Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Septemba p. 2-3
  • Septemba 2-8

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Septemba 2-8
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Septemba p. 2-3

SEPTEMBA 2-8

ABỤ ỌMA 79-81

Abụ nke 29 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Gosi na Ị Hụrụ Aha Jehova Dị Ebube n’Anya

(Nkeji 10)

Emela ihe ọ bụla ga-eme ka e kwujọọ Jehova (Ọma 79:9; w17.02 9 ¶5)

Na-akpọ aha Jehova (Ọma 80:18; ijwbv 3 ¶4-5)

Jehova na-akwụ ndị na-erubere ya isi maka na ha hụrụ aha ya n’anya ezigbo ụgwọ ọrụ (Ọma 81:13, 16)

Ebe otu nwanna nwoke na-enye onye ọrụ ibe ya kaadị jw.org n’oge ha na-ezurutụ ike n’ebe ha na-arụ ọrụ.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka àgwà anyị na-eto aha Jehova, anyị kwesịrị ịna-agwa ndị mmadụ na anyị bụ Ndịàmà Jehova

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 80:1​—Gịnị mere e ji akpọ aha Josef mgbe ụfọdụ ma e kwuwe gbasara ebo niile e nwere n’Izrel? (it-2 111)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 79:1–80:7 (th ihe ọmụmụ nke 10)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(1 nkeji) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)

6. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)

7. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 5) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa onye na-ekwebughị ka a mụwara ya Baịbụl ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 10

8. “Ha . . . Ga-edo Aha M Nsọ”

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Setan malitere ikwutọ aha Jehova n’ogige Iden. Kemgbe ahụ, ihe kacha mkpa ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi kwesịrị ikpebi bụ ma hà ga-edo aha Jehova nsọ ka ọ̀ bụ na ha agaghị edo ya.

Legodị okpookpo ụgha ole na ole Setan ghagiderela Jehova. O boro ya ebubo na ọ bụ onye ọchịchị aka ike nke na-ahụghị ndị ọ na-achị n’anya. (Jen. 3:1-6; Job 4:18, 19) Ọ na-ekwu na ndị na-efe Jehova ahụghị Jehova n’anya n’eziokwu. (Job 2:4, 5) O meedịla ka ọtụtụ nde mmadụ kweta na ọ bụghị Jehova kere ọmarịcha ihe ndị dị n’ụwa anyị a.​—Rom 1:20, 21.

Olee otú obi dị gị maka ụgha ndị ahụ Setan na-agha? Ọ ga-abụ na ha na-eme ka ị chọọ ịgbachitere Jehova. Ọ ma na ndị na-efe ya ga-achọ iso mee ka e doo aha ya nsọ. (I nwere ike ịtụle Aịza. 29:23.) Olee otú ị ga-esi soro mee ya?

  • Nyere ndị ọzọ aka ka ha mata Jehova ma hụ ya n’anya. (Jọn 17:25, 26) Dị njikere igosi na Jehova dị adị, dịkwa njikere ịkụziri ndị ọzọ banyere ọmarịcha àgwà ndị o nwere.​—Aịza. 63:7

  • Jiri obi gị niile hụ Jehova n’anya. (Mat. 22:37, 38) Na-erubere iwu ndị Jehova nyere isi, ọ bụghị naanị maka na ha ga-abara gị uru, kama, maka na ị chọrọ ime Jehova obi ụtọ.​—Ilu 27:11

Foto ndị na-egosi: Foto ndị si na vidio bụ́ “Ka Ịhụnanya Gị Ghara Ịda, Ọ Bụrụgodị na . . . Ndị Gị na Ha Na-agụkọ Akwụkwọ Na-akpa Àgwà Ọjọọ.” 1. Ebe Ariel nọ ọdụ n’oche ya, nwata nwoke nọ na klas ha ana-atụ ya aka, na-ajụ ya ihe mere ọ na-anaghị egbuchapụrụ ọkọlọtọ. 2. Ebe o ji Baịbụl na akwụkwọ bụ́ “Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl,” isi nke 61, na-amụ ihe. 3. Ebe o guzo n’ihu klas ha na-ezi ozi ọma. 4. Ebe nwa klas Diego nyere ya sịga ọgbara ọhụrụ. 5. Ebe o ji tablet ya na-eme nchọnchọ. 6. Ebe o si n’ụlọ akwụkwọ na-ala, obi siri ya ike, ọ na-amụmụkwa ọnụ ọchị.

Kpọnye VIDIO bụ́ Ka Ịhụnanya Gị Ghara Ịda, Ọ Bụrụgodị na . . . Ndị Gị na Ha Na-agụkọ Akwụkwọ Na-akpa Àgwà Ọjọọ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Ariel na Diego si gbachitere aha Jehova?

  • Gịnị mere ha ji chọọ ịgbachitere Jehova?

  • Olee otú i nwere ike isi mee ka ha?

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 14 ¶8-14, igbe 13A

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 90 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya