Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Septemba p. 14-15
  • Ọktoba 28–Nọvemba 3

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọktoba 28–Nọvemba 3
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Septemba p. 14-15

ỌKTOBA 28–NỌVEMBA 3

ABỤ ỌMA 103-104

Abụ nke 30 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. “Ọ Na-echeta na Anyị Bụ Ájá”

(Nkeji 10)

Ọmịiko Jehova na-eme ka ọ na-echebara anyị echiche (Ọma 103:8; w23.07 21 ¶5)

Ọ naghị ajụ anyị ma anyị mehie ihe (Ọma 103:9, 10; w23.09 6-7 ¶16-18)

Ọ naghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli (Ọma 103:14; w23.05 26 ¶2)

Ebe di ji obi ya niile na-ege nwunye ya ntị mgbe ọ na-akọrọ ya ihe dị ya n’obi.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Otú m si akpaso di m ma ọ bụ nwunye m àgwà ọ̀ na-egosi na m na-echebara onye ọzọ echiche ka Jehova?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 104:24​—Gịnị ka amaokwu a na-akụziri anyị gbasara ikike Jehova nwere ike ụdị ihe dị iche iche? (cl 55 ¶18)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 104:1-24 (th ihe ọmụmụ nke 11)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gị na onye kwetara ka a mụwara ya Baịbụl lee vidio bụ́ Obi Dị Anyị Ụtọ na Ị Chọrọ Ịmụ Baịbụl, unu ekwurịtazie ihe dị na ya. (th ihe ọmụmụ nke 9)

6. Okwu

(Nkeji 5) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 6​—Isiokwu: Nwoke Kwesịrị ‘Ịhụ Nwunye Ya n’Anya Otú Ọ Hụrụ Onwe Ya.’ (th ihe ọmụmụ nke 1)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 44

7. Ị̀ Ma Ebe Ike Gị Ruru?

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Inye Jehova ihe ndị kacha mma anyị nwere na-eme ya obi ụtọ, na-emekwa anyịnwa obi ụtọ. (Ọma 73:28) Mana, ime ike anyị niile n’echebaraghị ebe ike anyị ruru echiche nwere ike ime ka anyị chegbuwe onwe anyị ma ọ bụ ka obi jọwa anyị njọ.

Nwanna nwaanyị bụ́ agbọghọ e gosiri na vidio bụ́ “Anyị Ga-emekwu nke Ọma Ma Anyị Na-atụ Anya Ime Ihe Anyị Ga-emeli.”

Kpọnye VIDIO bụ́ Anyị Ga-emekwu nke Ọma Ma Anyị Na-atụ Anya Ime Ihe Anyị Ga-emeli. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Jehova na-atụ anya n’aka anyị? (Maị. 6:8)

  • Foto si na vidio bụ́ “Anyị Ga-emekwu nke Ọma Ma Anyị Na-atụ Anya Ime Ihe Anyị Ga-emeli.” Ebe nwanna nwaanyị ahụ bụ́ agbọghọ na enyi ya na-agba onye a na-amụrụ Baịbụl ume n’ebe a na-ere kọfị.
  • Gịnị nyeere nwanna nwaanyị ahụ bụ́ agbọghọbịa aka ka ọ ghara ịna-echegbukarị onwe ya banyere ihe ọ chọrọ ime n’ozi Jehova?

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI AMATA EBE IKE ANYỊ RURU?

  • Ejila onwe gị atụnyere ndị ọzọ. (Gal. 6:4) Ekwela ka ọ bụrụ ihe ndị ọzọ na-eme ga-eme ka i kpebie ihe ndị ị ga-eme ma ọ bụ ihe i chere ị ga-emeli. Ihe ị ga-emeli nwere ike ịkarị ihe onye ọzọ gị na ya bụ ọgbọ ma ọ bụ gị na ya nọ n’otu ọnọdụ ga-emeli, ma ọ bụkwanụ ihe onye ahụ ga-emeli akarịa ihe gịnwa ga-emeli

  • Ekwela ka ụjọ gbochie gị ime ihe ndị ọzọ ị ga-emeli. (Rom 12:1; 1 Kọr. 7:31) Ụjọ atụla gị ịmalite ụdị ozi i cheburu na ị gaghị ejeli ma ọ bụ nke i chere na ọ gaghị atọ gị ụtọ.​—Mal. 3:10

  • Rụọ ya obere oge ka ị mata ebe ike gị ruru. Dị ka ihe atụ, ị̀ ga-arụli ọrụ ọsụ ụzọ oge niile? I nwere ike iji ọnwa ole na ole gachikwuo ozi ọma anya ma ọ bụkwanụ rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inye aka. I nwekwara ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile otu afọ. Ọ bụrụgodị na i kpebie na ị gaghị abụli onye ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ na ị gaghị arụfe ya otu afọ, i mekataghị kwaa mmakwaara maka obere ihe ndị ahụ i mere.​—Ekli. 6:9

  • Dị njikere ime mgbanwe. Ọnọdụ anyị na-agbanwe agbanwe, ihe anyị ga-emeli na-agbanwekwa agbanwe. N’ihi ya, ị nọtụ, gị elebagharịa anya n’ihe ndị ị chọrọ ime n’ozi Jehova

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 16 ¶9-13, igbe 16A

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 55 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya