JULAỊ 15-21
ABỤ ỌMA 63-65
Abụ nke 108 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. “Ịhụnanya Gị Dị Mma Karịa Ndụ”
(Nkeji 10)
Mmadụ na Chineke ịdị ná mma bara uru karịa ndụ onye ahụ dị (Ọma 63:3; w01 10/15 15-16 ¶17-18)
Ịtụgharị uche n’otú Jehova si egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya na-eme ka anyị na-ekelekwu ya (Ọma 63:6; w19.12 28 ¶4; w15 10/15 24 ¶7)
Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka otú Chineke si hụ anyị n’anya, anyị ga na-eji ọṅụ eto ya (Ọma 63:4, 5; w09 7/15 16 ¶6)
IHE UNU NWERE IKE IJI EME OFUFE EZINỤLỌ: Kwurịtanụ ụzọ dị iche iche Jehova sirila gosi na ọ hụrụ unu n’anya.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ọma 64:3—Olee otú amaokwu a si enyere anyị aka ka ihe anyị na-ekwu bụrụ ihe dị mma? (w07 11/15 15 ¶6)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 63:1–64:10 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye nwe ụlọ anaghị asụ asụsụ ị na-asụ. (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ụka gị na ya na-akparịta biri tupu gị enwee ike izi ya ozi ọma. (lmd isi nke 2 nọmba nke 4)
6. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Chọpụta isiokwu ga-amasị onye ahụ, meekwa ndokwa otú gị na ya ga-esi akparịta mgbe ọzọ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)
7. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 4) Ihe Ngosi. ijwfq 51—Isiokwu: Olee Ihe Mere Ndịàmà Jehova Na-eji Agaghachi na nke Ndị Sịburu Ha, “Enweghị M Mmasị”? (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)
Abụ nke 154
8. Otú Anyị Si Egosi na Anyị Hụrụ Chineke n’Anya
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
‘Ịhụnanya Jehova dị ukwuu.’ (Ọma 86:15) Ụdị ịhụnanya a na-ekwu okwu ya ebe a bụ nke na-esi n’ala ala obi, nke na-eme ka otu onye jiri obi ya niile na-akwado onye ọzọ ma ghara ịhapụ ya. Ọ bụ eziokwu na Jehova hụrụ mmadụ niile n’anya, ma ọ bụ naanị ndị na-efe ya, ndị ya na ha dị n’ezigbo mma, ka ọ na-egosi ụdị ịhụnanya a. (Ọma 33:18; 63:3; Jọn 3:16; Ọrụ 14:17) Otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ịhụnanya Jehova bụ anyịnwa ịhụkwa ya n’anya. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ ịna-edebe iwu ya, ma iwu ‘ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.’—Mat. 28:19; 1 Jọn 5:3.
Kpọnye VIDIO bụ́ Nọgide Na-enwe Ịhụnanya Mgbe Ị Na-ekwusa Ozi Ọma. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Olee otú ịhụnanya ga-esi eme ka anyị zie mmadụ ozi ọma mgbe
ike gwụrụ anyị?
a na-emegide anyị?
anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị?
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 12 ¶1-6, vidio kọwara isiokwu a na-amụ, igbe 12A