Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Jenụwarị p. 14-15
  • Febụwarị 24–Mach 2

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Febụwarị 24–Mach 2
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Jenụwarị p. 14-15

FEBỤWARỊ 24–MACH 2

ILU 2

Abụ nke 35 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Gịnị Mere I Ji Kwesị Iji Obi Gị Niile Na-amụ Ihe?

(Nkeji 10)

Ọ ga-egosi na i ji eziokwu dị na Baịbụl kpọrọ ihe (Ilu 2:3, 4; w22.08 18 ¶16)

Ọ ga-enyere gị aka ịna-eme mkpebi ndị dị mma (Ilu 2:5-7; w22.10 19 ¶3-4)

Ọ ga-eme ka okwukwe gị sie ike (Ilu 2:11, 12; w16.09 23 ¶2-3)

Ebe otu nwoke onye Izrel ji ihe dị ka ọ́gụ̀ na-egwu ala n’ime ọgba.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú m ga-esi eme ka ọmụmụ ihe m na-akakwu mma ma na-amụchikwu ya anya?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 2:7​—Olee otú Jehova si “bụụrụ ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ ọta”? (it-1 1211 ¶4)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ilu 2:1-22 (th ihe ọmụmụ nke 12)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi mmadụ otú ọ ga-esi achọta ihe ga-enyere ndị di na nwunye aka na jw.org. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Nye ya magazin kwuru banyere ihe masịrị ya n’oge ikpeazụ unu kwurịtara okwu. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

6. Okwu

(Nkeji 5) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 8​—Isiokwu: Di na Nwunye Ekwesịghị Ịna-agba n’Èzí. (th ihe ọmụmụ nke 13)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 96

7. Ọ̀ Na-amasị Gị Ịchọta Akụ̀ Zoro Ezo?

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ndị na-eto eto, ọ̀ na-amasị unu ịchọta akụ̀ zoro ezo? Ọ bụrụ na ọ na-amasị unu, Baịbụl na-agwa unu ka unu chọta akụ̀ kacha akụ̀ niile dị n’ụwa, ya bụ, ka unu mụta banyere Chineke. (Ilu 2:4, 5) Otú unu ga-esi achọta ya bụ ịna-ewepụta ohere agụchi Baịbụl anya, nakwa ịna-eme nchọnchọ banyere ihe ndị unu gụrụ. Ime ihe a ga-atọ unu ụtọ, unu ga-amụtakwa ọtụtụ ihe.

  • Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ onwe gị mgbe ị na-agụ Baịbụl? (w24.02 32 ¶2-3)

  • Olee ihe ndị ga-enyere gị aka ịchọta azịza ajụjụ ndị ahụ?

Ebe otu nwata nwoke nke jiri ejiji ka ndị na-egwupụta ihe n’ime ala ji obi ụtọ na-emepe igbe akụ̀ dị oké ọnụ ahịa juru.

Vidio ndị a kpọrọ Mụta Ihe n’Aka Ndị Enyi Jehova nwere ike inyere gị aka ịmụta otú ị ga-esi na-echebara ihe ndị ị na-agụ na Baịbụl echiche.

Ebe otu nwata nwoke bụ́ nwanna na-amụ Baịbụl. Broshọ Bekee bụ́ “Was Life Created?” dị n’elu tebụl ya.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Mụta Ihe n’Aka Ndị Enyi Jehova​—Ebel.

Gụọnụ Jenesis 4:2-4 na Ndị Hibru 11:4. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Ebel si gosi na ọ bụ enyi Jehova?

  • Olee otú Ebel si mee ka okwukwe o nwere na Jehova sie ike?

  • Olee otú ị ga-esi eme ka okwukwe gị sie ike?

IHE GA-ENYERE GỊ AKA

Ị gụwa Baịbụl, mee nchọnchọ banyere ndị ị na-agụ akụkọ ha, obodo, na ihe ndị ọzọ ị na-agụ banyere ha, ma ndị nke i chere na ị ma nke ọma. Ime ihe ndị a ga-eme ka ịmụ Baịbụl na-atọkwu gị ụtọ.

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 22 ¶10-22

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 102 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya