JULAỊ 22-28
ABỤ ỌMA 66-68
Abụ nke 7 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Jehova Na-eburu Anyị Ibu Anyị Kwa Ụbọchị
(Nkeji 10)
Jehova na-aṅa ntị n’ekpere anyị, na-azakwa ha (Ọma 66:19; w23.05 12 ¶15)
Ihe banyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na-emetụ Jehova n’obi (Ọma 68:5; w10 12/1 23 ¶6; w09 4/1 31 ¶1)
Jehova na-enyere anyị aka kwa ụbọchị (Ọma 68:19; w23.01 19 ¶17)
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú anyị si ekwe ka Jehova na-eburu anyị ibu anyị?
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ọma 68:18—N’Izrel oge ochie, olee ndị bụ́ ụmụ nwoke ‘a kpọọrọ ka ha bụrụ onyinye’? (w06 6/1 10 ¶5)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 66:1-20 (th ihe ọmụmụ nke 11)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Omenala ndị obodo onye nwe ụlọ dị iche na nke gị. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gị na ya kwurịta ihe dị na traktị i nyere ya n’oge gara aga. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
Abụ nke 102
7. Gbalịa Mee Ka Ibu Onye Ọzọ Bu Dịtụrụ Ya Mfe
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
E nweghị onye na-efe Chineke kwesịrị iburu nsogbu ndị na-abịara ya naanị ya. (2 Ihe 20:15; Ọma 127:1) Jehova bụ Onye na-enyere anyị aka. (Aịza. 41:10) Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si enyere anyị aka? Ọ na-eji Okwu ya na nzukọ ya eduzi anyị. (Aịza. 48:17) Ọ na-enye anyị mmụọ nsọ ya na-akpa ike. (Luk 11:13) Ọ na-emekwa ka ụmụnna anyị na-agba anyị ume ma na-egboro anyị mkpa anyị. (2 Kọr. 7:6) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova nwere ike iji onye ọ bụla n’ime anyị mee ka ibu nwanna anyị bu dịtụrụ ya mfe.
Kpọnye VIDIO bụ́ Nọgide Na-ahụ Ụmụnna Ndị A n’Anya—Ndị Agadi. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee otú ị ga-esi eme ka ibu dịtụrụ Onye Kraịst merela agadi mfe?
Kpọnye VIDIO bụ́ Nọgide Na-ahụ Ụmụnna Ndị A n’Anya—Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee otú ị ga-esi eme ka ibu dịtụrụ onye nọ n’ozi oge niile mfe?
Kpọnye VIDIO bụ́ Nọgide Na-ahụ Ụmụnna Ndị A n’Anya—Ụmụnna Ndị Si Mba Ọzọ. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee otú ị ga-esi eme ka ibu dịtụrụ ndị ọnwụnwa siri ike bịaara mfe?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 12 ¶7-14