) Ma ole ndị bụ ndị a “dị umeala n’obi”? Okwu a sụgharịrị ịbụ “ịdị umeala n’obi” sitere n’okwu pụtara n’ụzọ bụ́ isi “mekpaa ahụ́, wedaa n’ala.” Ee, “ndị dị umeala n’obi” bụ ndị ji obi umeala na-echere Jehova imezi mmejọ na mmegbu ndị a na-emeso ha. “Ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11b) Ọbụna ugbu a, anyị na-ahụ udo bara ụba na paradaịs ime mmụọ nke e jikọtara ya na ezi ọgbakọ Ndị Kraịst.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 445
Ugwu
Ọ na-akwụrụ chịm, ọ na-adịgide adịgide, ọ dịkwa elu. Na Baịbụl, a na-eji ugwu ama atụ ihe kwụ chịm na ihe na-adịgide adịgide. (Aịza. 54:10; Hab. 3:6; i nwere ike ịtụle Ọma 46:2.) N’ihi ya, mgbe ọbụ abụ bụ́ Devid na-ekwu na ezi omume Jehova dị ka “nnukwu ugwu,” (Ọma 36:6) ọ ga-abụ na ihe ọ na-ekwu bụ na ezi omume Jehova na-adịgide adịgide. O nwekwara ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ na ezi omume Chineke dị ezigbo elu karịa nke ụmụ mmadụ otú ahụ ugwu si adị elu. (I nwere ike ịtụle Aịza. 55:8, 9.) Mgbe a wụpụchara iwe Chineke nke dị n’efere nke asaa, Mkpughe 16:20 kwuru, sị: “O nweghịkwa ebe a hụrụ ugwu dị iche iche.” Ihe a gosiri na ihe ndị dịdị elu ka ugwu agaghị agbanahụ iwe Chineke.—I nwere ike ịtụle Jere. 4:23-26.
MEE 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 38-39
Ekwela Ka Obi Gị Nọgide Na-ama Gị Ikpe
‘Legide Anya n’Ihu’
12 Gụọ 1 Jọn 3:19, 20. E nweghị onye obi ya na-anaghị ama ikpe mgbe ụfọdụ maka ihe ọjọọ o mere. Dị ka ihe atụ, obi ụfọdụ ndị na-ama ha ikpe maka ihe ndị ha mejọrọ tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. Obi ndị ọzọ na-ama ha ikpe n’ihi ihe ndị ha mejọrọ mgbe ha mechara baptizim. (Rom 3:23) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na-achọkarị ime ihe dị mma. Ma, “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2; Rom 7:21-23) O nweghị onye n’ime anyị obi na-atọ ụtọ ma obi ya na-ama ya ikpe, ma o nwere ike ịbara anyị uru. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na obi anyị ịma anyị ikpe nwere ike ime ka anyị gbanwee ma kpebisie ike ịghara ime ihe ahụ anyị mejọrọ ọzọ.—Hib. 12:12, 13.
13 Ma obi anyị nwere ike ịna-ama anyị ikpe gabiga oké. Ihe ọ pụtara bụ na obi anyị nwere ike ịna-ama anyị ikpe mgbe anyị chegharịcharala, Jehova egosikwa na ọ gbagharala anyị. Ụdị obi amamikpe a nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. (Ọma 31:10; 38:3, 4) Olee otú o nwere ike isi kpatara anyị nsogbu? Ka anyị tụlee gbasara otu nwanna nwaanyị obi ya nọgidere na-ama ikpe n’ihi ihe ndị o mere n’oge gara aga. Ọ sịrị: “M chere na ọ baghịzi uru ịgbawa mbọ n’ozi Jehova n’ihi na a gaghịzi azọpụta m.” O nwere ike ịna-adị ọtụtụ n’ime anyị otú ọ dị nwanna nwaanyị a. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ikwe ka obi anyị nọgide na-ama anyị ikpe. Chegodị otú obi ga-esi atọ Setan ụtọ ma ọ chọpụta na ike onwe anyị agwụla anyị ebe ọ bụkwanụ na ike anyị agwụbeghị Jehova.—Tụlee 2 Ndị Kọrịnt 2:5-7, 11.
Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Mee Ka Oge Ndụ Anyị Baa Uru n’Anya Jehova?
AFỌ ndụ anyị yiri ka ha dị mkpụmkpụ ma na-agabiga ngwa ngwa. Ọbụ abụ bụ́ Devid tụgharịrị uche n’ịdị mkpụmkpụ nke ndụ, a kpalikwara ya ikpe ekpere, sị: “Jehova, mee ka m mara ọgwụgwụ m, na ọ̀tụ̀tụ̀ ụbọchị m nile, ihe ọ bụ; ka m mara ka m si bụrụ ihe na-akwụsị akwụsị. Lee, I mewo ụbọchị m nile dị ka ntụ̀ ọbụ aka; mgbe ndụ m dịkwa ka ihe na-abụghị ihe n’ihu Gị.” Nchegbu Devid bụ ibi ndụ n’ụzọ ga-eme ka ọ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ma n’okwu ọnụ ya ma n’omume ya. N’ikwu banyere ndabere ọ dabeere n’ebe Chineke nọ, ọ sịrị: “Nchere m, n’ebe Ị nọ ka ọ dị.” (Abụ Ọma 39:4, 5, 7) Jehova gere ya ntị. N’ezie, ọ tụrụ ihe omume nile nke Devid n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma kwụghachi ya ụgwọ dị ka ha si dị.
Ọ dị mfe iji ọrụ n’aka na minit ọ bụla kwa ụbọchị na ịbụ ndị na-ebi ndụ gbalụ gbalụ na nke jupụtara n’ihe omume. Nke a pụrụ ime ka anyị na-enwe nchekasị, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị nwere ọtụtụ ihe ime na ọtụtụ ihe ịgabiga, nweekwa oge dị nnọọ nta iji mezuo ha. Nchegbu anyị na nke Devid ọ̀ bụ otu—ibi ndụ n’ụzọ ga-eme ka anyị nweta ihu ọma Chineke? N’ezie, Jehova na-ahụ ma jiri nlezianya na-enyocha onye ọ bụla n’ime anyị. Job, bụ́ nwoke tụrụ egwu Chineke, kwetara ihe dị ka afọ 3,600 gara aga na Jehova hụrụ ụzọ ya nile ma gụkọọ nzọụkwụ ya nile. Job jụrụ ajụjụ a na-achọghị ọsịsa, sị: “Mgbe Ọ na-eletakwa, gịnị ka m ga-azaghachi Ya?” (Job 31:4-6, 14) O kwere omume ime ka oge ndụ anyị baa uru n’anya Chineke site n’ibute ihe ime mmụọ ụzọ, irube isi n’iwu ya, na iji oge anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Ka anyị lebakwuo anya n’okwu ndị a.
Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Jehova Dịghachi ná Mma
Na-ekpe ekpere mgbe niile. Nna gị nke eluigwe ghọtara na ọ bụrụ na obi gị ka na-ama gị ikpe, o nwere ike ime ka o siere gị ike ikpe ekpere. (Rom 8:26) N’agbanyeghị ya, ‘nọgide na-ekpe ekpere.’ Na-agwa Jehova na ị chọsiri ike ka gị na ya bụrụ enyi. (Rom 12:12) Otu nwanna aha ya bụ Andrej chetara ihe mere ya n’oge gara aga. Ọ sịrị: “Obi m nọ na-ama m ezigbo ikpe, ihere ana-emekwa m. Ma, mgbe ọ bụla m kpere ekpere, obi na-aka eru m ala.” Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-ekpe n’ekpere, gụọ ekpere Eze Devid kpere mgbe o chegharịrị n’Abụ Ọma nke 51 na nke 65.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Bụrụ Onye A Ga-atụkwasịli Obi
16 Anyị kwesịrị ịna-ejide onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndị ọzọ na-atụkwasị anyị obi. Àgwà ahụ ga-enyere anyị aka ijide ọnụ anyị aka ma anyị chọwa ikwu ihe mmadụ gwara anyị, sị anyị agwala onye ọzọ. (Gụọ Ilu 10:19.) Anyị nwere ike ịchọpụta na ọ na-esiri anyị ike ijide onwe anyị mgbe anyị gara n’Ịntanet. Ma anyị akpacharaghị anya, e nwere ike anyị agaghị ama mgbe anyị ji gwa ọtụtụ ndị ihe anyị na-ekwesịghị ịgwa onye ọzọ. Ozugbo anyị si n’Ịntanet zipụ ozi, ihe a ga-eji ozi ahụ mee ma ọ bụ nsogbu ọ ga-akpata adịghịzi anyị n’aka. Ijide onwe anyị ga-emekwa ka anyị gbachi nkịtị ma ndị na-emegide anyị gbalịwa ịghọgbu anyị ka anyị gwa ha ihe nwere ike itinye ụmụnna anyị ná nsogbu. O nwere ike ịbụ mgbe ndị uwe ojii na-agba anyị ajụjụ ná mba a machiri ozi ọma anyị iwu ma ọ bụ sị anyị emela ihe ụfọdụ. Ụdị ihe a mee, anyị “ga-eji ihe kechie ọnụ” anyị otú ahụ Baịbụl kwuru. (Ọma 39:1) Anyị kwesịrị ịbụ ndị mmadụ niile ga-atụkwasịli obi, ma ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, ụmụnna anyị, ma onye ọ bụla ọzọ. Anyị chọọ ịbụ ndị a tụkwasịrị obi, anyị kwesịrị ịna-ejide onwe anyị.
MEE 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 40-41
Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-enyere Ndị Ọzọ Aka?
Ndị Na-emesapụ Aka Na-enwe Obi Ụtọ
16 O doro anya na ndị na-emesapụ aka anaghị enye ihe ka ha nweta ihe n’aka ndị ha nyere ihe. Ọ bụ ihe a ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru, sị: “Mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, ndị ìsì; ị ga-enwekwa obi ụtọ, n’ihi na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ gị ụgwọ.” (Luk 14:13, 14) Otu onye so dee Baịbụl kwuru, sị: “Onye anya ya na-eme ebere ka a ga-agọzi.” Onye ọzọ kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe.” (Ilu 22:9; Ọma 41:1) N’eziokwu, anyị kwesịrị ịna-enye ndị ọzọ ihe n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ.
17 Mgbe Pọl kwuru ihe Jizọs kwuru nke bụ́ na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe,” ihe ọ na-ekwu abụghị naanị inye mmadụ ego, kama na anyị nwekwara ike ịgba ndị nọ ná mkpa ume, iji Baịbụl nye ha ndụmọdụ, nakwa inyere ha aka n’ụzọ ndị ọzọ. (Ọrụ 20:31-35) Pọl si n’ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere gwa anyị na ọ dị mkpa ka anyị jiri oge anyị na ike anyị na-enyere ndị mmadụ aka, nakwa ka anyị na-ahụ ha n’anya ma na-elekọta ha.
18 Ndị na-eme nchọnchọ banyere otú ndị mmadụ si akpa àgwà achọpụtala na inye mmadụ ihe na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Otu isiokwu dị n’otu akwụkwọ kwuru na ndị mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ha meere ndị ọzọ ihe. Ndị na-eme nchọnchọ na-ekwu na ọ bụrụ na anyị ana-enyere ndị mmadụ aka, ọ na-eme ka anyị na-eche na anyị ji ndụ anyị mee ihe bara uru. N’ihi ya, ụfọdụ ndị ọkachamara na-agwa ndị mmadụ ka ha na-arụrụ ndị mmadụ ọrụ ebere n’ihi na ọ ga-eme ka ha na-enwekwu obi ụtọ, ahụ́ agbasiekwa ha ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe a ha chọpụtara ejughị anyị anya n’ihi na Onye kere anyị, bụ́ Jehova agwala anyị ya ọtụtụ ugboro.—2 Tim. 3:16, 17.
Jehova Ga-akwado Gị
7 Ma, anyị rịawa ọrịa, Jehova ga-akasi anyị obi, nye anyị amamihe ma kwado anyị otú ahụ o meere ndị fere ya n’oge ochie. Eze Devid dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe; Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi. Jehova ga-eche ya nche ma chebe ya ndụ.” (Ọma 41:1, 2) Anyị ma na, n’oge Devid, onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma agaghị adịrị ndụ na-aga ma ghara ịnwụ. N’ihi ya, ihe Devid kwuru apụtaghị na Chineke ga-arụ ọrụ ebube mee ka ụdị onye ahụ ghara ịnwụ, ya bụ, dịrịzie ndụ ebighị ebi. Anyị kwesịrị ịghọta na ihe ahụ o kwuru pụtara na Chineke ga-enyere onye tụkwasịrị ya obi otú ahụ aka. Olee otú ọ ga-esi enyere ya aka? Devid kwuru, sị: “Jehova ga-enye ya ume mgbe ọ nọ n’ute ọrịa; ị ga-agbanwe ihe ndina ya dum n’oge ọ na-arịa ọrịa.” (Ọma 41:3) Onye na-enyere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya aka kwesịrị inwe obi ike na Chineke ma ya, na-ahụkwa ihe ọma ọ na-eme. Ihe ọzọ bụ na otú Jehova si kee ahụ́ mmadụ mere ka o nwee ike ịna-alụso ọrịa ọgụ.
Na-enwe Ọmịiko Ka Jehova
17 Anyị ma na inwere ndị mmadụ ọmịiko bara uru, ma ọ bụghị ya mere anyị ji enwere ndị mmadụ ọmịiko. Ihe mere anyị ji eme ya bụ n’ihi na anyị chọrọ iṅomi Jehova Chineke, meekwa ka e too ya. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, na-enwekwara ha ọmịiko. (Ilu 14:31) Ọ chọrọ ka anyị na-eme ka ya. N’ihi ya, ka anyị niile mee ihe anyị nwere ike ime iji na-enwere ndị mmadụ ọmịiko ka Chineke. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya, anyị na ndị ọzọ ana-adịkwu ná mma.—Gal. 6:10; 1 Jọn 4:16.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 16
Jehova
Ihe niile e kwuru na Baịbụl na-egosi na ọ bụ Jehova bụ Ọkaakaa. Ha na-emekwa ka anyị mata na isi sekpụ ntị ná nzube Jehova Chineke bụ ido aha ya nsọ. Ihe ọ pụtara bụ ime ka a gharazie ịna-akọcha aha ya. Ma, ihe ọzọ ọ pụtara bụ na ndị niile o kere eke ma n’eluigwe ma n’ụwa ga na-asọpụrụ aha nsọ ya. Ha ga-eji obi ha niile kweta na ọ bụ Jehova bụ Ọkaakaa, na-asọpụrụkwa ya. Ọ ga na-agụ ha agụụ ijere ya ozi, na-atọkwa ha ụtọ ime uche ya. Ihe mere ha ji eme ihe a niile bụ n’ihi na ha hụrụ ya n’anya. Ihe Devid gwara Jehova n’ekpere n’Abụ Ọma 40:5-10 gosiri na o kwetara na Jehova bụ Ọkaakaa nakwa na ọ chọrọ ka e doo aha Jehova nsọ. (Ị ga-ahụ na Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Hibru 10:5-10 na ihe ụfọdụ e kwuru n’abụ ọma a mezuru n’isi Kraịst Jizọs.)
MEE 27–JUN 2
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 42-44
Kwe Ka Ihe Jehova Na-akụziri Gị Baara Gị Ezigbo Uru
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Abụọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
42:4, 5, 11; 43:3-5. Ọ bụrụ na e nwee ka ihe ụfọdụ si gbochie anyị iso ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpachi anya ruo oge ụfọdụ, icheta ọṅụ ndị mkpakọrịta dị otú ahụ na-enyebu anyị pụrụ ịgba anyị ume. Ọ bụ ezie na ná mmalite, nke a pụrụ ime ka ihe mgbu nke owu ọmụma na-akpata ka njọ, ọ ga-emekwa ka anyị cheta na Chineke bụ ebe mgbaba anyị nakwa na anyị kwesịrị ichere ya iji nwere onwe anyị pụọ ná nsogbu anyị.
Ihe Ị Ga-eme Ka Ịmụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ ma Na-abakwuru Gị Uru
1 KPEE EKPERE: Ihe mbụ anyị ga-eme bụ ikpe ekpere. (Ọma 42:8) N’ihi gịnị? Anyị kwesịrị iwere ịmụ Okwu Chineke ka otu ụzọ anyị si efe Chineke. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o mee ka ihe anyị ga-amụ bamie n’obi anyị nakwa ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ. (Luk 11:13) Barbara, bụ́ onye jeterela ozi ala ọzọ aka, kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere tupu mụ agụọ Baịbụl ma ọ bụ mụọ Baịbụl. Ọ na-abụ m kpechaa ekpere, ya adị m ka mụ na Jehova ọ̀ nọ, dịkwa m ka obi ọ̀ dị ya ụtọ n’ihe m na-eme.” Ikpe ekpere tupu anyị amụwa ihe na-eme ka uche anyị na obi anyị nabata ihe niile anyị ga-eji Baịbụl amụ.
‘Akụdakwala Aka’
11 Ihe ndị ọzọ Jehova ji eme ka anyị dị́ ike bụ ihe a na-akụziri anyị n’ọmụmụ ihe, ná mgbakọ dị́ iche iche nakwa n’ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ ya. Ihe a a na-akụziri anyị ga-enyere anyị aka ibu ezigbo ihe n’obi na-efe ya, ịna-ekpebi ihe ndị anyị ga-eme n’ozi ya, na ịna-eme ihe dị́ iche iche Onye Kraịst kwesịrị ịna-eme. (Ọma 119:32) Ị̀ na-agbasi mbọ ike ka ihe ndị ọ na-akụziri anyị mee ka ị dị́ ike?
12 Jehova nyeere ndị Izrel aka ha emerie ndị Amalek na ndị Itiopia. O mekwara ka Nehemaya na ndị Juu ibe ya nwee ike ịrụzicha mgbidi Jeruselem. Chineke ga-emekwa ka anyị nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma ọ bụrụgodị na e nwere ihe na-echegbu anyị, na a na-emegide anyị, ma ọ bụ na ndị mmadụ achọghị ịnụ ozi ọma anyị. (1 Pita 5:10) Anyị anaghị atụ anya ka Jehova mee ka nsogbu anyị niile kwụsị n’otu ntabi anya. Kama, ka anyị mee ihe anyị kwesịrị ime. Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-amụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe kwa izu ma na-agachi ọmụmụ ihe anya, na-amụ ihe nke onwe anyị, na-enwe ofufe ezinụlọ, na-ekpekwa ekpere mgbe niile. Ka anyị ghara ikwe ka ịchụ ihe ndị ọzọ gbochie anyị ime ihe ndị a Jehova ji eme ka anyị dị́ ike ma na-agba anyị ume. Ị chọpụta na ike agwụwala gị na nke ọ bụla n’ihe ndị a, rịọ Chineke ka o nyere gị aka. Ị ga-ahụ otú mmụọ nsọ ya ga-esi ‘na-arụ ọrụ n’ime gị,’ ka ime ihe dị́ mma gụwa gị agụụ, gị ana-emekwa ya. (Fil. 2:13) Ma, olee otú ị ga-esi na-eme ka ndị ọzọ dị́ ike?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1242
Nkịta Ọhịa
E ji nkịta ọhịa maa atụ ugboro ugboro n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe Job na-akwa ụwa ya, o kwuru na ya abụrụla “nwanne nkịta ọhịa.” (Job 30:29) Mgbe otu ọbụ abụ na-ekwu gbasara otú e si merie ndị Chineke mmeri na-eme ihere, ọ sịrị: “Ma ị sụọla anyị akwụ n’ebe nkịta ọhịa na-ebi.” (Ọma 44:19) Ọ ga-abụ na ihe a o kwuru na-egosi ihe na-eme n’ọgbọ agha bụ́ ebe nkịta ọhịa na-agbakọta ka ha rie ozu ndị e gburu egbu (i nwere ike ịtụle Ọma 68:23). Mgbe ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem n’afọ 607 T.O.N.K., ụkọ nri mere ka ndị Chineke hụsie anya nke na ụmụ nwaanyị emetereghị ụmụ ha ebere. Ọ bụ ya mere ihe Jeremaya kwuru ji daba adaba. Ọ sịrị na nkịta ọhịa na-enyedị ụmụ ha ara, ma ‘ndị ya’ aghọọla ndị obi tara mmiri.—Ákwá 4:3, 10.
JUN 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 45-47
Abụ Kwuru Gbasara Agbamakwụkwọ Otu Eze
Ṅụrịa Ọṅụ n’Ihi Ọlụlụ Nwunye nke Nwa Atụrụ Ahụ
8 Gụọ Abụ Ọma 45:13, 14a. ‘A chọrọ nwaanyị a mma maka di ya.’ Ọ bụzi “sọ mma” maka agbamakwụkwọ ya na eze. Ná Mkpughe 21:2, e ji nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ tụnyere obodo. A kpọrọ ya Jeruselem Ọhụrụ. Obodo a dị n’eluigwe. “O nwekwara ebube Chineke. Ọ na-egbuke egbuke dị ka nkume dị nnọọ oké ọnụ ahịa, dị ka nkume jaspa nke na-egbuke nke ọma.” (Mkpu. 21:10, 11) Akwụkwọ Mkpughe kọwara otú Jeruselem Ọhụrụ a si na-egbu maramara. (Mkpu. 21:18-21) Ka a sịkwa ihe mere ọbụ abụ ji kwuo na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ bụ “sọ mma.” A sị ka e kwuwe, ọ bụ n’eluigwe ka ha ga-anọ agba akwụkwọ.
9 A kpọọrọ nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ bịakwute di ya, ya bụ, Eze bụ́ Mesaya. Ọ kwadebela ya, jiri okwu Chineke “mee ka ọ dị ọcha.” Ọ bụ ya mere o ji “dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ.” (Efe. 5:26, 27) Uwe nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ga-eyi maka agbamakwụkwọ ha kwesịkwara ịma ezigbo mma. Ọ mara mma n’eziokwu. “E ji ọlaedo chọọ uwe ya mma.” ‘Ọ ga-eyikwa uwe a kpara akpa mgbe a ga-akpọrọ ya bịakwute eze.’ Ihe e nyere ya ka o yiri maka agbamakwụkwọ ya na Nwa Atụrụ ahụ bụ “ákwà linin ọma nke na-enwu gbaa, nke dịkwa ọcha, n’ihi na ákwà linin ọma ahụ nọchiri anya ezi omume nke ndị nsọ na-eme.”—Mkpu. 19:8.
Ihe Akwụkwọ Mkpughe Kwuru Gbasara Ọdịnihu Gị
Gịnị ka Jehova ga-eme gbasara ọgụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ a ga-alụso ndị ya? Ọ gwara anyị, sị: “M ga-ewe ezigbo iwe.” (Ezik. 38:18, 21-23) Mkpughe isi 19 kwukwara ihe ọzọ ga-eme. Jehova ga-ezipụ Ọkpara ya ka ọ gaa chebe ndị ya ma merie ndị iro ha. “Ụsụụ ndị agha nọ n’eluigwe” ga-eso Jizọs lụso Gọg nke Megọg agha. Ụsụụ ndị agha ahụ bụ ndị mmụọ ozi na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Mkpu. 17:14; 19:11-15) Gịnị ka agha a ga-eme? Ọ ga-ebibi mmadụ niile na òtù niile na-emegide Jehova.—Gụọ Mkpughe 19:19-21.
11 Chegodị otú obi ga-adị ndị na-efe Jehova fọrọ n’ụwa mgbe e bibichara ndị iro Chineke. Onye ọ bụla ga na-enwe ezigbo obi ụtọ n’oge ahụ. Ọ bụ eziokwu na a ga na-eti mkpu ọṅụ n’eluigwe ma e bibichaa Babịlọn Ukwu, e nwekwara ihe ọzọ ga-aka eme ka ha nwee ọṅụ. (Mkpu. 19:1-3) Ihe ahụ bụ otu ihe dị ezigbo mkpa e kwuru gbasara ya n’akwụkwọ Mkpughe, ya bụ, “agbamakwụkwọ Nwa Atụrụ ahụ.”—Mkpu. 19:6-9.
12 Olee mgbe Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ? Ndị niile so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-anọ n’eluigwe tupu a malite ịlụ agha Amagedọn. Ma ọ bụghị n’oge ahụ ka Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ. (Gụọ Mkpughe 21:1, 2.) Ọ ga-agba akwụkwọ ma a lụchaa agha Amagedọn ma bibie ndị iro Chineke niile.—Ọma 45:3, 4, 13-17.
it-2 1169
Agha
A lụchaa agha a, a ga-enwe udo n’ụwa ruo otu puku afọ. Otu abụ ọma kwuru na Jehova “na-eme ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-agbajisịkwa ube. Ọ na-agba ụgbọ e ji alụ agha ọkụ.” Ihe a o kwuru mezuru nke mbụ ya mgbe Chineke bibiri ngwá agha ndị iro mba Izrel, mee ka udo dị n’Izrel. Kraịst bibichaa ndị niile na-akwado agha n’agha Ha-Magedọn, a ga-enwe udo zuru ezu n’ebe niile n’ụwa a. (Ọma 46:8-10) Ndị a ga-emere amara kwe ka ha nweta ndụ ebighị ebi ga-abụ ndị kpụgharịrị “mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.” “N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha ekwuola ya.”—Aịza. 2:4; Maị. 4:3, 4.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Olee Ihe Na-agaghịzi Adị Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?
9 Gịnị ka a ga-eji dochie òtù na-arụrụ aka? A lụchaa agha Amagedọn, à ga-enwe òtù ọ bụla n’ụwa? Baịbụl sịrị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.” (2 Pita 3:13) A ga-ebibi eluigwe ochie na ụwa ochie, ya bụ, ndị ọchịchị na-arụrụ aka na ndị ha na-achị. Gịnị ka a ga-eji dochie ha? Okwu ahụ bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” pụtara na a ga-enwe ọchịchị ọhụrụ na ụmụ mmadụ ndị ọchịchị ahụ ga na-achị. Alaeze ahụ Jizọs Kraịst ga na-achị ga-egosi na Jehova abụghị Chineke aghara. (1 Kọr. 14:33) N’ihi ya, a ga-ahazi “ụwa ọhụrụ” ahazi. A ga-enwe ụmụ nwoke bụ́ ndị ezi omume ga na-elekọta ihe ndị a na-eme. (Ọma 45:16) Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị ga-eso ya na-achị, ga na-eduzi ha. Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe òtù dị iche iche na-arụrụ aka na-agaghịzi adị, e nweekwa naanị otu nzukọ dị n’otu nke na-akwụwa aka ọtọ.
JUN 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 48-50
Ndị Nne na Nna, Meenụ Ka Obi Sikwuo Ndị Ezinụlọ Unu Ike na Ihe A Bụ Nzukọ Jehova
Ife Jehova Otú Ọ Chọrọ Ga-eme Ka Anyị Na-enwekwu Obi Ụtọ
11 Anyị na-efe Jehova mgbe anyị na-amụ Okwu ya ma na-akụziri ụmụ anyị gbasara Chineke. Ndị Izrel anaghị arụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike. Kama, ha na-eji ụbọchị ahụ eme ka ha na Jehova dịrịkwuo ná mma. (Ọpụ. 31:16, 17) Ndị Izrel ji ife Jehova kpọrọ ihe na-eji ụbọchị ahụ akụziri ụmụ ha gbasara Jehova na ihe ọma ndị o meere ha. Taakwa, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iwepụta oge ọ ga-eji na-agụ ma na-amụ Okwu Chineke. Ọ bụ otu ụzọ anyị si efe Jehova. Ọ na-emekwa ka anyị bịarukwuo ya nso. (Ọma 73:28) Ọ bụrụkwa na anyị ana-enwe ofufe ezinụlọ, ọ ga-enyere ụmụ anyị aka ime ka ha na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya dịrị ná mma.—Gụọ Abụ Ọma 48:13.
E Nwere Ọtụtụ Ihe Mere I Kwesịrị Iji Na-enwe Ọṅụ
Otu ọbụ abụ dere, sị: “Gaanụ gburugburu Zayọn, gaakwanụ ya okirikiri, gụọnụ ụlọ elu ya ọnụ. Chebaranụ ékpè ya echiche. Leruonụ ụlọ elu ya niile anya, ka unu wee kọọrọ ya ọgbọ dị n’ihu.” (Ọma 48:12, 13) Ọbụ abụ a gbara ụmụ Izrel ume ka ha leruo Jeruselem anya. Chegodị otú obi na-adị ezinụlọ ọ bụla dị n’Izrel nke gara obodo nsọ ahụ maka ememme a na-eme kwa afọ ma hụ ụlọ nsọ ya nke mara ezigbo mma? Ọ ga-abụrịrị na ihe ha hụrụ mere ka ha “kọọrọ ya ọgbọ dị n’ihu.”
Chegodị banyere eze nwaanyị Shiba, bụ́ onye nweburu obi abụọ mgbe ọ nụrụ banyere ọchịchị ọma Sọlọmọn na amamihe ya dị ukwuu. Gịnị mere ka o kweta na ihe ndị ọ nụrụ bụ eziokwu? O kwuru, sị: “Ekwetaghị m ihe e kwuru ruo mgbe m bịara ka m jiri anya m hụ.” (2 Ihe 9:6) N’eziokwu, ihe anyị ji “anya” anyị hụ nwere ike ịbara anyị uru nke ukwuu.
Olee otú i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ka ha jiri “anya” ha hụ ọrụ ndị magburu onwe ha nzukọ Jehova na-arụ? Ọ bụrụ na e nwere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị nso n’ebe unu bi, gbalịanụ gaa hụ otú ebe ahụ dị. Were Mandy na Bethany dị ka ihe atụ. Ọ na-ewe ha ihe dị ka otu puku kilomita na narị ise ma ha si n’ebe ha bi gaa Betel dị n’obodo ha. Ma, papa ha na mama ha na-akpọrọ ha aga ebe ahụ ọtụtụ mgbe, karịchaa mgbe ha ka na-eto eto. Ha kwuru, sị: “Tupu anyị agaa hụ Betel, anyị chere na a naghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́ ebe ahụ nakwa na Betel bụ naanị maka ndị agadi. Ma, anyị hụrụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị ji ọṅụ na-arụsi ọrụ Jehova ike! Anyị chọpụtara na nzukọ Jehova buru ibu karịa nwa obere ebe a anyị bi, ihe anyị na-ahụkwa mgbe ọ bụla anyị gara Betel na-agba anyị ume.” Ịbịaru nzukọ Chineke nso mere ka Mandy na Bethany ghọọ ndị ọsụ ụzọ, ha mechakwara gaa rụtụ ọrụ na Betel ọnwa ole na ole.
Na-akpanụ Àgwà Ka Ụmụ Amaala Alaeze Chineke!
5 Ịmụ akụkọ mba ahụ. O nwere ike ịdị mkpa ka onye chọrọ ịbụ nwa amaala mba ọzọ mụọ akụkọ banyere ọchịchị obodo ahụ. N’otu aka ahụ, ndị chọrọ ịbụ ụmụ amaala Alaeze Chineke kwesịrị ịmụta ihe niile ha nwere ike ịmụta banyere Alaeze ahụ. Ka anyị tụlee ihe ụmụ Kora mere, bụ́ ndị jere ozi n’Izrel oge ochie. Ihe banyere Jeruselem na ebe a na-anọ efe Chineke na ya tọrọ ha ezigbo ụtọ, ọ na-amasịkwa ha ịkọ akụkọ banyere obodo ahụ. Ihe kacha masị ha abụghị nkume na ihe ndị ọzọ e ji wuo obodo ahụ, kama ọ bụ ihe obodo ahụ na ebe ahụ ha na-anọ efe Chineke nọchiri anya ya. Jeruselem bụ “obodo nke Eze Ukwu,” bụ́ Jehova, n’ihi na ọ bụ ebe a na-anọ efe ya. Ọ bụ ebe ahụ ka a na-anọ akụziri ndị mmadụ Iwu Jehova. Ọ bụ ndị Eze Jeruselem na-achị ka Jehova gosiri obiọma. (Gụọ Abụ Ọma 48:1, 2, 9, 12, 13.) Ịmụ banyere ndị Jehova na ịkọ banyere ha ọ̀ na-atọ gị ụtọ otú ahụ o si tọọ ụmụ Kora? Ka ị na-amụtakwu banyere nzukọ Chineke na otú Jehova si akwado ndị ya, obi ga-esikwu gị ike na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị. Ọ ga-eme ka i nwekwuo mmasị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—Jere. 9:24; Luk 4:43.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 805
Akụnụba
Ndị Izrel na-eriju afọ, na-aṅụkwa mmanya maka na ha bara ọgaranya. (1 Eze 4:20; Ekli. 5:18, 19). Akụnụba ha mere ka ha ghara inwe nsogbu dị iche iche ịda ogbenye na-akpata. (Ilu 10:15; Ekli. 7:12) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ uche Jehova ka ndị Izrel nwee akụnụba maka na ha na-arụsi ọrụ ike (i nwere ike ịtụle Ilu 6:6-11; 20:13; 24:33, 34), ma o mekwara ka a dọọ ha aka ná ntị na nsogbu ga-abịara ha ma ha chefuo yanwa bụ́ Onye akụnụba ha si n’aka, tụkwasịzie akụnụba ha obi. (Diut. 8:7-17; Ọma 49:6-9; Ilu 11:4; 18:10, 11; Jere. 9:23, 24) E chetaara ha na akụnụba anaghị adịte aka (Ilu 23:4, 5), e nweghị ike inye ya Chineke iji napụta mmadụ n’aka ọnwụ (Ọma 49:6, 7), ọ naghịkwa abara ndị nwụrụ anwụ uru (Ọma 49:16, 17; Ekli. 5:15). E mere ka ha ghọta na iji akụnụba kpọrọ ihe gafee ókè ga-eme ka ha tinyewe aka n’ihe ọjọọ, meekwa ka Jehova kpọ ha asị. (Ilu 28:20; i nwere ike ịtụle Jere. 5:26-28; 17:9-11.) A gbakwara ha ume ka ha “sọpụrụ Jehova ma nye ya ihe ndị kacha mma [ha] nwere.”—Ilu 3:9.
JUN 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 51-53
Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ka Ị Ghara Ime Mmehie Ndị Dị Oké Njọ
Olee Otú Ị Ga-esi Chebe Obi Gị?
4 N’Ilu 4:23, okwu ahụ bụ́ “obi” na-akọwa ihe dị “n’ime obi mmadụ.” (Gụọ Abụ Ọma 51:6.) Ihe “obi” pụtara bụ ihe anyị na-eche n’echiche, otú obi na-adị anyị, ihe anyị bu n’obi nakwa ihe na-agụ anyị agụụ. Ọ bụ ụdị onye anyị bụ n’ime, ọ bụghị naanị otú anyị dị n’elu ahụ́.
5 Ka anyị tụlee otú ahụ́ ịgbasi anyị ike si egosi na ụdị onye anyị bụ n’ime dị ezigbo mkpa. Nke mbụ, ka ahụ́ nwee ike ịgbasi anyị ike, anyị kwesịrị ịna-eri ezigbo nri, na-emegakwa ahụ́ mgbe niile. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma a bịa n’ihe gbasara ofufe Chineke. Ka anyị nwee ike ichebe obi anyị, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, na-egosikwa na anyị nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ mgbe niile. Otú anyị si egosi na anyị nwere okwukwe bụ ịna-eme ihe ndị anyị na-amụta, nakwa ịgwa ndị ọzọ ihe ndị anyị kweere. (Rom 10:8-10; Jems 2:26) Nke abụọ, anyị lee onwe anyị anya n’elu ahụ́, anyị nwere ike iche na ahụ́ gbasiri anyị ike, n’agbanyeghị na o nwere ọrịa anyị nwere n’ime ahụ́. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe gbasara okwukwe anyị. Anyị nwere ike na-eche na okwukwe anyị siri ike n’ihi ihe ndị anyị na-eme n’ofufe Chineke, ma agụụ ihe ọjọọ nwere ike jiri nwayọọ nwayọọ na-agba mgbọrọgwụ n’obi anyị. (1 Kọr. 10:12; Jems 1:14, 15) Anyị kwesịrị icheta na Setan ga-achọ ime ka anyị na-eche echiche otú o si eche. Olee otú o nwere ike isi eme ya? Oleekwanụ otú anyị nwere ike isi echebe onwe anyị?
Anyị Ga-ezereli Omume Rụrụ Arụ
5 Otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi bụ ịna-arịọ ya ka o nyere anyị aka iwepụ echiche ọjọọ n’obi anyị. Ọ bụrụ na anyị abịaruo Jehova nso n’ekpere, ọ ga-abịarukwa anyị nso. Ọ ga-enye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike izere omume rụrụ arụ, gharakwa ịna-eche ihe ọjọọ. N’ihi ya, ka anyị na-agwa Chineke mgbe niile na anyị chọrọ ka ihe anyị na-eche n’obi anyị bụrụ ihe dị ya mma. (Ọma 19:14) Ànyị na-eji obi umeala arịọ ya ka o nyochaa anyị iji chọpụta ma è nwere ihe ọjọọ ọ bụla dị anyị n’obi, nke nwere ike ime ka anyị mehie? (Ọma 139:23, 24) Ànyị na-arịọ ya mgbe niile ka o nyere anyị aka ime ihe ziri ezi ma ọnwụnwa bịara anyị?—Mat. 6:13.
