Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Nọvemba p. 6-7
  • Nọvemba 25–‏Disemba 1

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọvemba 25–‏Disemba 1
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Nọvemba p. 6-7

NỌVEMBA 25–DISEMBA 1

ABỤ ỌMA 109-112

Abụ nke 14 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Na-akwado Jizọs, Bụ́ Eze

(Nkeji 10)

Mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, ọ nọdụrụ ala n’aka nri Jehova (Ọma 110:1; w06 9/1 13 ¶6)

N’afọ 1914, Jizọs malitere imeri ndị iro ya (Ọma 110:2; w00 4/1 18 ¶3)

Anyị nwere ike iji obi anyị niile wepụta onwe anyị ịkwado ọchịchị Jizọs (Ọma 110:3; be 76 ¶2)

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna nwoke na-eto eto na-eme ihe ndị gosiri na ọ na-akwado ọchịchị Jizọs. 1. Ọ na-enye ndị mmadụ maịkrofon n’ọmụmụ ihe. 2. Ọ na-enyere nwanna nwaanyị merela agadi nọ n’ígwè ndị ngwọrọ aka. 3. Ọ na-amụ Baịbụl. 4. Ọ na-ege ntị ka nwanna ọzọ na-akụziri ya otú ọ ga-esi arụ ọrụ e nyere ya n’ọgbakọ.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ihe ndị m ga-ekpebi ime n’ozi Jehova iji gosi na m na-akwado Alaeze Chineke?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 110:4​—Kọwaa ọgbụgba ndụ e kwuru okwu ya n’amaokwu a. (it-1 524 ¶2)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 109:1-26 (th ihe ọmụmụ nke 2)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri traktị malite mkparịta ụka. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)

5. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Ihe ngosi. ijwfq 23​—Isiokwu: Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Aga Agha? (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) lff isi nke 15 nọmba nke 6 na Ụfọdụ Na-asị (lmd isi nke 11 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 72

7. Olee Otú Anyị Ga-esi Jiri Obi Anyị Niile Na-akwado Alaeze Chineke?

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Foto si na vidio bụ́ “Jiri Obi Gị Niile Na-erubere ‘Onyeisi Udo’ Isi.” Ebe ụmụnna nwoke abụọ na-ezi onye na-egbu azụ̀ n’akụkụ mmiri ozi ọma.

Alaeze Jehova na-egosi na ọ bụ Jehova bụ Ọkaakaa eluigwe na ala. (Dan. 2:44, 45) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ji obi anyị niile na-akwado Alaeze Chineke, anyị na-egosi na anyị kweere na ọ bụ Jehova bụ Ọkaakaa.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Jiri Obi Gị Niile Na-erubere “Onyeisi Udo” Isi. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee otú anyị si eji obi anyị niile akwado Alaeze Chineke?

Dee otu amaokwu Baịbụl dabara na nke ọ bụla n’ime ụzọ dị iche iche e dere n’okpuru ebe a anyị si akwado Alaeze Chineke.

  • Ibute ihe gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị.

  • Ịkpa àgwà otú a chọrọ ka ndị Alaeze Chineke ga-achị na-akpa.

  • Iji ịnụ ọkụ n’obi na-akọrọ ndị ọzọ gbasara Alaeze Chineke.

  • Ịkwanyere ndị ọchịchị ùgwù, ma na-erubere Chineke isi mgbe idebe iwu Siza ga-eme ka anyị mebie iwu Chineke.

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 17 ¶15-21

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 75 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya