MACH 17-23
ILU 5
Abụ nke 122 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Agala Nso n’Ihe Ọ Bụla Ga-eme Ka Ị Kwaa Iko
(Nkeji 10)
Ọ na-adị mfe ịrata mmadụ ka ọ kwaa iko (Ilu 5:3; w00 7/15 29 ¶1)
Ma, onye kwara iko na-emecha kwaara ya mmakwaara (Ilu 5:4, 5; w00 7/15 29 ¶2)
Agala nso n’ihe ọ bụla ga-eme ka ị kwaa iko (Ilu 5:8; w00 7/15 29 ¶5)
Ebe otu nwanna nwaanyị na-ajụ inye nwa okorobịa akara ekwentị ya
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ilu 5:9—Olee otú o si bụrụ na mmadụ ‘na-ere ùgwù’ ya ma ọ kwaa iko? (w00 7/15 29 ¶7)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 5:1-23 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Kpọọ onye na-abụghị onye chọọchị òkù ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, jirikwa jw.org chọta ebe dị ya nso a ga-anọ cheta ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 6 nọmba nke 4)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. N’oge gara aga ị gara na nke ya, ọ natara akwụkwọ e ji akpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, gosikwa na o nwere mmasị. (lmd isi nke 9 nọmba nke 5)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 5) lff nchịkọta isi nke 16, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee. Mgbe onye ị na-amụrụ ihe jụrụ ma Jizọs ọ̀ lụrụ nwaanyị, gosi ya otú ọ ga-esi eme nchọnchọ chọta azịza ya. (lmd isi nke 11 nọmba nke 4)
Abụ nke 121
7. Kpachara Anya Mgbe Gị na Mmadụ Na-akpa Maka Ọlụlụ Ka Ị Ghara Ime Omume Rụrụ Arụ
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
E nwere ike ikwu na oge nwoke na nwaanyị na-akpa bụ “oge ha ji anọrị ma na-egosi ibe ha ịhụnanya.” O nwere ike ịbụ mgbe ha na ndị ọzọ nọ ma ọ bụ mgbe ha abụọ nọ. O nwere ike ịbụ n’ebe ndị ọzọ na-ahụ ha ma ọ bụ n’ebe a na-enweghị onye na-ahụ ha. O nwekwara ike ịbụ ekwentị ka ha ga-eji na-ekwurịta okwu ma ọ bụkwanụ na-ezirịta ozi. Anyị ghọtara na nwoke na nwaanyị ịkpa abụghị ihe egwuregwu, kama ọ bụ ụzọ dị mkpa ha si amata ma hà ga-alụ, bụrụzie di na nwunye. Olee ụzọ ụfọdụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa nakwa ndị katarala ahụ́ ga-esi gosi na ha na-akpachara anya ka ha ghara ịkwa iko mgbe ha na-akpa?—Ilu 22:3.
Kpọnye Vidio Si na Vidio Bụ́ Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye—Nke Mbụ: M̀ Toruola Mụ na Mmadụ Ịkpawa? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Gịnị mere na nwoke na nwaanyị ekwesịghị ịkpawa ruo mgbe ha dị njikere ịlụ? (Ilu 13:12; Luk 14:28-30)
Olee ihe masịrị gị n’otú nne na nna a si nyere nwa ha nwaanyị aka?
Gụọ Ilu 28:26. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Gịnị ka nwoke na nwaanyị nwere ike ime ka ha ghara ịnọ naanị ha n’ebe nwere ike ime ka ha mee omume rụrụ arụ?
Gịnị mere nwoke na nwaanyị ga-eji buru ụzọ kpebie ihe ndị ha ga na-eme na ihe ndị ha na-agaghị na-eme ma ha chọọ igosi ibe ha ịhụnanya, dị ka ijide ibe ha aka na isusu ọnụ?
Gụọ Ndị Efesọs 5:3, 4. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị ka nwoke na nwaanyị kwesịrị icheta gbasara ụdị ụka ha na-akparịta n’ekwentị ma ọ bụ n’Ịntanet?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr Ihe Ndị Anyị Ghọtakwuru, ajụjụ nke 5-8