6 Otú e si zụọ anyị ma ọ bụ ụdị ndụ anyị biri n’oge gara aga nwere ike ime ka ihe Jehova kpọrọ asị na-agụ anyị. Ma, Jehova nwere ike inyere anyị aka ka anyị gbanwee, ka anyị nwee ike ịna-eme ihe ọ chọrọ. Ọ bụ ihe Eze Devid ghọtara. Mgbe ya na Bat-shiba kwachara iko, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Mee ka m nwee obi dị ọcha, . . . tinyekwa mmụọ ọhụrụ, nke iguzosi ike, n’ime m.” (Ọma 51:10, 12) Ezughị okè nwere ike ime ka ihe ọjọọ na-agụ anyị. Ma Jehova ga-enyere anyị aka ka irubere ya isi na-agụ anyị agụụ karịa ime ihe ọjọọ. Ọ bụrụgodị na ọchịchọ ọjọọ eriela anyị obi ma mee ka ọ na-esiri anyị ike izere echiche rụrụ arụ, Jehova nwere ike ịna-eduzi anyị ka anyị na-erubere iwu ya isi, na-emekwa ihe dị ya mma. Ọ ga-eme ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ịna-achị anyị.—Ọma 119:133.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 644
Doeg
Ọ bụ onye Ịdọm, bụrụkwa onyeisi ndị na-azụrụ Eze Sọl atụrụ. Ọrụ a abụghị obere ọrụ. (1 Sam. 21:7; 22:9) Ọ ga-abụ na Doeg bụ onye mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. Mgbe ọ nọ na Nọb, ‘e kweghị ka o si n’ihu Jehova pụọ’ maka na o nwere nkwa o kwere, maka na ọ dịghị ọcha, ma ọ bụkwanụ maka na ọ na-arịa ekpenta. N’ihi ya, ọ hụrụ mgbe nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ahimelek na-enye Devid achịcha dị nsọ na mma agha Golayat. N’oge ọzọ, mgbe Sọl na-agwa ndị na-ejere ya ozi na ha na-agba ya mgba okpuru, Doeg kwuru ihe ọ hụrụ mere na Nọb. Sọl ziri ozi ka nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ahimelek na ndị nchụàjà ndị ọzọ na-eje ozi na Nọb bịa hụ ya. Mgbe ọ jụchara Ahimelek ajụjụ, o nyeziri ndị nche ya iwu ka ha gbuo ndị nchụàjà ahụ. Ma, ndị nche ahụ ekweghị eme ihe ọ gwara ha. Sọl gwaziri Doeg ka ọ gaa gbuo ndị nchụàjà ahụ. Doeg gara ozugbo gbuo ndị nchụàjà dị iri asatọ na ise. Mgbe ọ kpachara arụ a, ọ gakwara bibie obodo Nọb, laa ndị niile bi na ya n’iyi, ma nwata ma okenye ma anụ ụlọ.—1 Sam. 22:6-20.
Ihe e dere n’okwu mmeghe Abụ Ọma nke 52 gosiri na Devid dere banyere Doeg, sị: “I ji ire gị, nke na-aghọ nkọ ka agụba, na-akpa nkata ọjọọ, jirikwa ya na-aghọ aghụghọ. Ihe ọjọọ na-amasị gị karịa ihe ọma. Ịgha ụgha na-amasị gị karịa ikwu eziokwu. Gị onye ire ya bụ aghụghọ aghụghọ, ihe na-amasị gị bụ okwu ọ bụla na-agbawa ndị mmadụ obi.”—Ọma 52:2-4.
JUN 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 54-56
Chineke Nọnyeere Gị
Mara Ihe Ma Tụọ Egwu Chineke
10 N’otu oge Devid na-agba ọsọ ndụ, ọ gbagara na nke Ekish, bụ́ eze nke obodo ndị Filistia bụ́ Gat, nke bụ́ obodo Golaịat. (1 Samuel 21:10-15) Ndị ohu eze kpọrọ Devid onye iro mba ha. Gịnị ka Devid mere n’ọnọdụ ahụ dị ize ndụ? Ọ gwara Jehova ihe nile dị ya n’obi n’ekpere. (Abụ Ọma 56:1-4, 11-13) N’agbanyeghị na Devid mere ka à ga-asị na ọ bụ onye ara, ọ maara n’ezie na ọ bụ Jehova napụtara ya. Otú Devid si jiri obi ya nile dabere n’ebe Jehova nọ ma nwee obi ike na Jehova, gosiri na Devid bụ n’ezie nwoke na-atụ egwu Chineke.—Abụ Ọma 34:4-6, 9-11.
11 Dị ka Devid, anyị pụrụ igosi na anyị na-atụ egwu Chineke site n’inwe obi ike na ọ ga-emezu nkwa o kwere anyị na ya ga-eme ka anyị merie nsogbu ndị na-abịara anyị. Devid kwuru, sị: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ́; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.” (Abụ Ọma 37:5) Nke a apụtaghị na anyị ga-enyefe nnọọ Jehova nsogbu anyị ma ghara ime ihe ọ bụla anyị nwere ike ime banyere ya, na-echezi ka Jehova rụọrọ anyị ọrụ ebube. Devid ekpeghị ekpere ka Chineke nyere ya aka ma gazie nọrọ nkịtị. O jiri ikike ọkpụkpụ aka na ọgụgụ isi Jehova nyere ya mee ihe iji merie nsogbu bịara ya. Devid maara na nanị mgbalị mmadụ apụghị ime ka ya dozie nsogbu ahụ. Anyị kwesịkwara ịma nke ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe nile anyị nwere ike ime, anyị ga-ahapụrụ Jehova nke fọdụrụnụ. N’eziokwu, mgbe mgbe, enweghị oké ihe anyị pụrụ ime ma ọ̀ bụghị ịdabere n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ n’oge dị otú a ka anyị na-egosipụta nnọọ na anyị na-atụ egwu Chineke. Okwu a Devid ji obi ya dum kwuo pụrụ ịkasi anyị obi: “Izu nzuzo Jehova dịịrị ndị na-atụ egwu Ya.”—Abụ Ọma 25:14.
Ọ Dịghị Ihe Pụrụ “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”
9 Jehova na-ejikwa ntachi obi anyị akpọrọ ihe. (Matiu 24:13) Cheta na Setan chọrọ ka ị gbakụta Jehova azụ. Ụbọchị ọ bụla i guzosiri ike n’ihe nye Jehova bụ ụbọchị ọzọ i nyeworo aka mee ka e nwee ihe a ga-eji zaghachi ịta ụta Setan. (Ilu 27:11) Mgbe ụfọdụ ịtachi obi anaghị adị mfe. Nsogbu ahụ́ ike, ihe isi ike ego, nsogbu mmetụta uche, na ihe mgbochi ndị ọzọ pụrụ ime ka ụbọchị nke ọ bụla bụrụ ule. Atụmanya na-emezughị emezu pụkwara ịkpata nkụda mmụọ. (Ilu 13:12) Ntachi obi n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova ọbụna karị. Ọ bụ ya mere Eze Devid ji rịọ Jehova ka ọ gbanye anya mmiri ya n’ime “karama akpụkpọ,” jiri obi ike kwukwasị: “Hà adịghị n’akwụkwọ Gị?” (Abụ Ọma 56:8) Ee, Jehova na-eji anya mmiri nile na ahụhụ anyị na-ata ka anyị na-anọgidesi ike n’ihe nye ya akpọrọ ihe, ọ na-echetakwa ha. Ha dịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.
Otú Ịhụ Chineke n’Anya Si Eme Ka Anyị Kwụsị Ịtụ Ụjọ
16 Setan ma na ndụ anyị dị anyị ezigbo mkpa. Ma, o kwuru na anyị nwere ike ịhapụ ihe ọ bụla, ma adịm ná mma anyị na Jehova, iji mee ka anyị dịrị ndụ n’ụwa ochie a. (Job 2:4, 5) Ihe a Ekwensu kwuru bụ okpookpo ụgha. Ma, ebe o “nwere ikike ịkpata ọnwu,” ọ na-agbalị iji ụjọ ọnwụ a anyị na-atụ eme ka anyị kwụsị ife Jehova. (Hib. 2:14, 15) Mgbe ụfọdụ, ndị Ekwensu ji arụ ọrụ na-eyi ndị Jehova egwu na ha ga-egbu ha ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ife Chineke. Mgbe ụfọdụkwa, Ekwensu nwere ike iji ọrịa na-arịasi anyị ike gbalịa ime ka anyị nupụrụ Chineke isi. Ndị dọkịta ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ịna-enye anyị nsogbu ka anyị kweta ka a mịnye anyị ọbara, bụ́kwanụ ihe Jehova sịrị anyị emela. Mmadụ nwekwara ike ịgbalịwa ka anyị kweta ka e si n’ụzọ Baịbụl na-akwadoghị gwọọ anyị ọrịa.
17 Ọ bụ eziokwu na anyị achọghị ịnwụ, ma, anyị ma na Jehova agaghị akwụsị ịhụ anyị n’anya ọ bụrụgodị na anyị anwụọ. (Gụọ Ndị Rom 8:37-39.) Ọ bụrụ na enyi Jehova anwụọ, ọ ka na-echeta ya. N’anya ya, onye ahụ ka dị ndụ. (Luk 20:37, 38) Ọ na-agụsi ya agụụ ike ịkpọlite onye ahụ n’ọnwụ. (Job 14:15) Jehova kwụrụ nnukwu ụgwọ ka anyị “nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Anyị ma na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, na-elekọtakwa anyị. N’ihi ya, kama ịhapụ Jehova ma ọrịa bịa anyị ma ọ bụkwanụ ma e yie anyị egwu ọnwụ, anyị ga-atụkwasị ya obi na ọ ga-akasi anyị obi, nyekwa anyị amamihe na ike anyị ga-eji die ya. Ọ bụ ihe a ka Nwanna Nwaanyị Valérie na di ya mere.—Ọma 41:3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 857-858
Ịma Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu, Ikpebi Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu
Mgbe Judas Iskarịọt raara Jizọs nye n’aka ndị iro ya, o mezuru amụma Jehova buru, si otú ahụ gosi na Jehova na Ọkpara ya nwere ikike ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Ọma 41:9; 55:12, 13; 109:8; Ọrụ 1:16-20) Ma, ọ pụtaghị na Chineke bu ụzọ kpebie na Judas ga-arara Jizọs nye. Amụma dị iche iche Chineke mere ka e buo gosiri na ọ bụ otu n’ime ndị ha na Jizọs dị ná mma ga-arara ya nye. Ma, amụma ndị ahụ ekwughị kpọmkwem onye ọ ga-abụ n’ime ha. Ihe ndị Baịbụl kwuru gosiri na Chineke ebughị ụzọ kpebie ihe Judas ga-eme. Pọl onyeozi kwuru ntụziaka Chineke nyere gbasara ịhọpụta ndị mmadụ. Ọ sịrị: “Ebikwasịla onye ọ bụla aka n’isi ngwa ngwa. Aka gị adịkwala ná mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha.” (1 Tim. 5:22; i nwere ike ịtụle 1 Tim. 3:6.) Jizọs ji otu abalị gwa Nna ya okwu n’ekpere tupu ya ahọpụta mmadụ iri na abụọ ka ha bụrụ ndịozi ya. Ihe a o mere gosiri na ọ chọrọ ileru anya nke ọma tupu ya ahọpụta ha. (Luk 6:12-16) Ọ bụrụ na Chineke ebula ụzọ kpebie na ọ bụ Judas ga-arara Jizọs nye, ọ gaghịnụ adaba ná ntụziaka ahụ o nyere gbasara ịhọpụta mmadụ. Ọ ga-emekwa ka aka ya dịrị ná mmehie onye ahụ mere.
N’ihi ya, o doro anya na n’oge a na-ahọpụta Judas ka ọ bụrụ onyeozi, o nweghị ihe ọjọọ dị n’obi ya gosiri na ọ ga-emecha rara Jizọs nye. O kwere “ka mgbọrọgwụ ọjọọ” pulite n’obi ya ma merụọ ya. Ihe a mere ka ọ kpafuwe, kwụsịzie ịna-ege Chineke ntị ma bido ige Ekwensu ntị. Otú o si mee ya bụ na o bidoro izu ohi na ịghọ aghụghọ. (Hib. 12:14, 15; Jọn 13:2; Ọrụ 1:24, 25; Jems 1:14, 15) O nwere ebe o meruru ihe ọjọọ, Jizọs ekwuzie na ọ bụ ya ga-arara ya nye maka na ọ hụla ihe dị ya n’obi.—Jọn 13:10, 11.